Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Eme Ihe Ndị M Kpebiri Ime?

Olee Otú M Ga-esi Eme Ihe Ndị M Kpebiri Ime?

ISI NKE 39

Olee Otú M Ga-esi Eme Ihe Ndị M Kpebiri Ime?

Olee nke ị chọrọ n’ime ihe ndị a?

□ Inwekwu obi ike

□ Inwekwu ndị enyi

□ Inwekwu obi ụtọ

NKE bụ́ eziokwu bụ na i nwere ike inwe ha atọ! Olee otú ị ga-esi enwe ha? Ọ bụ ikpebi na ị ga-enwe ha ma gbaa mbọ nweta ha. Tụlegodị ihe ndị a:

Inwekwu obi ike. I kpebie obere ihe ndị ị ga-eme ma mee ha, obi ga-esizi gị ike ikpebi ime ndị nnukwu. Obi ga-esikwu gị ike ná nsogbu ndị na-abịara gị kwa ụbọchị, dị ka imeri nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị.

Inwekwu ndị enyi. Ọ bụ ndị ma ihe ha chọrọ ime ná ndụ ma na-agba mbọ ime ya ka ndị mmadụ na-emetakarị enyi.

Inwekwu obi ụtọ. Obi agaghị adị gị ụtọ ma ị nọrọ nkịtị na-eche ka ihe ọma si n’elu daara gị. Ma i kpebie ihe ndị ị chọrọ ime ma mee ha, obi ga-adị gị ezigbo ụtọ. Ì jikerela ịmalite? Ihe e dere na peeji ndị na-eso nke a ga-enyere gị aka! *

✔ 1 MATA IHE NDỊ Ị CHỌRỌ

1. Chee ihe ndị i nwere ike ime. Mgbe ị na-ede ihe ndị ị ga-eme, echerela ya oké echiche; dee ihe ọ bụla batara gị n’obi. Lee ma ị̀ ga-ede ihe iri ma ọ dịkarịa ala.

2. Chọpụta nke kacha mkpa. Olee ndị nke ga-akacha atọ gị ụtọ? Olee ndị nke ga-akacha siere gị ike? Olee nke ga-akacha enye gị obi ụtọ ma i mee ya? Cheta na ị ga-akacha eme nke ọma ná ndị nke ị ma na ha ga-abara gị ezigbo uru.

3. Hazie otú ị ga-esi eme ha. Dezie ha n’usoro malite na nke ị ga-ebu ụzọ eme ruo na nke ikpeazụ.

✔ 2 HAZIE HA

Na nke ọ bụla n’ihe ndị i kpebiri ime, mee ihe ndị a:

Dee ihe i kpebiri ime.

M ga-amụ Asụsụ Ndị Ogbi ka m nwee ike ịna-ezi ha ozi ọma

Dee ụbọchị ị chọrọ imecha ya. A sị ka e kwuwe, ihe i kpebiri ime n’enweghị mgbe i bu n’obi imecha ya ga-adị ka nrọ!

M ga-amụcha ya na Julaị 1

Dee ihe ndị ị ga-ebu ụzọ mee.

Ihe ndị m ga-ebu ụzọ mee

1. M ga-azụta akwụkwọ e ji amụ ya.

2. M ga-agbalị ịmụta okwu iri n’izu ọ bụla.

3. Ndị mmadụ sụwa Asụsụ Ndị Ogbi, m ga na-ele ha anya.

4. M ga-agwa onye na-asụ ya ka ọ gwa m ebe m na-emetaghị.

Dee nsogbu ndị i nwere ike inwe. Dezie otú ị ga-esi emeri ha.

Nsogbu ndị m nwere ike inwe

O nweghị onye na-asụ Asụsụ Ndị Ogbi n’ebe m bi

Kpebisie ike ime ya. Kpebisie ike ime ihe ọ bụla i nwere ike iji mee ihe a i kpebiri ime. Bịanyezie aka n’akwụkwọ ahụ ma dee ụbọchị ị bịanyere aka.

Otú m ga-esi emeri ya

M ga-enweta vidio dị n’Asụsụ Ndị Ogbi n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ www.pr418.com.

