Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Nne na Nna Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Nne na Nna Na-ajụ

ISIOKWU NDỊ ỌZỌ

Ajụjụ Ndị Nne na Nna Na-ajụ

“Gịnị ka m ga-eme ka nwa m nwee ike ịna-akọrọ m ihe ọ na-eme?”

“M̀ kwesịrị ịgwa nwa m mgbe ọ ga na-alọta?”

“Olee otú m ga-esi nyere nwa m nwaanyị aka ka ọ ghara ịna-ebu ọnụ?”

Ajụjụ ndị ahụ so n’ajụjụ iri na asaa a zara n’isiokwu ndị ọzọ a. E kere ha niile ụzọ isii, deekwa ebe a kọwara isiokwu nke ọ bụla n’akwụkwọ a nakwa na nwanne ya bụ́ Nke 2.

Gụọ isiokwu ndị a. O kwe omume, gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị tụlee ha. Jirizie ndụmọdụ ndị ahụ nyere ụmụ unu aka. Ị ga-atụkwasịli azịza ndị dị ebe a obi. Ha si n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, ọ bụghị n’amamihe mmadụ, nke na-enweghị isi.—2 Timoti 3:16, 17.

290  Mkparịta Ụka

297  Inye Iwu

302  Ihe Nwa M Nwere Ike Iji Aka Ya Kpebie

307  Mmekọahụ na Mkpakọrịta Nwoke na Nwaanyị

311  Otú Obi Na-adị Nwa Gị

315  Ihe Gbasara Ofufe Chineke

 MKPARỊTA ỤKA

Ò nwere ihe o mere ma mụ na di m, nwunye m, ma ọ bụ ụmụ m na-esekarị okwu?

O nweghị di na nwunye na-anaghị enwe nghọtahie. Ma, ọ bụ gị ga-ekpebi otú ị ga-esi edozi ya. Esemokwu ndị nne na nna na-ewutekarị ndị na-eto eto. Okwu a dị mkpa n’ihi na otú unu abụọ si ebi ga-akụziri ụmụ unu otú ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha ga-esi na-ebi ma ha lụọ. Ọ ga-adị mma ka i jiri oge unu nwere nghọtahie gosi otú e kwesịrị isi na-edozi esemokwu. Megodị ihe ndị a:

Na-ege ntị. Baịbụl gwara anyị ka anyị bụrụ ndị ‘na-anụ ihe ngwa ngwa, ndị na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, ndị na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) Ejila ‘ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ.’ Ọ ga-eme ka nsogbu ahụ ka njọ. (Ndị Rom 12:17) Ọ bụrụgodị na ọ dị gị ka di gị ma ọ bụ nwunye gị achọghị ige ntị, gịnwa nwere ike ige ntị.

Gbalịsie ike ịkọwa ihe merenụ, kama ịkatọ di gị ma ọ bụ nwunye gị. Jiri olu dị nwayọọ gwa ya otú ihe o mere si wute gị. (Kwuo ihe dị ka “Ọ na-ewute m ma ị . . . ”) Ebola ya ebubo ma ọ bụ katọọ ya. (Ekwula ihe dị ka “Ihe banyere m anaghị emetụ gị n’obi,” ma ọ bụ “Ị naghị ege m ntị.”)

Gba nkịtị. Mgbe ụfọdụ, ọ na-akacha mma ịgbachi nkịtị, ma kwuo banyere nsogbu ahụ mgbe iwe unu dajụrụ. Baịbụl kwuru, sị: “Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ; ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.”—Ilu 17:14.

Rịọnụ ibe unu mgbaghara—rịọkwa ụmụ unu mgbaghara ma ọ́ dị mkpa. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na anọ aha ya bụ Brianne kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, papa m na mama m see okwu, ha na-arịọ mụ na nwanne m mgbaghara n’ihi na ha ma na o wutere anyị.” Otu ihe bara ezigbo uru i nwere ike ịkụziri ụmụ gị bụ iwetu obi, sị, “Ewela iwe.”

Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na gị na ụmụ gị na-esekarị okwu? Chọpụta ma ị̀ na-eme ka nsogbu ahụ ka njọ n’amaghị ama. Dị ka ihe atụ, gaghachigodị n’ihe ahụ a kọrọ ná mbido Isi nke 2, na peeji nke 15 n’akwụkwọ a. Ì nwere ike ịchọpụta ihe ụfọdụ mama Rechel mere nke so kpata esemokwu ahụ? Gịnị ka i nwere ike ime ka gị na nwa gị ghara ịna-ese okwu? Megodị ihe ndị a:

● Ị gwawa nwa gị ebe o mejọrọ, ekwula ihe ndị dị ka, “Ị na-eme ihe a mgbe niile,” ma ọ bụ “O nweghị mgbe ị na-eme ihe a gwara gị.” Ikwu ụdị ihe ahụ ga-eme ka nwa gị chọọ ịgọrọ ọnụ ya. O nwedịrị ike ịbụ na ihe ndị ahụ i kwuru abụchaghị eziokwu, nwa gị makwa. Nwa gị nwekwara ike ịma na ọ bụ iwe mere i ji kwuo ihe ndị ahụ, ọ bụghị n’ihi na o meghị ihe o kwesịrị ime.

● Kama ikwu ihe ga-akpasu nwa gị iwe, dị ka ịsị, “Ị na-eme ihe a mgbe niile,” gwa ya otú ihe o mere si wute gị. Dị ka ihe atụ, kwuo ihe dị ka, “Ọ na-ewute m ma i mee . . . ” Nke bụ́ eziokwu bụ na nwa gị chọrọ ka obi na-adị gị mma. I mee ka nwa gị mara otú obi dị gị, ọ ga-aka emetụ ya n’obi, ya ana-eme ihe ị gwara ya. *

● N’agbanyeghị na o nwere ike isiri gị ike, jide onwe gị ruo mgbe iwe gị dajụrụ. (Ilu 29:22) Ọ bụrụ na ọ bụ ọrụ ụlọ na-esere gị na nwa gị, gị na ya kwuo banyere ya. Dee ihe ndị ị chọrọ ka nwa gị mee. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, gwa ya ihe ị ga-eme ya ma ọ bụrụ na o meghị ya. Wetuo obi gee nwa gị ntị ma o kwuwe uche ya, ọ bụrụgodị na i kwetaghị ihe o kwuru. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-aka erube isi ma e gee ha ntị kama ịbara ha mba.

● Tupu gị ekpebie na nwa gị aghọọla onye nnupụisi, cheta na ọtụtụ n’ime àgwà nwa gị na-akpa na-egosi na o towela. Nwa gị nwere ike ịrụ gị ụka ka o gosi na ya abụghịzi taata. Ekwela ka gị na ya na-ese okwu. Cheta na nwa gị ga-amụta otú i si eme omume ma a kpasuo gị iwe. Mụta inwe ndidi na ogologo ntachi obi. Nwa gị nwere ike ịmụta ya.—Ndị Galeshia 5:22, 23.

GỤỌ ISI NKE 2 N’AKWỤKWỌ A, NA ISI NKE 24 NA NWANNE YA BỤ́ NKE 2

Gịnị ka ụmụ m kwesịrị ịma banyere ụdị ndụ m biri n’oge gara aga?

Weregodị ya na ị bụ nwaanyị: Gị na di gị, nwa gị nwaanyị, na ụfọdụ ndị enyi unu nọ na-eri nri. Ka unu na-akparịta ụka, enyi gị nwaanyị ekwute okwu otu nwa okorobịa gị na ya kpaburu tupu ị lụọ di. Ọ fọrọ obere ka ngaji nwa gị ji eri nri danahụ ya. Ya asị gị: “Ya bụ na e nwere nwoke gị na ya kpaburu.” Ị kọtụbereghị ya nwa gị nwaanyị. Ugbu a, nwa gị nwaanyị chọrọ ka ị kọọrọ ya otú o si mee. Gịnị ka ị ga-eme?

Ọ na-akacha mma ịza nwa gị ajụjụ ndị ọ jụrụ gị. A sị ka e kwuwe, mgbe ọ bụla ọ na-ajụ gị ajụjụ ma na-ege ntị mgbe ị na-aza ya, ọ bụ ụka ka gị na ya na-akparịta, nke bụ́ ihe ọtụtụ ndị nne na nna chọrọ.

Ma ị chọọ ịkọrọ nwa gị akụkọ ndụ gị, gịnị na gịnị ka i kwesịrị ịkọrọ ya? I nwere ike iche na ọ ka mma ka ị ghara ịkọrọ ya ihe i mejọrọ. Ma, mgbe o kwesịrị ekwesị, ịkọrọ ụmụ gị ihe ndị siiri gị ike nwere ike ịbara ha uru. Olee otú ọ ga-esi baara ha uru?

Ka anyị tụlee otu ihe atụ. Pọl onyeozi dere banyere onwe ya, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ. . . . Lee nhụsianya m nọ na ya!” (Ndị Rom 7:21-24) Jehova Chineke ji ike mmụọ nsọ ya mee ka Pọl dee ihe ndị ahụ na Baịbụl ka ọ baara anyị uru. N’eziokwu, ọ na-abara anyị uru n’ihi na o nweghị onye ga-asị na ihe ahụ Pọl kwuru anaghị eme ya.

