Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Mee Ka Ife Chineke Na-atọ M Ụtọ?

Olee Otú M Ga-esi Mee Ka Ife Chineke Na-atọ M Ụtọ?

ISI NKE 38

Olee Otú M Ga-esi Mee Ka Ife Chineke Na-atọ M Ụtọ?

Jọshụa, onye dị afọ iri na isii, dina n’àkwà ya. Mama ya eguzoro n’ọnụ ụzọ jiri olu ike sị ya, “Jọshụa, bilie! Ọ̀ kwa ị ma na taa bụ ọmụmụ ihe?” A na-azụ Jọshụa ka ọ bụrụ Onyeàmà Jehova. Ezinụlọ ha na-agachikwa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova anya. Ma, Jọshụa anaghịzi achọ ịga ọmụmụ ihe.

Ọ zara mama ya, sị, “Mama, ọ̀ bụdị iwu na m ga-aga?”

Mama ya asị ya, “Kwụsị ime mkpesa, jikere. Achọghị m ịga n’azụ oge ọzọ taa!” Mama ya atụgharịa pụwa.

Mgbe mama Jọshụa nọ n’ebe ọ ka nwere ike ịnụ ihe ọ na-ekwu, Jọshụa kwuru, sị, “Mama, chere ka m gwa gị. Ihe a bụ okpukpe gị, ma ọ pụtaghị na ọ bụ nke m.” Ọ ma na mama ya nụrụ ihe o kwuru, n’ihi na ọ nụghịzi ụda ụkwụ mama ya. Ma, mama ya gbachiri ya nkịtị, gawa ebe ọ na-aga.

Obi Jọshụa mawara ya ikpe. O bughị n’obi ịkpasu mama ya iwe. Ma, ọ chọghị ịrịọ ya mgbaghara. Naanị ihe o nwere ike ime bụ ime ihe a gwara ya.

Jọshụa mara ọsụ, bilie, malite ijikere. Ọ gwaziri onwe ya, sị: “M ga-emecha kpebie ihe m ga-eme. Anaghị m eme ka ndị ọzọ na-abịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Echeghị m na m chọrọ ịbụ Onye Kraịst!”

Ò NWETỤLA mgbe ọ dị gị otú ahụ ọ dị Jọshụa? Ọ̀ na-adị gị mgbe ụfọdụ ka ịga ọmụmụ ihe, ịmụ Baịbụl, na ịga ozi ọma ọ̀ na-atọ ndị ọzọ ụtọ, ma gị ana-eme nke gị ka i mezuo iwu? Dị ka ihe atụ:

● Ịmụ Baịbụl ọ̀ na-adị gị ka ịrụ ihe ndị nkụzi nyere gị rụọ n’ụlọ?

● Ịga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ọ̀ na-agwụ gị ike?

● Ọmụmụ ihe ọgbakọ ọ̀ na-agwụkarị gị ike?

Ọ bụrụ na ị zara ee, adala mbà. I nwere ike ịmụta otú ị ga-esi eme ka ife Chineke na-atọ gị ụtọ. Ka anyị hụ ihe ndị i nwere ike ime.

NSOGBU NKE 1 Ịmụ Baịbụl

Ihe mere o ji esi ike. I nwere ike iche na “ike ịmụ ihe anaghị adị gị.” O nwekwara ike ịdị gị ka ọ̀ na-esiri gị ike ịnọ otu ebe ma mee ka obi gị dị n’ihe ị na-amụ! I nwekwara ike iche na ihe ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ ezuola.

Ihe mere i ji kwesị ịmụ Baịbụl. Ọ bụghị naanị na e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee Baịbụl, kama, “ọ bara uru iji ya zie ihe, na iji ya nyere ndị mmadụ aka, na iji ya gbazie ha ma gosi ha otú ha ga-esi bie ndụ.” (2 Timoti 3:16, Contemporary English Version) Ịmụ Baịbụl na ịtụgharị uche n’ihe ị na-agụ nwere ike ime ka ị ghọtakwuo ihe. Ghọta na ọ bụ aka ájá ájá na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ. E nwee egwuregwu ị chọrọ ịmụta nke ọma, i kwesịrị ịmụ iwu na-achị ya ma na-egwu ya mgbe niile. Ị chọọ ka ahụ́ sie gị ike, i kwesịrị ịna-emega ahụ́. Ị chọọkwa ịmata Onye kere gị nke ọma, i kwesịrị ịmụ Okwu Chineke.