․․․․․ ․․․․․

Bịanye aka Ụbọchị

✔ 3 BIDO!

Bido ya ozugbo. Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime taa iji bido ime ihe a m kpebiri ime?’ Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ị gaghị amatacha ozugbo otú ị ga-esi eme ihe ahụ ị chọrọ ime, ma ekwela ka o gbochie gị ibido. Dị ka Baịbụl kwuru, “ọ bụrụ na mmadụ echere mgbe ìfùfè kwụsịrị, ọ gaghị agha mkpụrụ. Ọ bụrụkwa na mmadụ elekwasị igwé ojii anya, onye ahụ agaghị ewè ihe ubi.” (Ekliziastis 11:4, Bible Nsọ Ọhụụ) Chọpụta ihe i nwere ike ime taa ma mee ya, ọ bụrụgodị obere ihe.

Na-elebara ihe ndị ahụ anya kwa ụbọchị. Na-echeta ihe mere nke ọ bụla n’ime ha ji dị gị mkpa. N’ebe ahụ i dere ha n’usoro, kanye ✔ na nke ọ bụla i mechara (ma ọ bụkwanụ gị edee ụbọchị i mechara ya).

Lepụ anya n’ihu. Were ya na ị na-ahụ mgbe i mechara ihe i kpebiri ime. Chee otú obi ga-adị gị ma i mechaa ya. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ iche otú i si mee nke ọ bụla n’ime ha. N’ikpeazụ, ị ga-ahụ onwe gị ka ị na-emecha ha otu otu, cheekwa ụdị obi ụtọ ị ga-enwe mgbe i mechara ha niile. Adala mbà!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ihe mere e ji tụọ aro ndị a bụ ka ha nyere gị aka ikpebi ihe ndị ị ga-eme ugbu a ma mee ha, ma ha nwekwara ike inyere gị aka ikpebi ihe ndị ị ga-eme n’ọdịnihu.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.”​—Ilu 21:5.

NDỤMỌDỤ

Esila ọnwụ na ị ga-emerịrị ihe niile otú ahụ i si dee ha. I nwere ike ịgbanwetụ ihe ụfọdụ ka oge na-aga.

Ị̀ MA NA . . . ?

I kpebie ime nnukwu ihe ma mee ya, obi ụtọ ị ga-enwe ga-adị ukwuu!

GỊNỊ KA I CHERE?

● Ihe mmadụ kpebiri ime otu mgbe ò nwere ike ịkarị akarị?—Ndị Filipaị 1:10.

● Ikpebi ihe ndị ị ga-eme ọ̀ pụtara na ị ga-ahazi ihe ị ga na-eme n’oge ọ bụla n’ụbọchị?—Ndị Filipaị 4:5.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 283]

“Obi nwere ike ịna-ajọkarị gị njọ ma ọ bụrụ na o nweghị ihe i kpebiri ime ma ọ bụ ihe ị na-atụ anya ime. Ma i kpebie ihe ndị ị ga-eme ma mee ha, obi ga na-adị gị mma.”​—Reed

[Igbe/Foto dị na peeji nke 283]

Ihe Ndị I Nwere Ike Ikpebi Ime

Enyi Imeta onye mụ na ya na-abụghị ọgbọ enyi. Ime ka mụ na onye bụ́bu enyi m kpawakwa.

Ahụ́ ike Iji otu awa na ọkara ma ọ dịkarịa ala na-emega ahụ́ kwa izu. Ihiru ụra awa asatọ kwa abalị.

Ụlọ akwụkwọ Imekwu nke ọma ná mgbakọ na mwepụ. Ịkata obi mee ihe ziri ezi ma ụmụ akwụkwọ ibe m nyewe m nsogbu ka m mee ihe ọjọọ.

Ofufe Chineke Iji nkeji iri na ise na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Izi nwa akwụkwọ ibe m ozi ọma n’izu a.

[Foto dị na peeji nke 284, 285]

Ihe i kpebiri ime yiri ụlọ a chọrọ ịrụ arụ. Ị ga-agba mbọ tupu i mezuo ya