Ụmụ gị nụ ihe ọma ndị i mere na ihe ndị i mejọrọ, o nwere ike inyere ha aka ịghọta gị nke ọma. N’eziokwu, otú ihe dị mgbe ị na-eto eto abụghị otú ọ dị ugbu a. N’agbanyeghị na ihe agbanweela, ndị mmadụ agbanwebeghị; ndụmọdụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ agbanwebeghịkwa. (Abụ Ọma 119:144) Ị kọọrọ ụmụ gị ndị na-eto eto nsogbu ndị i nwere na otú i si merie ha, o nwere ike inyere ha aka imeri nsogbu ndị hanwa na-enwe. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Cameron sịrị: “Ị chọpụta na ndị mụrụ gị enwetụla ụdị nsogbu ndị ị na-enwe ugbu a, ọ ga-eme ka ị ghọtakwuo ha.” O kwukwara, sị, “I nwee nsogbu mgbe ọzọ, ị ga-echewe ma ndị mụrụ gị hà enwetụla ụdị nsogbu ahụ.”

Ihe ị na-ekwesịghị ime: Ọ bụghị iwu na ị ga-enye nwa gị ndụmọdụ mgbe ọ bụla ị kọchaara ya akụkọ. N’eziokwu, ụjọ nwere ike ịtụ gị na nwa gị ga-aghọtahie ihe ahụ ị kọọrọ ya ma ọ bụdị chewe na ọ dịghị njọ ma ya mee ihe ndị ahụ na-adịghị mma i mere. Ma kama ịgwa nwa gị ihe ị chọrọ ka ọ mụta n’akụkọ ahụ, (dị ka ịsị, “Ọ bụ ya mere na i kwesịghị . . . ”) gwa ya ná nkenke otú ọ dị gị n’obi, (dị ka ịsị, “A sị na m ma, agaaraghị m eme ihe ahụ m mere n’ihi na . . . ”) I mee otú ahụ, nwa gị ga-amụta ihe n’ihe ị kọọrọ ya, ọ gaghịkwa adị ya ka ị̀ baara ya mba.—Ndị Efesọs 6:4.

GỤỌ ISI NKE 1 N’AKWỤKWỌ A

Gịnị ka m ga-eme ka nwa m nwee ike ịna-akọrọ m ihe ọ na-eme?

Mgbe ụmụ unu dị obere, o nwere ike ịbụ na ha na-agwa gị ihe ọ bụla merenụ. Ị jụọ ha ajụjụ, ha azaa ya ozugbo. N’eziokwu, ị naghịdị ajụ ha ihe ọ bula tupu ha akọọrọ gị ihe niile ka nnụnụ ọgba àmà. Ma ugbu a, ime ka ụmụ gị ndị na-eto eto gwa gị ihe ha na-eme na-adị ka ịgbalị ikute mmiri n’olulu mmiri na-adịghị. Ị na-eche, sị: ‘Ha na-akọrọ ndị enyi ha ihe ha na-eme. Gịnị mere na ha anaghị akọrọ mụnwa?’

Echela na ha kpọrọ gị asị ma ọ bụ na ha achọghị ka i nyere ha aka n’ihi na ha anaghị agwa gị ihe ha na-eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ugbu a ka i kwesịrị inyere ha aka karịchaa. Ihe kwesịrị ime gị obi ụtọ bụ na a chọpụtala na ọtụtụ ndị na-eto eto ka na-eji ndụmọdụ ndị mụrụ ha akpọrọ ihe karịa nke ndị ọgbọ ha ma ọ bụ nke ha nụrụ na tiivi ma ọ bụ na redio.

Ma gịnị mere na ha anaghị achọ ịgwa gị ihe dị ha n’obi? Gụọ ụfọdụ ihe ndị na-eto eto kwuru na ọ bụ ya mere na ha anaghị akọrọ ndị mụrụ ha ihe. Ị gụchaa ya, jụọ onwe gị ajụjụ ndị a jụrụ ebe a, gụọkwa amaokwu Baịbụl ndị e dere.

“Ọ na-esiri m ike ịga kọọrọ papa m ihe n’ihi na ọrụ o nwere karịrị akarị, ma n’ebe ọ na-arụ ọrụ ma n’ọgbakọ. M chọọ ịkọrọ ya ihe, ọ na-adị m ka o nweghị efe.”—Andru.

‘Ò nwere otú m si eme ka ụmụ m chee na mụ enweghị efe ige ha ntị? Ọ bụrụ na e nwere, gịnị ka m ga-eme ka ụmụ m nwee ike ịna-akọrọ m ihe? Olee mgbe m nwere ike iwepụta oge ka mụ na ụmụ m kparịta ụka?’—Diuterọnọmi 6:7.

“Anya mmiri juru m n’anya mgbe m na-akọrọ mama m na mụ na mmadụ sere okwu n’ụlọ akwụkwọ. Ebu m n’obi na ọ ga-akasi m obi, ma ihe o mere bụ ịbawara m mba. Kemgbe ahụ, anaghịzi m akọrọ ya ihe ọ bụla dị mụ mkpa.”—Kenji.

‘Gịnị ka m na-eme ma nwa m kọọrọ m nsogbu o nwere? Ọ bụrụgodị na e kwesịrị ịbara ya mba, ènwere m ike ijide onwe m ma gee ya ntị tupu mụ enyewe ya ndụmọdụ?’—Jems 1:19.

“Ọ dị ka ọ̀ na-abụ ndị nne na nna gwachaa nwa ha na ha agaghị ewe iwe ma ọ kọọrọ ha nsogbu ya, e mechaa, ha ewewe iwe. Ọ ga-eme ka nwa ahụ chee na ha ghọgburu ya.”—Rechel.

‘Olee otú m ga-esi jide onwe m ozugbo nwa m gwara m ihe kwesịrị iwe m iwe?’—Ilu 10:19.

“E nwere ọtụtụ mgbe m kọọrọ mama m ihe m na-achọghị ka onye ọzọ mara, ya emechaa gaa kọọrọ ya ndị enyi ya. Atụkwasịghịzi m ya obi ruo ogologo oge.”—Chantelle.

‘Ọ bụrụ na nwa m akọọrọ m ihe ọ na-achọghị ka ndị ọzọ mara, m̀ na-ahapụ ịkọrọ ya ndị ọzọ, nke ga-egosi na m na-akwanyere ya ùgwù?’—Ilu 25:9.

“E nwere ọtụtụ ihe m chọrọ ịkọrọ ndị mụrụ m. Ma m chọrọ ka ha jụọ m ihe ga-eme ka m kọọrọ ha ya.”—Courtney.

‘M̀ nwere ike ịgwa nwa m ihe ga-eme ka ọ kọọrọ m ihe? Olee oge ga-akacha mma ka mụ na ya kparịta ụka?’—Ekliziastis 3:7.

E nwere ọtụtụ uru ndị nne na nna ga-erite ma ha mee ka ha na ụmụ ha na-akparịta ụka. Chegodị banyere ihe mere otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Junko, bụ́ onye Japan. O kwuru, sị: “E nwere mgbe m gwara mama m na obi na-eru m ala ma mụ na ụmụ akwụkwọ ibe m nọrọ karịa mgbe mụ na Ndị Kraịst ibe m nọ. N’echi ya, ahụrụ m akwụkwọ ozi mama m deweere m n’elu tebụl m. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ gwara m na e nwekwara mgbe yanwa chere na ya agaghị emetali enyi n’ọgbakọ. O chetaara m ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, ndị jeere Chineke ozi n’agbanyeghị na o nweghị onye ọ bụla nọ ha nso nke ga-agba ha ume. Ọ jakwara m mma na m gbalịrị imeta ndị bụ́ ezigbo mmadụ enyi. O juru m anya na ọ bụghị naanị m nwetụrụla ụdị nsogbu a. Obi tọrọ m ụtọ mgbe m matara na mama m nwedịrị ụdị nsogbu ahụ, ọ gbakwara m anya mmiri. Ihe ahụ mama m gwara m gbara m ume, meekwa ka m kpebisie ike ime ihe dị mma.”

Dị ka mama Junko chọpụtara, ndị na-eto eto na-akọrọ ndị mụrụ ha ihe ma ọ bụrụ na ha achọpụta na a gaghị achị ha ọchị ma ọ bụ katọọ ha ma ha kwuo ihe dị ha n’obi. Ma, gịnị ka i nwere ike ime ma o yie ka obi adịghị nwa gị mma ma ọ bụ na ezigbo iwe ji ya mgbe ọ na-agwa gị okwu? Gbalịsie ike ka ị ghara iji iwe zaa ya. (Ndị Rom 12:21; 1 Pita 2:23) Kama, n’agbanyeghị na o nwere ike isiri gị ike, jiri okwu gị na àgwà gị gosi nwa gị na-eto eto ihe ị chọrọ ka ọ mụta.

Cheta na ka ụmụaka na-eto, àgwà ha ga na-agbanwe. Ndị ọkachamara achọpụtala na omume ndị na-eto eto na-agbanwe agbanwe. Ha metụ ka ndị torola eto, ha emetụ ka ụmụaka. Ị chọpụta na nwa gị na-eme otú ahụ, gịnị ka i nwere ike ime, nke ka nke, ma ọ kpaa àgwà ụmụaka?

