Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ịṅụ Oké Mmanya Ji Dị Njọ?

Gịnị Mere Ịṅụ Oké Mmanya Ji Dị Njọ?

ISI NKE 34

Gịnị Mere Ịṅụ Oké Mmanya Ji Dị Njọ?

Gịnị ka i chere bụ́ azịza ajụjụ ndị a? Kanye ✔ n’igbe nke ọ bụla dị n’akụkụ ihe ị zara.

È nwere ndị ọgbọ gị na-aṅụ oké mmanya?

□ Ee □ Ee e

Ndị ọgbọ gị hà na-enye gị nsogbu ka ị ṅụọ mmanya na-aba n’anya?

□ Ee □ Ee e

Ị̀ ṅụtụla oké mmanya?

□ Ee □ Ee e

GỊNỊ bụ ịṅụ oké mmanya? Ụfọdụ kwuru na ọ pụtara mmadụ ịṅụgide mmanya mmanya egbuwe ya. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Aṅụrụma na Ịṅụbiga Mmanya Ókè n’Amerịka kọwakwuru ya. Ha kwuru na ịṅụ oké mmanya “pụtara nwoke ịṅụcha iko mmanya ise ma ọ bụ karịa n’otu oge, nakwa nwaanyị ịṅụcha iko mmanya anọ ma ọ bụ karịa n’otu oge.”

Ọ bụrụ na e nwetụla mgbe ọ dị gị ka ị ṅụọ oké mmanya ma ọ bụ ka ị ṅụọ mmanya na-aba n’anya n’agbanyeghị na i torubeghị ịṅụ ya, ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. * Ọtụtụ ndị na-eto eto na-aṅụbiga mmanya ókè. * Ma jụọ onwe gị, ‘M̀ ma ihe mere m ji chọọ ịna-aṅụ mmanya nakwa ihe mmanya nwere ike ime m?’ Dị ka ihe atụ, zaa eziokwu ma ọ bụ ụgha n’ihe ndị e kwuru n’ebe a. Kanye ✔ n’igbe nke ọ bụla dị n’akụkụ ihe ị zara, ma jiri ya tụnyere ihe a zara.

a. Naanị ihe mere ndị na-eto eto ji aṅụ mmanya bụ na ọ na-atọ ha ụtọ.

□ Eziokwu □ Ụgha

b. Ebe ọ bụ na ndị na-eto eto ka gbasiri ike, nsogbu ịṅụ oké mmanya na-akpatara ha anaghị eru ka nke ọ na-akpatara ndị torola eto.

□ Eziokwu □ Ụgha

ch. Ịṅụ oké mmanya enweghị ike igbu mmadụ.

□ Eziokwu □ Ụgha

d. Baịbụl kwuru na ịṅụ mmanya na-aba n’anya adịghị mma.

□ Eziokwu □ Ụgha

e. Naanị ihe ịṅụ oké mmanya na-eme mmadụ bụ ka ahụ́ ghara isi ya ike.

□ Eziokwu □ Ụgha

a. Naanị ihe mere ndị na-eto eto ji aṅụ mmanya bụ na ọ na-atọ ha ụtọ. Azịza—Ụgha. Ná nchọpụta e mere n’Ọstrelia banyere mmanya na-aba n’anya, e kee ndị na-eto eto a gbara ajụjụ ọnụ ụzọ iri, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ụzọ anọ kwuru na ihe mere ha ji aṅụ mmanya mgbe ha na ndị ọgbọ ha nọ bụ ka ha ghara ịgba iche. N’Amerịka, e kee ndị na-eto eto a gbara ajụjụ ọnụ ụzọ iri, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ụzọ asaa kwuru na ha na-aṅụ mmanya n’ihi nsogbu ndị ọgbọ ha na-enye ha. Ma, ihe karịrị ọkara n’ime ha kwuru na ha na-aṅụ mmanya ka ha chefuo nsogbu ha.

b. Ebe ọ bụ na ndị na-eto eto ka gbasiri ike, nsogbu ịṅụ oké mmanya na-akpatara ha anaghị eru ka nke ọ na-akpatara ndị torola eto. Azịza—Ụgha. Otu magazin [a kpọrọ Discover] kwuru, sị: “Nchọpụta ọhụrụ e mere gosiri na ụmụaka ndị na-aṅụ oké mmanya ji aka ha na-akpatara onwe ha nsogbu.” N’ihi gịnị? “O nwere ike ime ka ụbụrụ ha ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma.”