Ihe ndị ọgbọ gị kwuru. “Mgbe m banyere n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m chọpụtara na m kwesịrị ikpebi otú m ga-esi bie ndụ m. O nweghị ụdị ihe ọjọọ ụmụ akwụkwọ ibe m na-anaghị eme. Ihe ndị m kwesịrị ikpebi bụ: ‘M̀ chọrọ ịna-eme ka ha? Ihe ndị mụrụ m na-akụziri m hà bụ eziokwu n’ezie?’ M kwesịrị iji aka m chọpụta.”—Tshedza.

“Ekwetara m na ihe a kụziiri m bụ eziokwu, ma m kwesịrị iji aka m chọpụta na ọ bụ eziokwu. Emere m ka ọ bụrụ okpukpe m, kama ịbụ naanị okpukpe ezinụlọ anyị.”—Nelisa.

Ihe i nwere ike ime. Kpebie otú ị ga-esi na-amụ ihe na mgbe ị ga na-amụ ya. Ọ bụ gị ga-ahọrọ isiokwu ndị ị ga-amụ. Olee ebe ị ga-amalite? Ọ ga-adị mma ka i mee nchọnchọ na Baịbụl gị ma chọpụta ma ihe ndị i kweere hà bụ eziokwu. Akwụkwọ dị ka Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? * nwere ike inyere gị aka.

Malite ozugbo! Kanye ✔ n’isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ ndị a si na Baịbụl, bụ́ ndị ị chọrọ ịmụkwu, ma ọ bụkwanụ gị edee isiokwu ọzọ.

□ Chineke ọ̀ dị adị?

□ Olee otú m nwere ike isi chọpụta na ọ bụ Chineke gwara ndị dere Baịbụl ihe ha dere?

□ Gịnị mere m ji kwesị ikwere na e kere mmadụ eke kama ikwere na mmadụ si n’enwe pụta?

□ Gịnị bụ Alaeze Chineke, oleekwa otú m nwere ike isi gosi na ọ dị adị?

□ Olee otú m nwere ike isi kọwaara mmadụ ihe m kweere banyere ihe na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ?

□ Gịnị mere obi ji kwesị isi m ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ?

□ Olee otú m nwere ike isi mata nke bụ́ ezi okpukpe?

․․․․․

NSOGBU NKE 2 Ịga Ozi Ọma

Ihe mere o ji esi ike. Ịgwa ndị mmadụ ihe Baịbụl kwuru ma ọ bụ izute nwa akwụkwọ ibe gị mgbe ị nọ n’ozi ọma nwere ike ịna-atụ gị ụjọ.

Ihe mere i ji kwesị ịga ozi ọma. Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Gaanụ mee ndị [mmadụ] ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ma e nwere ihe ndị ọzọ mere i ji kwesị ịna-aga ozi ọma. Ihe ndị a chọpụtara gosiri na n’ọtụtụ ebe, ọtụtụ ndị na-eto eto kweere na Chineke nakwa na Baịbụl. Ma, ndị ahụ na-eto eto enweghị ezigbo olileanya maka ọdịnihu. Ịmụ Baịbụl emeela ka ị mụta ọtụtụ ihe ndị ọgbọ gị chọrọ ịmata nakwa ihe ha kwesịrị ịmata! Ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere ga-eme ka obi dị gị mma, ma karịchaa, ị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.

Ihe ndị ọgbọ gị kwuru. “Mụ na enyi m kwadebere otú anyị ga-esi malite izi ndị mmadụ ozi ọma nke ga-eme ka ha gee anyị ntị. Anyị mụtakwara ihe anyị ga-ekwu iji mee ka onye na-achọghị ige ntị gee anyị ntị nakwa otú e si eme nletaghachi. Ozugbo m malitere ịgbalịsikwu ike n’ozi ọma m na-aga, ọ tọwakwuru m ụtọ.”—Nelisa.

“Otu nwanna nwaanyị enyerela m ezigbo aka! O ji afọ isii tọọ m. Ọ na-akpọ m aga ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, ọ na-azụnye m nri ụtụtụ. O gosiri m amaokwu Baịbụl ndị gbara m ume ma mee ka m gbanwee otú m si ele ihe anya. Achọpụtara m na ihe magburu onwe ya ọ kụziiri m emeela ka m na-enyekwuru ndị mmadụ aka ma m gaa ozi ọma. O nweghị otú m ga-esi kwụọ ya ụgwọ ihe o meere m!”—Shontay.