Gbalịa ka ị ghara ịbakasị ya mba ahụ́. Ekwekwala ka gị na ya sewe okwu ka ụmụaka. Kama ime otú ahụ, gwa ya okwu ka “onye ga-emecha too.” (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Dị ka ihe atụ, nwa gị kwuo okwu ka ụmụaka ma sị gị, “Gịnị mere i ji enyekarị m nsogbu?” o nwere ike ịdị gị ka i jiri iwe zaa ya. Ma, i mee otú ahụ, mkparịta ụka ahụ ga-adazi ájá ájá, unu nwekwara ike isewe okwu. Ma, i nwere ike ịsị ya: “Ọ dị ka ezigbo iwe ò ji gị. Ọ ga-aka mma ka anyị kwuo banyere ya mgbe ọzọ mgbe obi dị gị mma.” I mee otú ahụ, unu ka nwere ike ịkparịta ụka mgbe ọzọ. Unu ga-enwe ike ịkparịta ụka, kama isewe okwu.

GỤỌ ISI NKE 1 NA NKE 2 N’AKWỤKWỌ A

 INYE IWU

M̀ kwesịrị ịgwa nwa m mgbe ọ ga na-alọta?

Iji nyere gị aka ịza ajụjụ ahụ, were ya na ụdị ihe a mere n’ezinụlọ gị: O jirila nkeji iri atọ gafee oge ị gwara nwa gị nwoke ka ọ lọta, gị anụ ka ọnụ ụzọ ụlọ unu ji nwayọọ na-emeghe. Ị nọ na-agwa onwe gị, sị, ‘O chere na alakpuola m.’ Ma, ị ka mụ anya. Ị nọ ọdụ n’akụkụ ọnụ ụzọ kemgbe oge o kwesịrị ịlọta ruru. Ọnụ ụzọ ahụ emepechaala ugbu a, anya gị na nwa gị akụkọtakwa. Gịnị ka ị ga-ekwu? Gịnị ka ị ga-eme?

E nwere ọtụtụ ihe i nwere ike ime. I nwere ike ileghara ihe ahụ o mere anya ma gwa onwe gị, sị, ‘Ụmụaka ga na-akpa àgwà ụmụaka.’ Ma ọ bụkwanụ, i nwere ike iji iwe kwuo, sị, “Ị gaghị esikwa n’ụlọ a pụọ ọzọ!” Kama iwe iwe, gegodị ya ntị, a dịghị ama ama ya abụrụ na o nwere ezi ihe mere na ọ lọtaghị n’oge. I nweziri ike iji iwu ahụ ọ dara kụziere ya ihe ga-abara ya ezigbo uru. Olee otú ị ga-esi mee ya?

Aro: Gwa nwa gị na gị na ya ga-ekwu banyere ihe ahụ echi. N’oge kwesịrị ekwesị, gị na ya nọdụ ala kwurịta ihe unu ga-eme banyere ihe ahụ merenụ. Ihe ụfọdụ ndị nne na nna na-eme bụ: Ọ bụrụ na nwa ha alọtaghị mgbe ha gwara ya lọta, ya chọọ ịpụ n’oge ọzọ, ha agwa ya ka ọ lọta nkeji iri atọ tupu oge o kwesịrị ịlọta. Ma, ọ bụrụ na nwa ahụ na-alọta mgbe ọ bụla unu gwara ya lọta, nke gosiri na o kwesịrị ntụkwasị obi, unu nwere ike ịhapụ ya ka ọ na-ekpebi ihe ụfọdụ ọ na-eme, ikekwe gbatịkwuoro ya oge ọ ga-eji lọta. Ọ dị mkpa ka nwa unu mara kpọmkwem oge unu chọrọ ka ọ na-alọta na ihe unu ga-eme ya ma ọ bụrụ na ọ lọtaghị mgbe unu gwara ya lọta. N’ihi ya, unu kwesịrị ime ya ihe unu kwuru ma ọ bụrụ na ọ lọtaghị n’oge.

Ma, buru n’obi na Baịbụl kwuru, sị: ‘Meenụ ka a mara na unu nwere ezi uche.’ (Ndị Filipaị 4:5) N’ihi ya, tupu unu agwa nwa unu mgbe o kwesịrị ịlọta, unu na ya nwere ike ibu ụzọ kwurịta ya ma gwa ya ka o kwuo mgbe o chere o kwesịrị ịlọta nakwa ihe mere o ji chee otú ahụ. Unu nwere ike ime ihe ahụ o kwuru. Ọ bụrụ na nwa unu egosila na o kwesịrị ntụkwasị obi, unu nwere ike ịhapụ ya ka ọ lọtawa mgbe o kwuru na ya ga na-alọta, ma ọ bụrụ na o nweghị nsogbu ọ ga-akpata.

Mmadụ kwesịrị ịna-eme ihe n’oge. Ihe mere ị ga-eji gwa nwa gị mgbe o kwesịrị ịlọta abụghị naanị ka o zere nsogbu. Ọ bụ ịkụziri ya ihe ga-abara ya uru mgbe o biiri nke onwe ya.—Ilu 22:6.

GỤỌ ISI NKE 3 N’AKWỤKWỌ A, NA ISI NKE 22 NA NWANNE YA BỤ́ NKE 2

Uwe ụmụ m chọrọ iyi sewere mụ na ha okwu, gịnị ka m ga-eme?

Chee banyere ihe ahụ a kọrọ ná mmalite peeji nke 77 n’akwụkwọ a. Were ya na Rut bụ nwa gị nwaanyị. Ị hụrụ ka o yi uwe tapagidere ya n’ahụ́ na-achọ ịpụ. N’anya gị, ọ gba ọtọ. Ihe pụrụ gị n’ọnụ bụ, “Ngwa, gaa yipụ ihe ahụ ozugbo, ma ọ́ bụghị ya, o nweghị ebe ị na-aga!” Mba ahụ ị baara ya nwere ike ime ka ọ gaa yipụ uwe ahụ. A sị ka e kwuwe, ọ bụ nwa gị nwaanyị, ihe ị gwara ya ka ọ ga-eme. Ma olee otú ị ga-esi mee ka ọ mata ụdị uwe o kwesịrị ịna-eyi?

● Nke mbụ, cheta na nsogbu iyi uwe na-adịghị mma nwere ike ịkpata kwesịrị ịna-echu nwa gị ụra karịa otú o si echu gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na nwa gị achọghị ịdị ka onye iberiibe, ma ọ bụ ka onye ọ bụla hụrụ ya nyewe ya nsogbu. Wetuo obi kọwaara ya na uwe na-adịghị mma anaghị eme ka mmadụ makwuo mma. * Gwa ya ụdị uwe o kwesịrị ịna-eyi.

● Nke abụọ, nwee ezi uche. Jụọ onwe gị, sị, ‘Otú uwe ahụ dị ò megidere ihe Baịbụl kwuru, ka ọ̀ bụ naanị na ọ dịghị mụ mma?’ (2 Ndị Kọrịnt 1:24; 1 Timoti 2:9, 10) Ọ bụrụ naanị na ọ dịghị gị mma, ì nwere ike ịhapụ ya ka o yiri ya?

● Nke atọ, agwala nwa gị naanị na uwe ahụ adịghị mma. Nyere ya aka ịmata uwe kwesịrị ekwesị. Ọ ga-adị mma ka i jiri ihe e dere na peeji nke 82 na nke 83 n’akwụkwọ a nyere nwa gị aka ịmata ụdị uwe dị mma. Ọ ga-abara gị na ya uru!

GỤỌ ISI NKE 11 N’AKWỤKWỌ A

M̀ kwesịrị ikwe ka nwa m na-egwu egwuregwu kọmputa?

E mepụtala egwuregwu kọmputa ndị na-adịbughị mgbe ị na-eto eto. Olee otú ị ga-esi nyere nwa gị aka ịchọpụta nsogbu egwuregwu kọmputa nwere ike ịkpatara ya ma zere ya?

Ọ gaghị aba uru ma ị katọọ ụlọ ọrụ na-emepụta egwuregwu kọmputa ma ọ bụ kwuo na igwu egwuregwu kọmputa bụ igbu oge. Cheta na ọ bụghị egwuregwu kọmputa niile dị njọ. Ma, ha nwere ike ịna-agba mmadụ ara. N’ihi ya, chọpụta awa ole nwa gị ji egwu egwuregwu kọmputa. Chọpụtakwa ụdị egwuregwu na-atọ nwa gị ụtọ. I nwedịrị ike ịjụ nwa gị ajụjụ ndị dị ka:

● Olee egwuregwu kọmputa ụmụ klas unu na-egwukarị?

● Gịnị ka a na-eme n’egwuregwu ahụ?

● Gịnị ka i chere mere ọtụtụ ndị ji egwu ya?

I nwere ike ịchọpụta na nwa gị ma ọtụtụ ihe banyere egwuregwu kọmputa karịa ka i chere! O nwere ike ịbụ na o gwuola ndị i chere na ha adịghị mma. Ụdị ihe ahụ mee, ewela oké iwe. Ọ bụ mgbe ahụ ka i nwere ike inyere nwa gị aka ịzụ ikike nghọta ya.—Ndị Hibru 5:14.

Jụọ nwa gị ajụjụ ndị ga-enyere ya aka ịmata ihe mere egwuregwu ndị na-adịghị mma ji atọ ya ụtọ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ ya, sị:

● Ọ̀ dị gị ka ị̀ gbara iche n’ihi na a naghị ekwe gị gwuo egwuregwu ahụ?

