Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Ịṅụ Ọgwụ Ọjọọ?

Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Ịṅụ Ọgwụ Ọjọọ?

ISI NKE 35

Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Ịṅụ Ọgwụ Ọjọọ?

ỌGWỤ ọjọọ ò riela gị ahụ́? I nwere ike ịma na ịṅụ ọgwụ ọjọọ na-emebi ahụ́ gị na uche gị. O nwekwara ike ịbụ na ị gbalịala ịkwụsị ịṅụ ya, ma gị emechaa ṅụọ ya ọzọ. Ọ bụrụ otú ahụ, adala mbà. Ndị ọzọ ọgwụ ọjọọ ririla ahụ́ akwụsịla ịṅụ ya, i nwekwara ike ịkwụsị ya! Dị ka ihe atụ, tụlee ihe mmadụ atọ ndị a na-esighị n’otu obodo ma ọ bụ n’otu ezinụlọ kwuru banyere otú ha si kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ.

AHA Marta

OTÚ E SI ZỤỌ M Mama m alụghị di mgbe ọ mụrụ m. N’ihi ya, ọ bụ naanị ya zụrụ mụ na nwanne m nwaanyị. E nwere nwanne mama m ịgba egwú na-atọ ụtọ. Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na abụọ, amalitere m iso ya aga ịgba egwú disko. Mụ na ndị mmadụ na-adị ná mma. N’ihi ya, n’oge na-adịghị anya, mụ na ndị na-akpa àgwà ọjọọ malitere ịkpa. Amalitere m ịṅụ ọgwụ ọjọọ mgbe m dị afọ iri na atọ. Amalitekwara m ịṅụ koken. Mgbe m malitere ịṅụ ya, ọ na-atọ m ụtọ. Ma ka oge na-aga, amalitere m ịmụ anya arọ nrọ, ụjọ na-atụkwa m mgbe niile. Mgbe ọ bụla m nwetatụrụ onwe m, m na-echewe otú m ga-esi gbuo onwe m. Achọrọ m ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ma o kweghị m.

OTÚ M SI KWỤSỊ YA M malitere iche banyere Chineke, gaakwa chọọchị ugboro ole na ole. Ma ike ụwa gwụkwuru m. Mgbe m dị afọ iri na asatọ, m gara biri n’ụlọ enyi m nwoke, mụtakwa nwa nwoke. Nwa ahụ m mụrụ mere ka m chọsie ike ịgbanwe otú m si ebi ndụ. Otu onye bụ́bu enyi m nwaanyị kwabatara n’ụlọ chere ụlọ anyị ihu. Ọ bịara leta m, ma jụọ m otú m mere. Akọọrọ m ya otú ọ dị m n’obi. Ọ gwara m na ya bụzi Onyeàmà Jehova, gwakwa m ka ya mụwara m Baịbụl. Ekwetara m.

Amụtara m na otú m si ebi ndụ adịghị Chineke mma nakwa na m kwesịrị ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ na sịga. Ma ọgwụ ọjọọ ndị ahụ kere m agbụ. Arịọrọ m Jehova Chineke ọtụtụ ugboro kwa ụbọchị ka o nyere m aka ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Achọrọ m ime ihe dị Chineke mma. (Ilu 27:11) Mgbe m mụrụ Baịbụl, gaakwa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ruo ọnwa isii, m kwụsịrị ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ugbu a, m na-ebi ndụ bara uru. Ike ụwa anaghịzi agwụ m. Otu ezigbo nwanna nwoke mechara lụọ m. Eji m Baịbụl zụọ nwa m nwoke. Obi dị m ezigbo ụtọ na Jehova nụrụ ekpere m ma nyere m aka!

AHA Marcio

OTÚ E SI ZỤỌ M Etoro m ná mpụga obodo Santo Andri, bụ́ obodo ọtụtụ ndị bi, nke dị na Saụ Paolo, bụ́ otu n’ime steeti ndị dị na Brazil. Mgbe m dị obere, ndị enyi m kụziiri m ịṅụ sịga, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na izu ohi. Ọtụtụ ndị enyi m na-ezu ụgbọala, na-erekwa ọgwụ ọjọọ. Otu n’ime ha na-enye ndị na-eto eto bi n’ebe anyị bi ọgwụ ọjọọ n’anaghị ha ego. Ha na-azụzi ya ọgwụ ọjọọ ahụ ozugbo o riri ha ahụ́.

Ndị uwe ojii na-agagharị mgbe niile n’ebe anyị bi. Ha jidere m ọtụtụ ugboro maka obere iwu ndị m dara, jidekwa m otu ugboro maka na ha chere na m na-ere ọgwụ ọjọọ. Ọtụtụ ugboro, ezoro m ihe ndị ohi zutere nakwa égbè ha n’ụlọ m.

Ndị mmadụ na-atụ m ụjọ. Anya m na-acha ọbara ọbara. Anaghị m achị ọchị. N’eziokwu, ihu m na-adị mgbe niile ka nke onye chọrọ igbu mmadụ. Aha a na-etu m bụ “Tufaụ” (nke pụtara “Onye Nsogbu”) n’ihi na m na-akpata nsogbu n’ebe ọ bụla m gara. M na-aṅụ oké mmanya, na-ebikwa ndụ rụrụ arụ. Ọtụtụ ndị enyi m nwụrụ ma ọ bụ gaa mkpọrọ. Ike ụwa gwụrụ m nke na m kere ụdọ n’osisi, chọọ ịkwụgbu onwe m.

