Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 4

Gịnị Mere Anyị Ji Bipụta Baịbụl A Na-akpọ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ?

Gịnị Mere Anyị Ji Bipụta Baịbụl A Na-akpọ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ?

Kongo Kinshasa

Ruwanda

Ihe a bụ mpempe akwụkwọ si na Baịbụl Symmachus sụgharịrị n’ihe dị ka otu puku na narị afọ isii ma ọ bụ asaa gara aga. N’Abụ Ọma 69:​31, o dere aha Chineke bụ́ Jehova n’asụsụ Grik

Ruo ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova nọ na-agụ nsụgharị Baịbụl dị iche iche. Anyị nọkwa na-ebipụta ha ma na-ekesara ha ndị mmadụ. Ka oge na-aga, anyị chọpụtara na ọ dị mma ka e nwee nsụgharị Baịbụl nke ga-enyere ndị mmadụ aka inweta “ezi ihe ọmụma nke eziokwu,” bụ́kwanụ ihe Chineke chọrọ ka mmadụ niile nweta. (1 Timoti 2:​3, 4) N’ihi ya, anyị malitere ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Bekee. N’afọ 1950 kwa, anyị bidoro iwepụta akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. E ji asụsụ Bekee a na-asụ n’oge a dee ya. Ndị sụgharịrị ya etinyeghị okwu nke ha ma ọ bụkwanụ gbanwee ihe ọ bụla dị n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl. Taa, a sụgharịala Baịbụl a n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri atọ.

Ọ dị mma ka e nwee Baịbụl ga-adị mfe nghọta. Asụsụ ọ bụla na-eto eto. E jikwa asụsụ Bekee mgbe ochie siri ike nghọta dee ọtụtụ Baịbụl Bekee. Ihe ọzọ bụ na e nwetara ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’oge ochie. Ndị sụgharịrị ha agbanweghị oké ihe na ha mgbe ha si n’asụsụ Hibru, Arameik na Grik e ji dee Baịbụl ná mbụ sụgharịa ha. Nke a mere ka a ghọtakwuo ihe e kwuru na Baịbụl.

Ọ dị mma ka e nwee Baịbụl ndị sụgharịrị ya na-agbanweghị ihe ọ bụla. Ndị nsụgharị Baịbụl kwesịrị ịsụgharị Okwu Chineke otú e si dee ya ná mbụ kama itinye okwu nke ha. Ma, n’ọtụtụ Baịbụl e nwere taa, ị gaghị ahụ aha Chineke, bụ́ Jehova.

Ọ dị mma ka e nwee nsụgharị ga-akwanyere Chineke ùgwù, bụ́ onye e dere uche ya na Baịbụl. (2 Samuel 23:⁠2) N’Akwụkwọ Nsọ ndị kacha mee ochie, aha Jehova pụtara ihe ruru ugboro puku asaa. Ihe e sere n’okpuru ebe a bụ otu n’ime ebe aha Chineke gbara n’Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ. Ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, e dere aha Jehova n’ebe niile ahụ ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ ochie ndị ahụ. (Abụ Ọma 83:18) Tupu anyị ebipụta Baịbụl a, anyị sara anya ná mmiri meere ya nchọnchọ ọtụtụ afọ. N’ihi ya, e dere uche Chineke otú ọ ga-ekwe onye ọ bụla nghọta, ịgụ ya na-atọkwa ndị mmadụ ezigbo ụtọ. Ma è nwere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ ị na-asụ ma ọ bụ na e nweghị, gbalịa na-agụ Baịbụl, bụ́ Okwu Jehova, kwa ụbọchị.​—⁠Jọshụa 1:8; Abụ Ọma 1:​2, 3.

  • Gịnị mere anyị ji kpebie iwepụta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ?

  • Olee ihe onye chọrọ ịmata uche Chineke kwesịrị ịna-eme kwa ụbọchị?