Ihe mere ụfọdụ ndị na-eto eto ji egwu egwuregwu ụfọdụ bụ ka ha nwee ihe ha ga-akọrọ ndị ọgbọ ha. Ọ bụrụ na nwa gị na-eme otú ahụ, ihe ị ga-eme nwere ike ịdị iche n’ihe ị ga-eme ma ị chọpụta na nwa gị na-egwu egwuregwu ebe a na-eme ihe ike na-awụ akpata oyi ma ọ bụ ebe a na-enwe mmekọahụ.—Ndị Kọlọsi 4:6.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na egwuregwu na-adịghị mma na-atọ nwa gị ụtọ? Ụfọdụ ndị na-eto eto nwere ike ikwu ozugbo na ihe ọjọọ ha na-eme n’egwuregwu kọmputa anaghị eme ha ihe ọ bụla. Ha na-eche, sị: ‘Ime ya n’egwuregwu kọmputa apụtaghị na m ga-eme ya n’ìhè.’ Nwa gị chee otú ahụ, chetara ya ihe e kwuru n’Abụ Ọma 11:5. Amaokwu ahụ mere ka o doo anya na ọ bụghị naanị ime ihe ike ka Chineke kpọrọ asị, kama ọ kpọkwara onye hụrụ ime ihe ike n’anya asị. Otú ahụ ka ọ kpọkwara mmekọahụ rụrụ arụ na omume ọjọọ ndị ọzọ Baịbụl kwuru na ha adịghị mma asị.—Abụ Ọma 97:10.

Ọ bụrụ na egwuregwu kọmputa aghọọrọ nwa gị ọnwụnwa, megodị ihe ndị a:

● Ekwela ka a na-egwu egwuregwu kọmputa n’ebe zoro ezo, dị ka n’ime ụlọ ebe a na-ehi ụra.

● Nye iwu ndị dị ka, ‘Tupu mmadụ egwuo egwuregwu kọmputa, ọ ga-ebu ụzọ rụchaa ihe ndị nkụzi nyere ya rụọ n’ụlọ, richaa nri abalị, ma ọ bụ mee ihe ndị ọzọ dị mkpa.’

● Mee ka a ghọta na egwuregwu ndị na-eme ka ọsụsọ gbaa mmadụ bara ezigbo uru.

● Na-ele ụmụ gị anya mgbe ha na-egwu egwuregwu kọmputa ma ọ bụ gị esoro ha na-egwu ya mgbe ụfọdụ.

N’eziokwu, ị chọọ ịkụziri ụmụ gị ụdị egwuregwu kọmputa ha kwesịrị ịna-egwu, ọnụ kwesịrị ịka gị. N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ụdị ihe m na-ele na tiivi nakwa na fim?’ Buru n’obi na ọ bụrụ na ị bụ onye ihu abụọ, ụmụ gị ga-ama!

GỤỌ ISI NKE 30 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2

Ọ́ bụrụkwanụ na ihe dị ka ekwe ntị na kọmputa na-agba nwa m ara?

Ihe nwa gị na-arụ mgbe niile ọ̀ bụ ịwagharị n’Ịntanet, ide ozi n’ekwe ntị ma ọ bụ ịgụ ozi e ziteere ya? Ka ịkpọ egwú ò meela ka ọ ghara inwe efe ka gị na ya kparịta ụka? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị ga-eme?

I nwere ike ịnara nwa gị ihe ahụ. Ma, echela na tiivi, ekwe ntị ma ọ bụ kọmputa dị njọ. A sị ka e kwuwe, o nwere ike ịbụ na i nwere ndị nke papa gị hà na-enweghị. N’ihi ya, kama ịnara nwa gị nke ya n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya, ọ ga-adị mma ka i jiri oge a kụziere ya otú ọ ga-esi jiri ihe ahụ na-eme ihe bara uru, ka ọ ghara ịna-eri ya oge. Olee otú ị ga-esi mee ya?

Gị na nwa gị nọrọ ọdụ kwuo banyere ya. Buru ụzọ gwa ya ihe mere ihe ọ na-eme ji echu gị ụra. Ihe nke abụọ bụ ige ntị n’ihe ọ chọrọ ikwu. (Ilu 18:13) Ihe nke atọ bụ ịchọpụta ihe ga-eme ka ọ gbanwee. Ụjọ atụla gị ịgwa ya ihe ị chọrọ ka o mee. Ma nwee ezi uche. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ellen kwuru, sị: “Mgbe ide ozi n’ekwe ntị na-agba m ara, ndị mụrụ m anapụghị m ekwe ntị m; ihe ha mere bụ inye m iwu ndị nyeere m aka. Otú ha si gwa m okwu nyeere m aka ịkwụsịlata ya, ọ bụrụgodị na ha anọghị nso.”

Ọ́ bụrụkwanụ na nwa gị agwa gị na ihe ya na-eme adịghị njọ? Echela na ndụmọdụ ahụ i nyere ya bụ mmiri a wụsara n’okwute. Kama nke ahụ, nwee ndidi ma nyetụ nwa gị ohere ichebara ihe ị gwara ya echiche. O nwere ike bụrụ na o kwetara ihe i kwuru, ọ ga-agbanwekwa ka oge na-aga. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-eme ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Hailey. Ọ sịrị: “Iwe were m mgbe ndị mụrụ m gwara m na kọmputa m na-agbazi m ara. Ma, m chebaara ihe ahụ ha gwara m echiche ma chọpụta na ọ bụ eziokwu.”

GỤỌ ISI NKE 36 N’AKWỤKWỌ A

 IHE NWA M NWERE IKE IJI AKA YA KPEBIE

Gịnị na gịnị ka m kwesịrị ịhapụ nwa m ka o jiri aka ya kpebie?

Ajụjụ a nwere ike ịdị gị ka ò siri ike ma i cheta na e nwere ihe ụfọdụ nwa gị na-agaghị achọ ịgwa onye ọzọ. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na nwa gị nwoke nọ n’ime ụlọ ya, mechie ụzọ? Ì kwesịrị ịbanye n’ebughị ụzọ kụọ aka? Ọ́ bụrụkwanụ na nwa gị nwaanyị chefuru ekwe ntị ya n’ụlọ gawa ụlọ akwụkwọ? Ì kwesịrị ịgụ ozi ndị dị n’ekwe ntị ya?

Ịza ajụjụ ndị a adịghị mfe. I kwesịrị ịma ihe nwa gị na-eto eto na-eme, kwesịkwa inyere ya aka ka ihe ọ bụla ghara ime ya. Ma, o nweghị otú ị ga-esi soro nwa gị na-aga ebe niile ọ na-aga ma ọ bụ jiri onyokomita na-ahụ ihe niile ọ na-eme. Gịnịzi ka ị ga-eme ka ị ghara imefe ihe ókè?

Nke mbụ, cheta na ọ bụrụ na onye na-eto eto ezochiere ndị mụrụ ya ihe ụfọdụ ọ na-eme, ọ bụghị mgbe niile ka ọ pụtara na o nwere ihe ọjọọ ọ na-eme. Ụdị ihe ahụ na-egosikarị na nwa ahụ etowela. Ka ndị na-eto eto na-eji aka ha emeta ndị enyi, jirikwa “ike iche echiche” ha na-echebara nsogbu ndị ha nwere echiche, izochi ihe ụfọdụ ha na-eme na-enyere ha aka ịmata ma hà ga-anọli nke onwe ha. (Ndị Rom 12:1, 2) Ọ na-enyekwara ha aka inwe ọgụgụ isi, bụ́ ihe ga-eme ka ha mara ihe ma ha too. Ọ ga-emekwa ka ha mụta iche echiche tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme ma ọ bụ zaa ajụjụ siri ike.—Ilu 15:28.

Nke abụọ, cheta na ị chọọ ka ị na-agwa nwa gị ihe ọ bụla ọ ga-eme, o nwere ike ịkpasu ya iwe, meekwa ka o nupụwara gị isi. (Ndị Efesọs 6:4; Ndị Kọlọsi 3:21) Ọ̀ pụtara na ị ga-ahapụ ya ka o mewe otú dị ya mma? Mbanụ, ọ bụ gị mụrụ ya. Ma, ihe dị mkpa bụ ka nwa gị nwee akọnuche a zụrụ azụ. (Diuterọnọmi 6:6, 7; Ilu 22:6) Inyere nwa gị aka ịzụ akọnuche ya bara uru karịa inyochawa ihe ọ bụla ọ na-eme.

Nke atọ, gị na nwa gị kwuo banyere ya. Gee ya ntị mgbe ọ na-ekwu ihe na-ewe ya iwe. Lee ma ì nwere ike ikweta ihe ụfọdụ o kwuru. Gwa ya na ị gaghị na-enyocha ihe ọ bụla ọ na-eme ma ọ bụrụ na ọ gaghị emechu gị ihu. Gwa ya ihe ị ga-eme ya ma o nupụ isi. Meekwa ihe i kwuru ma ọ daa iwu ahụ. Ka obi sie gị ike na ịhapụ nwa gị na-eto eto ka o nwee ihe ụfọdụ ọ na-anaghị akọrọ gị agaghị eme ka ị ghara ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ nna.