Ihe i nwere ike ime. Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị ekwe gị, chọta otu onye tọrọ gị nọ n’ọgbakọ unu, bụ́ onye gị na ya ga na-eso aga ozi ọma. (Ọrụ 16:1-3) Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ ígwè ka a na-eji amụcha ígwè. Otú ahụ ka ihu mmadụ na-amụcha ihu mmadụ ibe ya.” (Ilu 27:17) Ị ga-erite ọtụtụ uru ma ọ bụrụ na gị na ndị tọrọ gị bụ́ ndị hụrụla ọtụtụ ihe ná ndụ ana-akpa. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Alexis kwuru, sị: “N’eziokwu, ahụ́ na-eru m ala mgbe mụ na ndị tọrọ m nọ.”

Malite ozugbo! N’okpuru ebe a, dee aha onye ọgbakọ unu nke nwere ike inyere gị aka n’ozi ọma ma e wezụga ndị mụrụ gị.

․․․․․

NSOGBU NKE 3 Ịga Ọmụmụ Ihe Ọgbakọ

Ihe mere o ji esi ike. Ị nọchaa ihe niile ị nọrọ na klas, ige okwu si na Baịbụl ruo otu awa ma ọ bụ abụọ nwere ike ịdị gị ka ọ̀ bụ ihe na-agaghị ebi ebi.

Ihe mere i ji kwesị ịga ọmụmụ ihe. Baịbụl gbara Ndị Kraịst ume, sị: ‘Ka anyị na-echebara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.’—Ndị Hibru 10:24, 25.

Ihe ndị ọgbọ gị kwuru. “Mmadụ kwesịrị ịkwado akwado maka ọmụmụ ihe. Mgbe ụfọdụ, ị ga-arụ ahụ́ gị ụka iji mee ya. Ị kwadoo akwado, ọmụmụ ihe ga-atọ gị ụtọ n’ihi na ị ma ihe a na-atụle, i nwedịrị ike ịza ajụjụ.”—Elda.

“M mechara chọpụta na ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe na-eme ka ọmụmụ ihe na-atọkwu m ụtọ.”—Jessica.

Ihe i nwere ike ime. Wepụta oge kwadoo ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe tupu ị gawa. O kwe gị omume, zaa ajụjụ. Ọ ga-eme ka ị ghọta na i so n’ihe a na-eme.

Dị ka ihe atụ: Olee nke ka ụtọ, ọ̀ bụ ile ndị na-egwu egwuregwu na tiivi ka ọ̀ bụ iso na-egwu egwuregwu ahụ? O doro anya na iso na-egwu ya na-atọ ụtọ karịa ile ndị na-egwu ya. Ọ́ gaghị adị mma ka i lee ọmụmụ ihe ọgbakọ anya otú ahụ?

Malite ozugbo! N’okpuru ebe a, dee mgbe i nwere ike iwepụta naanị nkeji iri atọ n’izu ma kwadoo ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe ọgbakọ.

․․․․․

Ọtụtụ ndị na-eto eto achọpụtala na ihe Abụ Ọma 34:8 kwuru bụ eziokwu, ya bụ: “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.” Ọ̀ ga-atọ gị ụtọ naanị ịnụ na e nwere nri bụ́ e richaa a mịchaa aka? Ọ́ gaghị akara gị mma iri nri ahụ? Otú ahụ ka ife Chineke dị. Soro na-eme ihe gbasara ofufe Chineke ka ị chọpụta otú ọ na-atọ. Baịbụl kwuru na onye na-eme okwu Chineke eme, nke na-abụghị onye na-anụ naanị ọnụnụ, “ga-enwe obi ụtọ.”—Jems 1:25.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Mụta otú ị ga-esi kpebie ihe ndị ị ga-eme ma mee ha.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.”​—Ndị Rom 12:2.

NDỤMỌDỤ

Ị gawa ọmụmụ ihe, were akwụkwọ e ji ede ihe. Na-ede isi ihe ndị e kwuru. Ọ ga-eme ka oge na-agba ọsọ, meekwa ka ọ dịrị gị mfe ịmụta ihe!

