Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye M Ga-eṅomi—Timoti

Onye M Ga-eṅomi—Timoti

Onye M Ga-eṅomi​—Timoti

Timoti chọrọ isi n’ebe ha bi kwapụ. Ọ bụghị na ọ na-agbara ndị ezinụlọ ha ọsọ, kama ọ chọrọ iso Pọl onyeozi gaa ozi ala ọzọ! O nwere ike ịbụ na Timoti dị ihe dị ka afọ iri abụọ. Ma ọ na-akpa àgwà ka dimkpa. ‘Ụmụnna nọ na Listra na Aịkoniọm kọrọ akụkọ ọma banyere ya.’ (Ọrụ Ndịozi 16:2) Obi siri Pọl ike na Timoti ga-arụ nnukwu ihe n’ozi Chineke. Timoti mere otú ahụ! Ka oge na-aga, ọ gara obodo dị iche iche ma malite ọgbakọ ndị ọhụrụ, gbaakwa ụmụnna ume. Àgwà ọma Timoti mere ka Pọl hụ ya n’anya. Ọ bụ ya mere Pọl ji gwa ndị Filipaị mgbe ihe dị ka afọ iri na otu gasịrị, sị: “Enweghị m onye ọzọ nke nwere ụdị obi o nwere, bụ́ onye ihe banyere unu ga-emetụ n’obi n’ezie.”​—Ndị Filipaị 2:20.

Ị̀ na-ewepụta onwe gị ijere Chineke ozi? Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, Jehova ga-agọzi gị nke ukwuu! N’eziokwu, o ji ndị na-eto eto ‘na-eji obi ha ewepụta onwe ha’ kpọrọ ihe. (Abụ Ọma 110:3) Obi kwesịkwara isi gị ike na Jehova Chineke ‘abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ gị.’—Ndị Hibru 6:10.