GỤỌ ISI NKE 3 NA NKE 15 N’AKWỤKWỌ A

Olee mgbe nwa m kwesịrị ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ?

“Ndị nkụzi anyị amaghị otú e si akụzi ihe!” “Ihe ha na-enye m ka m rụọ n’ụlọ karịrị akarị!” “Ịgafe n’ule na-abụrụ m ọgụ na mgba, gịnịdị mere m ga-eji na-enye onwe m nsogbu?” Ọ bụ ụdị nsogbu ndị ahụ na-eme ka ụfọdụ ndị na-eto eto chewe echiche ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ tupu ha amụta ihe ndị ga-enyere ha aka ịna-akpata ihe ha ga-eri. Ọ bụrụ na ike ịga ụlọ akwụkwọ agwụwala nwa gị, gịnị ka ị ga-eme? Megodị ihe ndị a:

Chebara otú gịnwa si ele ịga ụlọ akwụkwọ echiche. Mgbe ị dị obere, ì weere ịga ụlọ akwụkwọ ka igbu oge? Ọ̀ dị gị ka à tụrụ gị mkpọrọ ruo ụbọchị ị ga-apụta ma chọrọ ihe ka mma ị ga-emewe? Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịbụ ya mere ike ụlọ akwụkwọ ji agwụ ụmụ gị. N’eziokwu, ịga ụlọ akwụkwọ ga-enyere ụmụ gị aka inweta “ezi amamihe na ikike iche echiche,” nke ga-enyere ha aka ime ihe ndị ha kpebiri ime.—Ilu 3:21.

Nye ha ihe ndị ha ga-eji amụ ihe. Ụfọdụ ụmụaka ndị kwesịrị ịna-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ anaghị eme nke ọma n’ihi na ha amaghị otú e si amụ ihe ma ọ bụ na ha enweghị ebe dị mma ha ga-anọ mụọ ihe. Ọ ga-adị mma ka e nwee tebụl a na-akwajughị ihe n’elu ya, ezigbo ọkụ e ji ahụ ụzọ, na akwụkwọ ndị e ji eme nchọnchọ n’ebe a na-anọ amụ ihe. I nwere ike inyere nwa gị aka imewe nke ọma, ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ihe gbasara ife Chineke, ma o nwee ebe dị mma ọ ga-anọ echebara ihe ndị ọ na-agụ echiche.—Tụlee 1 Timoti 4:15.

Na-elebara nwa gị anya. Were ndị nkụzi ka ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ, ọ bụghị ndị iro gị. Gbalịa ka gị na ha mata. Mata aha ha. Gaa ka gị na ha kparịta ihe nwa gị kpebiri ime n’ọdịnihu na nsogbu ndị ọ na-enwe n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụrụ na ọ na-esiri nwa gị ike ịgafe n’ule, gbalịa chọpụta ihe na-akpata ya. Dị ka ihe atụ, nwa gị ò chere na ụmụ akwụkwọ ibe ya ga-achọwa ya okwu ma o mee nke ọma n’ule? È nwere onye nkụzi ya na ya na-ese okwu? È nwere ihe ha na-amụ na-esiri ya ike? Ọ bụrụ na ihe ha na-amụ na-esiri ya ike, o kwesịrị ime ka o jisie ike kama ime ka ike ụlọ akwụkwọ gwụ ya. I nwekwara ike ịchọpụta ma ò nwere nsogbu ndị ọzọ, dị ka nsogbu anya ma ọ bụ na ịmụta ihe na-esiri ya ike.

Ọ bụrụ na ị na-eleba anya n’ihe nwa gị na-amụ, ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ọgbakọ, o nwere ike ime ka ọ na-eme nke ọma.—Abụ Ọma 127:4, 5.

GỤỌ ISI NKE 19 N’AKWỤKWỌ A

Olee otú m ga-esi ama na nwa m etoruola ịga biri nke onwe ya?

Serena ahụ e dere ihe o kwuru n’Isi nke 7 n’akwụkwọ a na-atụ ụjọ ịga biri nke onwe ya. Gịnị mere ụjọ ji atụ ya? Ọ sịrị: “M chọgodị iji ego m zụrụ ihe, papa m anaghị ekwe. Ọ na-asị na ọ bụ ya kwesịrị ịna-azụrụ m ihe. N’ihi ya, ụjọ na-atụ m ma m cheta ịga biri nke onwe m ma na-azụ ihe ndị dị mụ mkpa.” O doro anya na papa Serena na-echere ya echiche ọma, ma ì chere na ọ na-enyere nwa ya aka ịmụta otú ọ ga-esi elekọta ezinụlọ ya ma ọ lụọ di?—Ilu 31:10, 18, 27.

Ị̀ na-emere ụmụ gị ihe niile, nke ga-eme ka ha ghara ịma otú ha ga-esi na-eme ihe ụfọdụ ma ha biri nke onwe ha? Olee otú ị ga-esi mara ma ị̀ na-eme otú ahụ? Tụlee ihe anọ ndị a ha kwesịrị ịmụta, bụ́ ndị e kwuru n’Isi nke 7, n’isiokwu nta bụ́ “Èjikerela M?” Ma jiri anya onye bụ́ nne ma ọ bụ nna leba ha anya ugbu a.

Iji ego eme ihe bara uru. Ụmụ gị hà ma ego ole e ji egbo mkpa ezinụlọ, dị ka ịzụ nri, ịkwụ ụgwọ ụlọ, na ịtụ ụtụ isi? (Ndị Rom 13:7) Hà amụtala na ha ekwesịghị ịna-eji ụgwọ? (Ilu 22:7) Hà nwere ike ịhazi otú ha si emefu ego ha na-akpata ma kowe akpa ha ebe aka ha ga-eru? (Luk 14:28-30) Hà amatala otú obi si adị mmadụ ụtọ ma o jiri ego ọ kpatara zụọ ihe dị ya mkpa? Hà achọpụtala na mmadụ na-aka enwe obi ụtọ ma o were oge ya na ego ya na-enyere ndị ọzọ aka?—Ọrụ 20:35.

Ịrụ ọrụ a na-arụ n’ụlọ. Ụmụ gị ndị nwaanyị na ndị nwoke hà ma otú e si esi nri? Ị̀ kụzierela ha otú e si asa ákwà na otú e si ede ha ayọn? Ọ bụrụ na ha na-anya ụgbọala, hà nwere ike ime ihe ndị dị ka ịgbanwe bọlb nwụrụ anwụ, mmanụ, ma ọ bụkwanụ taya dara afọ?

Ha na ndị ọzọ imekọ ihe n’udo. Mgbe ọ bụla ụmụ gị ndị toro eto sere okwu, ị̀ na-eme ka ogbu pịọm, jiri aka gị doziere ha esemokwu ahụ? Ka ị̀ kụzierela ha otú ha ga-esi ekwurịta ihe na-esere ha, dozie nsogbu ha ma gwa gị otú ha si dozie ya?—Matiu 5:23-25.

Ime ihe gbasara ofufe Chineke. Ị̀ na-agwa ụmụ gị ihe ha kwesịrị ikwere, ka ị̀ na-eme ka ha ghọta ihe mere ihe ị na-akụziri ha ji bụrụ eziokwu? (2 Timoti 3:14, 15) Kama ịza ajụjụ ọ bụla ha jụrụ gbasara ozizi Baịbụl na àgwà ọma, ị̀ na-akụziri ha inwe “ikike iche echiche”? (Ilu 1:4) Obi ọ̀ ga-adị gị ụtọ ma ha soro otú i si amụ Baịbụl, ka ị̀ chọrọ ka otú ha si amụ Baịbụl ka nke gị mma? *

O doro anya na ọ dịghị mfe ịkụziri ụmụaka ihe ndị a e kwuru, ọ na-ewekwa oge. Ma mgbalị i mere agaghị efu ọhịa, n’ihi na obi ga-adị gị ụtọ mgbe ha na-aga ibiri nke onwe ha n’agbanyeghị na ọ ga-ewute gị na ha na-akwapụ n’ụlọ gị.

GỤỌ ISI NKE 7 N’AKWỤKWỌ A

 MMEKỌAHỤ NA MKPAKỌRỊTA NWOKE NA NWAANYỊ

M̀ kwesịrị ịgwa nwa m banyere mmekọahụ?

Ụmụaka ugbu a na-amụta ihe gbasara mmekọahụ mgbe ha ka dị obere. Ọtụtụ afọ gara aga, Baịbụl buru amụma na ihe a ga-eji mata “oge ikpeazụ” bụ “oge dị oké egwu, nke tara akpụ,” bụ́ mgbe ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-adịghị ejide onwe ha” na “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1, 3, 4) Otú ọtụtụ ndị si akwa iko taa so n’ihe na-egosi na amụma a emezuola.

Ọ bụghị otú ụwa dị ugbu a ka ọ dị mgbe unu toro. Ma, nsogbu ndị unu nwere yitụrụ ndị ụmụ unu na-enwe taa. N’ihi ya, unu ekwela ka ihe ọjọọ a na-eme n’ebe niile, bụ́ ndị ụmụ unu na-ahụ, mee ka unu daa mbà. Kama nke ahụ, kpebisienụ ike inyere ha aka ime ihe ahụ Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga ka ha mee, nke bụ́: “Yirinụ ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke, ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu.” (Ndị Efesọs 6:11) N’eziokwu, ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eto eto na-agbasi mbọ ike ime ihe ziri ezi n’agbanyeghị ihe ọjọọ ọtụtụ ndị na-eme taa. Olee otú unu nwere ike isi nyere ụmụ unu aka ime otú ahụ?