Ịṅụ oké mmanya so n’ihe na-akpata pịmpụl, ịka nká ụsụ, ibu ibu, mmanya na ọgwụ ọjọọ iri mmadụ ahụ́. O nwekwara ike ime ka ahụ́ na-ama mmadụ jijiji, mebie imeju onye ahụ na obi ya.

ch. Ịṅụ oké mmanya enweghị ike igbu mmadụ. Azịza—Ụgha. Ịṅụbiga mmanya ókè na-eme ka ụbụrụ mmadụ ghara ịna-enweta ezigbo ikuku; ọ na-emekwa ka ihe ndị dị mmadụ n’ahụ́ jiri nwayọọ nwayọọ na-akwụsị ịrụ ọrụ. Ụfọdụ ihe ndị e ji amata ụdị nsogbu ahụ bụ ịgbọ agbọ, mmadụ amaghị onwe ya, na inwe nsogbu n’iku ume. O nwere ike igbu mmadụ.

d. Baịbụl kwuru na ịṅụ mmanya na-aba n’anya adịghị mma. Azịza—Ụgha. Baịbụl ekwughị na ịṅụ mmanya na-aba n’anya adịghị mma ma ọ bụ na ndị na-eto eto ekwesịghị ikpori ndụ. (Abụ Ọma 104:15; Ekliziastis 10:19) N’eziokwu, i kwesịrị itoru etoru tupu ị ṅụwa mmanya na-aba n’anya.—Ndị Rom 13:1.

Ma, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịna-aṅụbiga mmanya ókè. Ilu 20:1 kwuru, sị: “Onye na-akwa emo ka mmanya bụ, ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu bụ onye mkpọtụ, onye ọ bụla nke ọ na-eme ka ọ kpafuo amaghị ihe.” Mmanya na-aba n’anya nwere ike ime ka ị na-ezuzu ezuzu! N’eziokwu, o nwere ike ime ka obi dịtụ gị mma. Ma, ị ṅụbiga ya ókè, ‘ọ ga-ata gị nnọọ dị ka agwọ,’ kpatara gị ọtụtụ nsogbu.—Ilu 23:32.

e. Naanị ihe ịṅụ oké mmanya na-eme mmadụ bụ ka ahụ́ ghara isi ya ike. Azịza—Ụgha. Ị ṅụbiga mmanya ókè, e nwere ike idina gị n’ike ma ọ bụ rụsa gị arụrụala ọzọ. I nwekwara ike ịkpatara ndị ọzọ nsogbu, meekwa ka i ree ùgwù gị. Baịbụl dọrọ aka ná ntị na ị ṅụbiga mmanya ókè, “ị gaghị enwe ike iche echiche ma ọ bụ ikwu okwu nke ọma.” (Ilu 23:33, Today’s English Version) N’eziokwu, ị ga-eme onwe gị onye nzuzu! Nsogbu ndị ọzọ o nwere ike ịkpata bụ itisa enyi na enyi, emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ụlọ ọrụ, ime mpụ, na ịda ogbenye.—Ilu 23:21.

Ihe kacha mkpa i kwesịrị ichebara echiche bụ na ịṅụbiga mmanya ókè ga-eme ka gị na Chineke ghara ịdị ná mma. Jehova Chineke chọrọ ka i jiri “uche gị dum” na-ejere ya ozi, ọ bụghị uche nke mmanya mebiri! (Matiu 22:37) Baịbụl kwuru na “ịṅụ oké mmanya” na “ịma aka n’ịṅụ mmanya” adịghị mma. (1 Pita 4:3) N’ihi ya, Onye kere anyị achọghị ka anyị na-aṅụ oké mmanya. Onye na-aṅụ oké mmanya agaghị abụ enyi Chineke.

Gịnị Ka Ị Ga-ekpebi Ime?

Ị̀ ga-eso ndị ọgbọ gị na-aṅụ oké mmanya? Baịbụl kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụrụ na unu na-enyefe onwe unu n’aka onye ọ bụla ka unu bụrụ ndị ohu ya irubere ya isi, unu bụ ndị ohu ya n’ihi na unu na-erubere ya isi?” (Ndị Rom 6:16) Ị̀ chọrọ ịghọ ohu ndị ọgbọ gị ma ọ bụ ohu mmanya?

Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ịṅụ oké mmanya eriela gị ahụ́? Gwa mama gị ma ọ bụ papa gị ma ọ bụ enyi gị ma nke a na-akọ ka o nyere gị aka. Kpee ekpere, rịọ Jehova Chineke ka o nyere gị aka. A sị ka e kwuwe, ọ “dị njikere inyere anyị aka n’oge nsogbu.” (Abụ Ọma 46:1) Ebe ọ bụ na ihe mere ọtụtụ ndị ji aṅụ oké mmanya ma ọ bụ na-aṅụ mmanya mgbe ha na-etorubeghị bụ nsogbu ndị ọgbọ ha na-enye ha, o nwere ike ịdị mkpa ka i meta ezigbo ndị enyi. * Ime otú ahụ agaghị adị mfe, ma ị ga-emeli ya ma Jehova nyere gị aka.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Chọpụta otú mmadụ nwere ike isi kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ riri ya ahụ́.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ná mba ụfọdụ, e nwere afọ ole iwu kwuru na mmadụ ga-eru tupu ya enwee ike ịṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ịzụ ya.

^ par. 11 Gụọ igbe bụ́ “ Ole Ndị Na-eme Ya?” nke dị na peeji nke 249.

^ par. 32 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 8 na nke 9 n’akwụkwọ a nakwa Isi nke 15 na nwanne ya bụ́ Nke 2.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Onye aṅụrụma . . . ga-ada ogbenye.”​—Ilu 23:21.

NDỤMỌDỤ

Chọpụta ihe mere i ji chọọ ịna-aṅụ mmanya na-aba n’anya. Gbalịa icheta otú ọzọ ka mma ị ga-esi kporie ndụ ma ọ bụ mee ka obi dị gị mma.

Ị̀ MA NA . . . ?

N’otu nchọpụta e mere n’Amerịka, “ụmụaka ndị na-aṅụ oké mmanya nwere nsogbu okpukpu asatọ karịa ndị na-anaghị aṅụ. Nsogbu ndị ahụ bụ anọghị na klas, emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, imerụkarị ahụ́, na imebi ihe ndị ọzọ.”

IHE M GA-EME!

Ndị ọgbọ m chọọ ka m soro ha ṅụbiga mmanya ókè, ihe m ga-agwa ha bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere ndị ọgbọ gị ji achọ ka ndị ọzọ soro ha na-aṅụbiga mmanya ókè?

● Ịnụbiga mmanya ókè ọ̀ ga-eme ka ihe gị masịwa ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị? Gịnị mere i ji zaa otú ahụ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 250]

“Ụmụ akwụkwọ ibe m nye m mmanya na-aba n’anya, m na-agwa ha na echeghị m na ọ bụ ịṅụ mmanya bụ ikpori ndụ.”​—Mak

 [Igbe dị na peeji nke 249]

Ole Ndị Na-eme Ya?

Ná nchọpụta e mere na Briten banyere ụmụaka sekọndrị, e kee ndị dị afọ iri na atọ na afọ iri na anọ ụzọ anọ, otu ụzọ “kwuru na ha aṅụọla iko mmanya na-aba n’anya ise n’otu oge.” Ihe dị ka ọkara n’ime ndị dị afọ iri na ise na afọ iri na isii kwuru na ha emeela otú ahụ. Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike n’Amerịka kwuru na “ihe karịrị nde ndị na-eto eto iri, bụ́ ndị dị n’agbata afọ iri na abụọ na afọ iri abụọ, na-aṅụ mmanya na-aba n’anya. Ihe karịrị nde ise n’ime ha na-aṅụ oké mmanya mgbe niile. Ihe karịrị nde abụọ n’ime ndị a na-aṅụ oké mmanya ọ dịkarịa ala ugboro ise n’ọnwa.” Nchọpụta e mere n’Ọstrelia gosiri na ụmụ agbọghọ na-aṅụ oké mmanya karịa ụmụ okorobịa ná mba ahụ. Ha na-aṅụru iko mmanya iri na atọ n’otu mgbe. Mgbe ụfọdụ, ha na-aṅụrukwa iko mmanya iri atọ!

[Foto dị na peeji nke 251]

Mmanya na-aba n’anya na-ata ka agwọ