OTÚ M SI KWỤSỊ ỊṄỤ ỌGWỤ ỌJỌỌ Arịọrọ m Chineke ka o nyere m aka. Emechara m hụ Ndịàmà Jehova, ma bido ịmụ Baịbụl. M mụtara na Chineke nwere aha, nke bụ́ Jehova, mụtakwa na ihe banyere ndị na-agbalịsi ike ibi ndụ otú ọ chọrọ na-emetụ ya n’obi nakwa na ọ na-enyere ha aka. (Abụ Ọma 83:18; 1 Pita 5:6, 7) M chọpụtara na e nwere ọtụtụ ihe m kwesịrị ịgbanwe n’otú m si ebi ndụ. Ihe kacha siere m ike bụ ịmụta ịmụmụ ọnụ ọchị.

Arịọrọ m Jehova mgbe niile ka o nyere m aka. M mekwara ihe Baịbụl kwuru. Dị ka ihe atụ, m kwụsịrị iso ndị mụ na ha na-akpabu, kwụsịkwa ịga n’ụlọ mmanya. Kama, mụ na ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru malitere ịna-akpa. Ọ dịghịrị m mfe ịkwụsị ihe ndị a, ma abụghịzi m onye ohi na onye nsogbu. Kemgbe ihe karịrị afọ iri ugbu a, aṅụbeghị m ọgwụ ọjọọ.

AHA Craig

OTÚ E SI ZỤỌ M Etoro m n’ebe a na-akọ ugbo n’Ebe Ndịda Ọstrelia. Papa m bụ onye aṅụrụma. Ya na mama m gbasara mgbe m dị afọ asatọ. Mama m lụrụ di ọzọ. Mụ na mama m bikwara ruo mgbe m dị afọ iri na asaa. N’afọ ahụ, m mụtara otú e si akpacha ajị atụrụ. Ndị mụ na ha malitere ibi bụ ndị aka ọrụ ha bụ ịga ebe dị iche iche akpacha ajị atụrụ. Amalitere m ịṅụ ụdị ọgwụ ọjọọ dị iche iche, na-aṅụbigakwa mmanya ókè. M hapụrụ ntutu isi m ka o too ogologo. M tere ya ihe, kpaa ya, tinyekwa ya ákà. M na-enwe anyaụfụ, na-akparị ndị mmadụ, na-ewekwa iwe ọkụ. Agara m mkpọrọ ihe karịrị otu ugboro.

M kwagara n’otu obere obodo dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia. Mụ na enyi m nwaanyị, bụ́ onye na-ere mmanya n’otu ụlọ oriri, biri. Anyị abụọ na-aṅụ sịga na mmanya, na-akọkwa wii wii nke anyị.

OTÚ M SI KWỤSỊ ỊṄỤ ỌGWỤ ỌJỌỌ Otu ụbọchị, ka anyị ghọchara wii wii anyị, Ndịàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ mkpọkọrọ ụlọ anyị bi. Ihe m mere abụghị naanị ikweta ihe ha kwuru, kama ka oge na-aga, eji m aka m chọpụta na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Amaliteziri m ịgbanwe àgwà ọjọọ m otu otu.

N’oge na-adịghị anya, amụtara m na m kwesịrị ịkwụsị ịṅụ wii wii. Olee otú m ga-esi eme ya? Ebe ọ bụ na m tara ahụhụ kọọ wii wii m, ihe mbụ batara m n’obi bụ inye ya onye ọzọ. Ma m kpebiri na ọ gaghị adị mma inye ya onye ọzọ. M mechara bibie ha niile. Ekpere so n’ihe kacha nyere m aka ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụbiga mmanya ókè. Ekpere m ekpere ka mmụọ Chineke nyere m aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị ahụ mụ na ha na-alụ. Mụ na ndị na-eme ka ịkpa àgwà ọjọọ na-agụ m kwụsịrị ịna-akpa. Ka m na-amụ ihe Baịbụl na-akụzi, na-emekwa ihe m mụtara, m katara obi kwụsị ụfọdụ àgwà ọjọọ m na-akpa. Enyi m nwaanyị mụkwara Baịbụl, gbanweekwa otú o si ebi ndụ. Mụ na ya lụrụ. Kemgbe iri afọ abụọ na otu, ahụ́ adịla anyị mma karịa otú ọ dịbu, obi dịkwa anyị ụtọ na anyị azụchaala ụmụ abụọ anyị mụrụ. Akpata oyi na-awụ m ma m cheta otú ndụ m gaara adị ma a sị na Jehova enyereghị m aka ịgbanwe otú m si ebi ndụ.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Jehova bụ ike m na ume m.”—Aịzaya 12:2.

NDỤMỌDỤ

O kwe gị omume, zere ihe ọ bụla gbasara ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ma ndị gị na ha na-aṅụ ya ma ebe unu na-anọ aṅụ ya. A chọpụtala na ịhụ ihe ndị ahụ nwere ike ime ka ịṅụ ọgwụ ọjọọ gụwa gị.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ịṅụ ọgwụ ọjọọ nwere ike imebi ụbụrụ gị.

IHE M GA-EME!

M ṅụọ ọgwụ ọjọọ ọzọ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere mmadụ ji kwesị ịgbanwe otú o si ebi ndụ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ?

● Olee otú ịmụta eziokwu banyere Chineke ga-esi enyere mmadụ aka ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ?

Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 253]

“Ibi ndụ otú Baịbụl kwuru emeela ka obi na-adị m ụtọ ugbu a, meekwa ka ndụ m nwee isi.”​—Marta

[Foto dị na peeji nke 256]

Ịkwụsị àgwà ọjọọ nke riri gị ahụ́ dị ka ịgbapụ n’ụlọ na-agba ọkụ. Ị ga-ahapụ ihe ụfọdụ, ma ị ga-azọta isi gị