Otu ihe unu nwere ike ime bụ unu na ha ịkparịta ụka. Unu nwere ike ịhọrọ isiokwu ụfọdụ ná Nkebi nke 4 n’akwụkwọ a nakwa ná Nkebi nke 1 na nke 7 na nwanne ya bụ́ Nke 2. E dere amaokwu Baịbụl ndị ga-eme ka mmadụ chee echiche n’isiokwu ndị ahụ. Ụfọdụ n’ime amaokwu ndị ahụ kọrọ banyere ndị mere ihe ziri ezi, nke mere ka Chineke gọzie ha nakwa ndị nupụụrụ Chineke isi ma taa ahụhụ. Amaokwu ndị ọzọ ga-eme ka ụmụ unu ghọta na unu na ha nwere nnukwu ihe ùgwù nke bụ́ irubere iwu Chineke isi. Ọ ga-adị mma ka gị na ha tụlee isiokwu ndị ahụ n’oge na-adịghị anya.

GỤỌ ISI NKE 23, 25, NA NKE 32 N’AKWỤKWỌ A, NA ISI NKE 4-6, 28, NA 29 NA NWANNE YA BỤ́ NKE 2

M̀ kwesịrị ikwe ka nwa m na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya kpawa?

Mee elu mee ala, a ga-enyerịrị ụmụ unu nsogbu ka ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha kpawa. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Filip kwuru, sị: “Ọ bụghị m na-achọ ụmụ agbọghọ. Ọ bụ ha na-abịa arịọ m ka mụ na ha kpawa. Mụ anọrọzie na-eche, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a?’ Ọ na-esiri m ike ịjụ n’ihi na ụfọdụ n’ime ha mara ezigbo mma!”

Ihe kacha mma unu bụ́ ndị nne na nna kwesịrị ime bụ ịkpọ ụmụ unu ndị na-eto eto ka unu kwurịta banyere mkpakọrịta nwoke na nwaanyị. Ihe e dere n’Isi nke 1 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2 nwere ike inyere unu aka. Chọpụta ihe nwa gị chere banyere nsogbu ndị ọ na-enwe n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ọgbakọ. Mgbe ụfọdụ, unu nwere ike ikwurịta ya mgbe unu na-anaghị amụ ihe, dị ka ‘mgbe unu nọ ọdụ n’ụlọ unu na mgbe unu na-eje ije n’okporo ụzọ.’ (Diuterọnọmi 6:6, 7) Mgbe ọ sọrọ ya bụrụ, cheta na i kwesịrị “ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.”—Jems 1:19.

Obi amapụla gị ma nwa gị kwuo na e nwere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ihe ya masịrị ya. Otu nwa agbọghọ kwuru, sị: “Mgbe papa m chọpụtara na e nwere nwoke mụ na ya na-akpa, ezigbo iwe were ya! Ọ jụrụ m ọtụtụ ajụjụ iji menye m ụjọ, ya bụ, ajụjụ ndị ga-eme ka m chewe na mụ etorubeghị ịlụ di. Ụdị ajụjụ ndị ahụ nwere ike ime ka nwa agbọghọ kpebie na ya agaghị ahapụ nwoke ya na ya na-akpa, iji gosi ndị mụrụ ya na ihe ha chere abụghị eziokwu!”

Nwa gị chọpụta na ị chọghịdị ka unu kwuo ihe ọ bụla gbasara mkpakọrịta nwoke na nwaanyị, nsogbu o nwere ike ịkpata bụ na o nwere ike izochiri gị enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị o nwere. Otu nwa agbọghọ kwuru, sị: “Ndị mụrụ ụmụ wee oké iwe, ọ na-eme ka ụmụ ha gbalịkwuo izochi enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị ha nwere. Ọ naghị eme ka ha kwụsị ya. Ọ na-eme ka ha na-ezokwu ya ezo.”

Ọ ga-aka baara unu uru ma unu na ha kwurịta banyere ya. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ aha ya bụ Brittany kwuru, sị: “Ndị mụrụ m na-agwa m hoo haa ihe ha chere banyere mkpakọrịta nwoke na nwaanyị. Ha kwesịrị ịma onye ihe ya masịrị m, echekwara m na ọ dị mma! Papa m na onye ahụ na-akparịta ụka. E nwee ihe na-eme ha obi abụọ, ha na-agwa m. Ọtụtụ mgbe, ana m ekpebi na achọghị m, tupu onye ahụ asị m ka anyị kpawa.”

Ma ị gụchaa Isi nke 2 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị, ‘Nwa m ò nwere ike inwe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ya na ya na-akpa ma zochiere m ya?’ Gụọ ihe ndị na-eto eto kwuru nwere ike ime ka mmadụ na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-akpa na nzuzo. Chebakwara ajụjụ ndị na-eso ya echiche.

“Obi anaghị adị ụfọdụ ndị na-eto eto mma n’ụlọ ha. Ọ bụ ya mere ha ji enwe enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị ga-eme ka obi dị ha mma.”—Wendy.

Gịnị ka ị ga-eme ka obi na-adị ụmụ gị mma? È nwere ihe ndị ị ga-eme iji mekwuo nke ọma? Ọ bụrụ na e nwere, gịnị ka ha bụ?

“Mgbe m dị afọ iri na anọ, nwa akwụkwọ ibe m rịọrọ m ka m bụrụ enyi ya nwaanyị. Ekwetara m. M chere na ọ ga-adị mma ka nwa okorobịa na-ekonye m aka n’olu.”—Diane.

Ọ bụrụ na Diane bụ nwa gị, gịnị ka ị ga-eme?

“Ekwe ntị na-eme ka ime enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị na nzuzo dị mfe. Nne na nna agaghị ama ihe na-emenụ!”—Annette.

Gịnị ka ị ga-eme ka ụmụ gị ghara iji ekwe ntị kpatara onwe ha nsogbu?

“Ọ na-adịrị ndị na-eto eto mfe inwe enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị na nzuzo ma ọ bụrụ na anya anaghị eru ndị mụrụ ha ala ịmata ihe ụmụ ha na-eme, na ndị ha na ha na-akpa.”—Tọmọs.

È nwere ihe ndị i nwere ike ime iji matakwuo ihe nwa gị na-eme, ma kwe ka ọ na-ekpebi ihe o kwesịrị iji aka ya kpebie?

“Ndị nne na nna anaghị anọkarị n’ụlọ mgbe ụmụ ha nọ n’ụlọ. Ụfọdụ na-ekwekarị ka ụmụ ha soro ndị ọzọ kpapụ n’ihi na obi siri ha ike na o nweghị ihe ga-eme ha.”—Nicholas.

Chegodị banyere onye bụ́ ezigbo enyi nwa gị. Ị̀ ma ihe ha na-eme ma ha nọrọ naanị ha?

“Ụmụaka nwere ike inwe enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị na nzuzo ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ha anaghị ekwe ha megharịa ahụ́.”—Pọl.

Olee otú i nwere ike isi mee ka ‘a mara na i nwere ezi uche’ n’emebighị iwu Baịbụl na ụkpụrụ ya?—Ndị Filipaị 4:5.

“Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na anọ, onwe m na-eme m ihere, m na-achọ onye mụ na ya ga na-akpa. Amalitere m izigara otu nwa okorobịa nọ n’ọgbakọ dị nso ozi iimel, nke mere ka o rie m obi. O mere ka obi na-adị mụ mma.”—Linda.

Olee ihe ka mma i chere a gaara eme ka obi na-adị Linda mma n’ụlọ ha?

Ọ ga-adị mma ka gị na nwa gị tụlee Isi nke 2 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2 nakwa ihe e dere n’Isiokwu Ndị Ọzọ a. Ihe ga-akacha mee ka nwa gị ghara ịna-ezo ihe ọ na-eme ezo bụ gị na ya ịkparịta ụka, onye ọ bụla ekwuo otú ọ dị ya n’obi.—Ilu 20:5.

GỤỌ ISI NKE 1 RUO NKE 3 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2

 OTÚ OBI NA-ADỊ NWA GỊ

Gịnị ka m kwesịrị ime ma nwa m sị na ọ chọrọ igbu onwe ya?

N’obodo ụfọdụ, ndị na-eto eto na-egbukarị onwe ha. Dị ka ihe atụ, n’Amerịka, ihe nke atọ kacha akpata ọnwụ ndị na-eto eto dị n’agbata afọ iri na ise na iri abụọ na ise bụ na ha na-egbu onwe ha. N’ime afọ iri abụọ gara aga, ụmụaka ole ndị dị n’agbata afọ iri na afọ iri na anọ, bụ́ ndị na-egbu onwe ha, arịala elu okpukpu abụọ. Ndị na-eto eto ndị kacha egbu onwe ha bụ ndị ihe na-emetụ n’isi, ndị si n’ezinụlọ na-egbukarị onwe ha, na ndị chọtụrụla igbu onwe ha. Ihe ụfọdụ ga-egosi na onye na-eto eto achọwala igbu onwe ya bụ:

● Ọ ga na-anọkarị naanị ya

● Ọ gaghị na-eri nri otú ọ na-eribu, ọ gaghị na-ehi ụra otú ọ na-ehibu

● Ọ gaghịzi na-achọ ime ihe ndị na-atọbu ya ụtọ

● Omume ya ga-agbanwe

● Ọ ga-amalite ịṅụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè

● Ọ ga na-enye ndị mmadụ ezigbo ihe o nwere

● Ọ ga na-ekwu banyere ọnwụ ma ọ bụ ihe gbasara ọnwụ ana-echu ya ụra

Ihe kacha njọ nne ma ọ bụ nna nwere ike ime bụ ileghara ihe ndị ahụ anya. Ejila ihe ọ bụla o kwuru egwuri egwu. Ekwula ngwa ngwa na nsogbu nwa gị bụ n’ihi na ọ na-eto eto.

