Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 6

Olee Uru Anyị Na-erite ma Anyị na Ụmụnna Anyị Na-akpakọrịta?

Olee Uru Anyị Na-erite ma Anyị na Ụmụnna Anyị Na-akpakọrịta?

Madagaska

Nọọwee

Lebanọn

Ịtali

Anyị anaghị ahapụ ịga ọmụmụ ihe anyị ọ sọkwa ya ya bụrụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị ezigbo anya ma ọ bụkwanụ na ụzọ anyị ga-esi aga ya bụ oké ọhịa. Ma mmiri ọ̀ na-ezo ma anwụ ọ̀ na-acha, anyị na-aga ọmụmụ ihe. Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji agba ụdị mbọ a a sịgodị na ike gwụrụ ha ma ọ bụkwanụ na ha nwere nsogbu n’ụbọchị ahụ?

Ọ na-enyere anyị aka imeri nsogbu anyị. Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu banyere ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ, ọ sịrị: ‘Na-echebaranụ ibe unu echiche.’ (Ndị Hibru 10:24) Ihe ọ na-ekwu ebe a bụ na anyị kwesịrị ịma ibe anyị nke ọma, marakwa ihe ha na ha na-alụ. Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na ụmụnna anyị na-akpa nkata. N’oge ahụ, anyị na-achọpụta na ụfọdụ n’ime ha enwetụla ụdị nsogbu ndị anyị nwere. Ha na-ejikwa oge ahụ gwa anyị otú anyị ga-esi merie nsogbu anyị otú hanwa meriri nke ha.

Ọ na-eme ka anyị na ụmụnna anyị bụrụ ezigbo enyi. Anyị na ụmụnna anyị dị ná mma, ha bụkwa ezigbo ndị enyi anyị. Ọ bụghị naanị mgbe anyị gara ọmụmụ ihe ka anyị na ha na-akpakọrịta, anyị na-ewepụtakwa oge ka anyị na ha nọkọọ tụrụ ndụ. Olee uru anyị na-erite n’oge ahụ? Anyị na-achọpụtakwu àgwà ọma onye nke ọ bụla nwere, ya emee ka anyị hụkwuo ibe anyị n’anya. E nwezie onye n’ime anyị nwere nsogbu, anyị agbatara ya ọsọ enyemaka ozugbo. (Ilu 17:17) Ebe ọ bụ na anyị na ndị niile nọ n’ọgbakọ anyị na-akpa, o gosiri na anyị ‘na-elekọta ibe anyị.’​—⁠1 Ndị Kọrịnt 12:​25, 26.

Gbalịa mete ndị na-eme uche Chineke enyi. Ebe ị ga-ahụ ụdị ndị enyi a bụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Biko, ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara ịna-abịa ọmụmụ ihe anyị.

  • Olee uru ịga ọmụmụ ihe na-abara anyị?

  • Olee ụbọchị ị ga-achọ ịbịa ọmụmụ ihe anyị?