Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Uche Chineke?

Gịnị Bụ Uche Chineke?

Chineke chọrọ ka anyị biri n’udo, nweekwa obi ụtọ. Ọ chọkwara ka ụwa anyị a ghọọ paradaịs ebe anyị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.

Ma, i nwere ike ịna-eche ma nke ahụ ò nwere ike ime eme. Baịbụl kwuru na Alaeze Chineke ga-eme ya. O kwukwara na ọ bụ uche Chineke ka mmadụ niile mara gbasara Alaeze ahụ, marakwa ihe Chineke bu n’obi imere anyị.​—⁠Abụ Ọma 37:​11, 29; Aịzaya 9:⁠7.

Chineke chọrọ ka anyị baara onwe anyị uru.

Nna ọ bụla hụrụ nwa ya n’anya na-achọ ka ihe gaziere ya. Otú ahụkwa ka Nna anyị nke eluigwe chọrọ ka ihe gaziere anyị, ya bụ, ka anyị nwee obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. (Aịzaya 48:​17, 18) O kwere nkwa na ‘onye na-eme uche ya ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.’​—⁠1 Jọn 2:⁠17.

Chineke chọrọ ka anyị jee ije n’ụzọ ya.

Baịbụl kwuru na Chineke ‘na-akụziri anyị ụzọ ya,’ ka anyị nwee ike ‘ije ije na ya.’ (Aịzaya 2:​2, 3) O ‘wepụtarala aha ya otu ndị,’ ka ha mee ka a mara uche ya n’ụwa niile.​—⁠Ọrụ Ndịozi 15:⁠14.

Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya dịrị n’otu.

Ife Jehova na-eme ka ndị mmadụ hụ ibe ha n’anya ma dị n’otu, ọ naghị ekewa ha. (Jọn 13:35) Ole ndị taa na-akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi jiri otu obi na-efe Chineke? Gbalịa gụọ broshọ a, ọ ga-enyere gị aka ịmata ha.