Ihere emela gị ịchọ onye ga-enyere nwa gị aka ma ọ bụrụ na ike ụwa gwụrụ ya ma ọ bụ na ihe na-emetụ ya n’isi. I chee na nwa gị chọrọ igbu onwe ya, jụọ ya banyere ya. Ụfọdụ chere na ị gwa onye na-eto eto banyere mmadụ igbu onwe ya, ọ ga-eme ka o gbuo onwe ya. Ihe ahụ abụghị eziokwu. Obi na-eru ọtụtụ ndị na-eto eto ala ma ndị mụrụ ha malite ikwu banyere ya. N’ihi ya, nwa gị kweta na ya na-eche banyere igbu onwe ya, chọpụta ma ò kpebiela otú ọ ga-esi mee ya. Ọ bụrụ na o kpebiela, chọpụta otú ọ chọrọ isi mee ya na mgbe ọ chọrọ ime ya. Ọ bụrụ na o kpebichaala ụdị ihe ahụ, mara na i kwesịrị inyere ya aka n’egbughị oge.

Echela na nsogbu ahụ ga-alara onwe ya. O yie ka ọ̀ laala, echela na okwu ebiela. Kama iche otú ahụ, mara na ọ bụ mgbe ahụ ka nsogbu ya nwere ike ịka njọ. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ike ụwa gwụ onye na-eto eto, ike igbu onwe ya nwere ike ghara ịdị ya. Ma, o nwetatụ onwe ya, o nweziri ike igbu onwe ya.

Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị na-eto eto na-eche echiche igbu onwe ha n’ihi na ike ụwa agwụla ha. Ọ bụrụ na anya ruo ndị nne na nna na ndị ọzọ toro eto ala ịchọpụta ihe na-egosi na onye na-eto eto achọwala igbu onwe ya ma mee ihe ha kwesịrị ime, ha nwere ike ‘ịgụgụ mkpụrụ obi dara mbà’ ma bụụrụ ndị na-eto eto ebe mgbaba.—1 Ndị Tesalonaịka 5:14.

GỤỌ ISI NKE 13 NA NKE 14 N’AKWỤKWỌ A, NA ISI NKE 26 NA NWANNE YA BỤ́ NKE 2

M̀ kwesịrị izochiri ụmụ m na m na-eru uju?

Di gị ma ọ bụ nwunye gị nwụọ, ọ na-agbawa obi. Ma, ọ bụ mgbe ahụ ka i kwesịrị inyere nwa gị na-eto eto aka. Ka ị na-agbalị idi ọnwụ ahụ, olee otú ị ga-esi nyere ya aka idi ya? Gbalịa mee ihe ndị a:

Emela ka ọ naghị ewute gị. Nwa gị mụtara ọtụtụ ihe ga-abara ya ezigbo uru n’aka gị mgbe ọ na-ele gị anya. Ọ ga-esikwa n’aka gị mụta otú ọ ga-esi die ọnwụ mmadụ. N’ihi ya, echela na ihe ọma ị ga-emere nwa gị bụ ime ka ọnwụ ahụ anaghị ewute gị. I mee otú ahụ, nwa gị nwekwara ike ịmụta ime ka ọnwụ ahụ anaghị ewute ya. Ma, ọ bụrụ na i gosi na ọ na-ewute gị, ọ ga-amụta na ọ dị mma ka mmadụ gosi na ihe na-ewute ya karịa ime ka ọ naghị ewute ya, nakwa na ihe nwere ike iwute mmadụ, gwụ ya ike ma ọ bụ wee ya iwe.

Gbaa nwa gị ume ka o kwuo okwu. Gbaa ya ume ka ọ gwa gị otú obi dị ya, ma amanyela ya amanye. Ọ bụrụ na ọ chọghị ịgwa gị ihe ọ bụla, ọ ga-adị mma ka gị na ya tụlee Isi nke 16 n’akwụkwọ a. Kọọrọ ya ihe ndị ọ na-abụ i cheta banyere di gị ma ọ bụ nwunye gị nwụrụ anwụ obi atọọ gị ụtọ. Mee ka ọ ghọta na ọ ga-esiri gị ike idi ọnwụ ahụ. Ị gwa nwa gị otú obi dị gị, ọ ga-eme ka o kwuo otú obi dị ya.

Mara ihe ndị ị na-agaghị emeli. O doro anya na ị chọrọ ịgbalịsi ike inyere nwa gị aka n’oge nsogbu a. Ma, cheta na ọnwụ di ma ọ bụ nwunye ị hụrụ n’anya na-agbawa obi. O nwere ike imebi gị obi, isi ana-agba gị ghara ghara, ike agaghịkwa adị gị ime ihe ọ bụla. (Ilu 24:10) N’ihi ya, o nwere ike ịdị mkpa ka ị gwa ndị ezinụlọ unu bụ́ ndị toro eto ma ọ bụ ndị enyi gị ma nke a na-akọ ka ha nyere gị aka. Ịgwa ha ka ha nyere gị aka ga-egosi na ị ma ihe. Ilu 11:2 kwuru, sị: “Ndị dị obi umeala nwere amamihe.”

Ọ bụ Jehova Chineke ga-akacha enyere gị aka. O kwere ndị na-efe ya nkwa, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”—Aịzaya 41:13.

GỤỌ ISI NKE 16 N’AKWỤKWỌ A

Olee otú m ga-esi nyere nwa m nwaanyị aka ka ọ ghara ịna-ebu ọnụ?

Ọ bụrụ na nwa gị anaghị ekwe eri nri, gịnị ka ị ga-eme? Buru ụzọ gbalịa ịghọta ihe mere nwa gị ji eme otú ahụ.

A chọpụtala na ọtụtụ ndị na-anaghị ekwe eri nri bụ ndị onwe ha na-eme ihere, ndị na-achọ imetacha ihe niile, na ndị na-atụ anya ime ihe ha na-agaghị emeli. Gbalịsie ike ka ị ghara iso na-akpata ihe ahụ ọ na-eme. Na-agba ya ume.—1 Ndị Tesalonaịka 5:11.

Cheekwa echiche banyere otú gịnwa si ele iri nri na ibu ibu anya. Ò nweela otú okwu gị ma ọ bụ omume gị si mee ka nwa gị chee na ihe ndị ahụ dị njọ? Cheta na ndị na-eto eto anaghị eji otú ha dị egwuri egwu. Ị maa nwa gị njakịrị na o buru “ibu ụmụaka” ma ọ bụ “ibu onye na-eto eto,” o nwere ike inyewe ya nsogbu n’obi n’ihi na ụmụaka na-ekwetakarị ihe ọ bụla a gwara ha.

Mgbe i chebachaara nsogbu ahụ echiche, kpeekwa ekpere banyere ya, wetuo obi ka gị na ya kwuo banyere ya. Ihe nwere ike inyere gị aka ime otú ahụ bụ ime ihe ndị a:

● Chebara ihe ị ga-ekwu na mgbe ị ga-ekwu ya echiche.

● Gwa ya hoo haa ihe na-echegbu gị nakwa na ị chọrọ inyere ya aka.

● Ya ejula gị anya ma o kwuo ozugbo na ihe ọ na-eme dị mma.

● Wetuo obi gee ya ntị.

Ihe kacha mkpa ị ga-eme bụ ịgbalịsi ike nyere nwa gị aka ka nsogbu ya kwụsị. Gwa onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu ka o nyere ya aka!

GỤỌ ISI NKE 10 N’AKWỤKWỌ A, NA ISI NKE 7 NA NWANNE YA BỤ́ NKE 2

  IHE GBASARA OFUFE CHINEKE

Olee otú m ga-esi na-akụziri ụmụ m ihe gbasara ofufe Chineke mgbe ha na-eto eto?

Baịbụl kwuru na a ‘malitere n’oge Timoti bụ nwa ọhụrụ’ kụziwere ya Okwu Chineke. O nwekwara ike ịbụ na ị na-emere ụmụ gị otú ahụ. (2 Timoti 3:15) Ma ka ụmụ gị na-etolite, o nwere ike ịbụ na i kwesịrị ịgbanwe otú i si akụziri ha ihe. N’oge ahụ, ụmụ gị amalitela ịghọta ihe ndị siri ike ha na-agaraghị aghọta mgbe ha ka dị obere. Ọ bụ ugbu a ka ọ kacha mkpa ka i mee ka ha jiri ‘ike iche echiche ha’ na-aghọta ihe.—Ndị Rom 12:1.