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọ dịghị njọ ma ị jụọ ajụjụ banyere ihe ndị i kweere. N’eziokwu, ịjụ ajụjụ na ime nchọnchọ ga-enyere gị aka ịchọpụta ma ihe ndị i kweere banyere Chineke hà bụ eziokwu.—Ọrụ 17:11.

IHE M GA-EME!

M ga-eji nkeji ․․․․․ na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, jiri ․․․․․ na-akwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe kwa izu.

Ihe m ga-eme nke ga-enyere m aka ige ntị nke ọma n’ọmụmụ ihe bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị nwere ike ime ka ihe gbasara ofufe Chineke na-agwụ onye na-eto eto ike?

● N’ime ihe atọ a tụlere n’isiokwu a gbasara ofufe Chineke, olee nke ị chọrọ imekwu nke ọma na ya?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 278]

“Okpukpe m na-ekpe abụghịzi naanị okpukpe ndị mụrụ m, ọ bụ okpukpe m. Jehova bụ Chineke m, achọghịkwa m ime ihe ọ bụla ga-eme ka mụ na ya ghara ịdị ná mma.”​—Samantha

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 280, 281]

Ha Kpebiri Ihe Ndị Ha Chọrọ Ime n’Ofufe Chineke

Baịbụl kwuru, sị: ‘Ị maghị ihe ndụ gị ga-abụ echi.’ (Jems 4:14) Oge ụfọdụ, mmadụ na-anwụ mgbe ọ na-atụghị anya ya, mgbe ọ ka na-eto eto. Ka ị na-agụ akụkọ Catrina na Kyle, chọpụta otú ha si meere onwe ha ezi aha n’ebe Jehova Chineke nọ n’afọ ole na ole ha dịrị ndụ, n’ihi na ha kpebiri ihe ndị ha chọrọ ime n’ofufe Chineke ma mee ha.—Ekliziastis 7:1.

Catrina nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri na asatọ. Ma mgbe ọ dị afọ iri na atọ, o deela ọtụtụ ihe o kpebiri ime n’ofufe Chineke. Ihe ụfọdụ o kpebiri ime bụ ije ozi oge niile, ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl, na iso papa ya na-arụ ọrụ n’ebe a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. O dere, sị: “Enyefeela m Jehova Chineke ndụ m!” Catrina chọrọ “ibi ndụ otú Chineke chọrọ, nke ga-eme Chineke obi ụtọ.” Mgbe a na-eli Catrina, e kwuru na ọ bụ “nwa agbọghọ mara mma nke kpebiri iji ndụ ya fee Jehova.”

A malitere mgbe Kyle ka dị obere kụziwere ya ka o kpebie ihe ndị ọ ga-eme n’ofufe Chineke. Mgbe ọ dị afọ iri abụọ, ọ nwụrụ n’ihe mberede okporo ụzọ. Ndị ikwu ya mechara chọta akwụkwọ ebe e dere ihe ndị mama ya nyeere ya aka kpebie mgbe ọ ka dị afọ anọ. Ihe ụfọdụ o kpebiri ime bụ ime baptizim, ime ihe omume n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, na ije ozi n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, bụ́ ebe ọ ga-enye aka n’ibipụta akwụkwọ ndị na-enyere ndị mmadụ aka ịmata Chineke. Mgbe mama Kyle gụchara akwụkwọ ahụ e dere ọtụtụ afọ gara aga, o kwuru, sị: “O mechara ihe niile ahụ o kpebiri ime.”

Olee ihe ndị gịnwa kpebiri ime n’ofufe Chineke? Ị maghị ihe nwere ike ime gị echi. N’ihi ya, mee ihe ọ bụla i nwere ike ime n’ụbọchị ọ bụla. Jiri oge gị na-eme ihe ga-akacha baara gị uru otú ahụ Catrina na Kyle mere. Ṅomie Pọl onyeozi. Obere oge tupu ya anwụọ, ọ sịrị: “Alụwo m ezi ọgụ ahụ, agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi, edebewo m okwukwe ahụ.” (2 Timoti 4:7) Isiokwu ọzọ ga-enyere gị aka ime otú ahụ!

[Foto dị na peeji nke 274, 275]

Ị chọọ ka ahụ́ sie gị ike, i kwesịrị ịna-emega ahụ́. Ị chọọkwa ka okwukwe gị sie ike, i kwesịrị ịmụ Okwu Chineke