Mgbe Pọl degaara Timoti akwụkwọ, o kwuru banyere ihe Timoti ‘mụtara, na ihe ndị e mekwara ka o kwere.’ (2 Timoti 3:14) O nwere ike ịbụ ugbu a ka i kwesịrị ‘ime ka ụmụ gị kwere’ eziokwu Baịbụl ndị ha mụtara mgbe ha dị obere. Ị chọọ ka o ruo ha n’obi, ihe i kwesịrị ime abụghị naanị ịgwa ha ihe ha ga-eme ma ọ bụ ihe ha ga-ekwere. Ha kwesịrị iji aka ha mata na ọ bụ eziokwu. Olee otú ị ga-esi nyere ha aka? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ime ka ha nwee ike ịtụgharị uche n’ajụjụ ndị a na ikwu banyere ha:

● Gịnị mere m ji kweta na Chineke dị adị?—Ndị Rom 1:20.

● Olee otú m si mara na ihe ndị mụrụ m ji Baịbụl akụziri m bụ eziokwu?—Ọrụ 17:11.

● Gịnị mere m ji kweta na iwu Baịbụl ga-abara m uru?—Aịzaya 48:17, 18.

● Olee otú m si mara na amụma ndị dị na Baịbụl ga-emezu?—Jọshụa 23:14.

● Gịnị mere m ji kweta na o nweghị ihe dị n’ụwa a nke dị ka “uru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs”?—Ndị Filipaị 3:8.

● Olee uru àjà mgbapụta Kraịst chụrụ baara m?2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15; Ndị Galeshia 2:20.

O nwere ike ịna-eme gị obi abụọ ịgwa ụmụ gị ka ha chebara ụdị ajụjụ ndị ahụ echiche n’ihi na i chere na ha agaghị azatali ha. Ma i mee otú ahụ, ị ga-eyi onye na-achọghị ile anya n’ihe na-egosi ebe mmanụ ụgbọala ya ruru n’ihi na ọ chọghị ịhụ na mmanụ agwụla n’ụgbọala ya. Ọ bụrụ na ọ gwụla, ọ ga-akacha mma ka onye ahụ chọpụta ya mgbe ọ ka nwere ike ịgbanye ọzọ! I nwere ike imere ụmụ gị otú ahụ. Ugbu a gị na ha ka bi ka i kwesịrị inyere ha aka ịtụle ajụjụ ndị gbasara ihe ha kweere ma mee ka ha kwetasie ike. *

Cheta na ọ dịghị njọ ma nwa gị jụọ, sị, “Gịnị mere m ji kweta?” Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Diane chetara na ya mere otú ahụ mgbe ya na-eto eto. O kwuru, sị: “Achọghị m ka ihe m kweere na-eme m obi abụọ. Inweta azịza ndị doro anya mere ka m ghọta na ịbụ Onyeàmà Jehova na-atọ m ụtọ! Mgbe ọ bụla a jụrụ m ajụjụ banyere ihe m na-anaghị eme, kama ịza, ‘Ndị okpukpe anyị anaghị eme ya,’ m ga-aza, ‘Echeghị m na ọ dị mma.’ Ihe ọ pụtara bụ na kwetara ihe Baịbụl kwuru.”

Aro: Ihe ga-enyere gị aka ịmata otú nwa gị ghọtaruru ụkpụrụ Baịbụl bụ ịgwa ya ka o mee ka ọ̀ bụ nne ma ọ bụ nna mgbe nsogbu bịaara ya. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwa gị gwara gị ka i kwe ka ya gaa oriri na nkwari gị na ya ma na o kwesịghị ịga. Kama ịsị ya mba ozugbo, i nwere ike ịsị ya: ‘M chọrọ ka i were na ị bụ m. Chee banyere oriri na nkwari ahụ ị chọrọ ịga, mee nchọnchọ (i nwere ike ịgụ Isi nke 37 n’akwụkwọ a, na Isi nke 32 na nwanne ya bụ́ Nke 2), bịazie echi ka anyị kwuo banyere ya. M ga-eme ka m̀ bụ gị, gwa gị na m chọrọ ịga oriri na nkwari ahụ, gị emee ka ị̀ bụ nne ma ọ bụ nna ma gwa m ma ọ̀ dị mma ka m gaa ma ọ bụ na ọ dịghị mma.’

GỤỌ ISI NKE 38 N’AKWỤKWỌ A, NA ISI NKE 34 RUO NKE 36 NA NWANNE YA BỤ́ NKE 2

Nwa anyị na-eto eto anaghịzi achọ ime ihe ọ bụla gbasara ofufe Chineke. Gịnị ka anyị ga-eme?

Nke mbụ, echela ozugbo na nwa unu ajụla ihe unu kweere. A na-enwekarị ihe na-akpata ya. Dị ka ihe atụ, nsogbu nwa gị nwere ike ịbụ na

● Ndị ọgbọ ya na-enye ya nsogbu, ihere ana-emekwa ya ịdị iche n’ihi ime ihe Baịbụl kwuru

● Ọ na-ahụ ndị ọzọ na-eto eto na ụmụnne ya ka ha na-ebi ndụ otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ebi, ma chee na ya enweghị ike ime ka ha

● Ọ chọrọ ndị enyi, ma ọ dị ya ka ọ̀ na-agba iche ma ya na Ndị Kraịst ibe ya nọrọ

● Ọ na-ahụ ndị na-eto eto bụ́ ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst ka ha na-ebi ndụ ihu abụọ

● Ọ chọrọ iji aka ya kpebie ihe ọ ga-ekwere, nke mere ka ọ rụwa gị ụka n’ihe ndị ị na-akụziri ya

● Ọ na-ahụ ka ụmụ klas ha na-eme ihe ọjọọ otú masịrị ha, ma ya adị ka ha anaghị ata ahụhụ ya

● Ọ na-agbalị ime ka obi dị nne ya ma ọ bụ nna ya na-abụghị Onyeàmà Jehova mma

I kwesịrị iburu n’obi na ụdị nsogbu ndị ahụ agbasachaghị ihe okpukpe unu na-akụzi. Ha gbasara ihe nwere ike ime ka o siere nwa gị ike ikpe okpukpe unu ugbu a. N’ihi ya, gịnị ka ị ga-eme iji gbaa nwa gị ume?

Mee ka obi dị ya mma, n’emebighị iwu Chineke. Gbalịa ghọta ihe mere nwa gị ji daa mbà, meekwa ihe i kwesịrị ime ka ọ dịrị nwa gị mfe ime nke ọma n’ofufe Chineke. (Ilu 16:20) Dị ka ihe atụ, “Ihe M Ga-eme ma Ndị Ọgbọ M Nyewe M Nsogbu,” nke dị na peeji nke 132 na nke 133 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2, nwere ike ime ka obi sie nwa gị ike imeri nsogbu ụmụ akwụkwọ ibe ya na-enye ya. Ọ bụrụ na nwa gị enweghị ndị enyi, i nwere ike inyere ya aka imeta ezigbo ndị enyi.

Chọtara ya onye ọ ga na-eṅomi. Ọ na-abara ndị na-eto eto uru mgbe ụfọdụ ma e nwee onye si n’ezinụlọ ọzọ na-agba ha ume. Ị̀ ma onye na-eme nke ọma n’ofufe Chineke nke nwere ike ịna-agba nwa gị na-eto eto ume? Ọ ga-adị mma ka i mee ka ya na nwa gị na-anọrị. Ihe mere i ji eme ya abụghị ka i leghara ọrụ gị anya. Ma cheta Timoti. O ritere ezigbo uru n’àgwà ọma Pọl onyeozi, Pọl eritekwa ezigbo uru mgbe ya na Timoti so na-eje ozi.—Ndị Filipaị 2:20, 22.

Ebe ọ bụ na gị na nwa gị na-eto eto ka bi, i kwesịrị ịtụ anya ka o soro unu na-eme ihe gbasara ofufe Chineke. Ma, ihe i kwesịrị iburu n’obi bụ ime ka nwa gị mụta ịhụ Chineke n’anya, ọ bụghị ịmanye ya ka ọ na-erube isi. Ị chọọ inyere nwa gị na-eto eto aka ịna-ekpe ezi okpukpe, i kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma ọ ga-eṅomi. Atụla anya ihe nwa gị na-agaghị emeli. Chọtara ya onye ọ ga na-eṅomi na ndị bụ́ ezigbo mmadụ ya na ha ga na-anọrị. Otu ụbọchị, nwa gị nwere ike ikwu ihe ahụ ọbụ abụ kwuru, nke bụ́: “Jehova bụ nkume m dị elu na ebe m e wusiri ike na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.”—Abụ Ọma 18:2.

GỤỌ ISI NKE 39 N’AKWỤKWỌ A, NA ISI NKE 37 NA NKE 38 NA NWANNE YA BỤ́ NKE 2

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 23 Ma, emela ka nwa gị chee na ihe mere ọ ga-eji mee ihe ị gwara ya bụ ka obi ghara ịna-ama ya ikpe.

^ par. 64 Nwa gị nwere ike ịna-eche na ya amaghị mma. N’ihi ya, ekwula ihe ga-eme ka o chewe na ọ jọrọ njọ.

^ par. 188 Isi nke 36 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2 nwere ike inyere ụmụ gị aka iji ọgụgụ isi ha kwetasie ike na Chineke dị adị.