Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 7

Olee Otú Anyị Si Amụ Ihe?

Olee Otú Anyị Si Amụ Ihe?

Niu Ziland

Japan

Yuganda

Lituenia

N’oge ochie, Ndị Kraịst na-eji abụ na ekpere amalite ọmụmụ ihe. Ha na-agụkwa Akwụkwọ Nsọ ma kọwaa ya. Ha anaghị eme ụmụ ememme ndị a na-emegasị na chọọchị taa. (1 Ndị Kọrịnt 14:26) Anyịnwa na-amụkwa ihe otú ahụ.

A na-eji Baịbụl akụziri anyị ihe ndị na-abara anyị uru. Ná ngwụcha izu ọ bụla, a na-enwe onye ga-eji nkeji iri atọ gwa ndị bịara ọmụmụ ihe okwu si na Baịbụl. A na-akpọ okwu ahụ ọ na-ekwu Okwu Ihu Ọha. Ọkà okwu ahụ ga-akọwa otú Chineke chọrọ ka anyị si na-akpa àgwà, kọwaakwa otú ihe Baịbụl kwuru si na-emezu n’oge anyị a. Ọ gụwa Baịbụl, ọ na-agwa mmadụ niile ka ha sapeta Baịbụl nke ha ma na-ele anya ebe ọ na-agụ. E kwuchaa okwu ihu ọha, anyị na-enwe ọmụmụ ihe ọzọ na-ewe otu awa. A na-akpọ ya Ọmụmụ Ihe “Ụlọ Nche.” Anyị na-amụ otu isiokwu dị n’Ụlọ Nche anyị nke a na-amụ amụ. Ọ na-abụ ajụjụ na azịza, onye ọ bụla nwekwara ike welie aka zaa ajụjụ. Ihe anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe a na-enyere anyị aka ime ihe Baịbụl kwuru. N’ụwa niile, ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị ihe karịrị otu narị puku na puku iri. Isiokwu a mụrụ n’ebe a ka a ga-amụ n’ụwa niile.

Anyị na-amụ otú e si akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke. Tupu ngwụcha izu, anyị na-enwe ọmụmụ ihe a na-akpọ Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. E kere ọmụmụ ihe a ụzọ atọ. Ọ bụ n’akwụkwọ anyị bụ́ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ka e si enweta ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe a. A na-ebipụta akwụkwọ a kwa ọnwa. Ihe a na-akpọ omụmụ ihe nke mbụ bụ, Akụ̀ Ndị Si n’Okwu Chineke. Ọ na-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe ndị e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị a gwara mmadụ niile nọ n’ọgbakọ gụọ n’ụlọ ha. Ọmụmụ ihe nke abụọ bụ, Mụtakwuo Izi Ozi Ọma nke Ọma. A na-eme ihe ngosi ndị na-enyere anyị aka ịmata otú anyị nwere ike isi kụziere ndị mmadụ Baịbụl nke ọma. Onyeisi oche ga-ekwu ihe ndị ọ chọpụtara ga-enyere mmadụ niile aka imekwu nke ọma ma ha na-agụ ihe ma ọ bụ na-akụziri ndị mmadụ ihe. (1 Timoti 4:13) Ihe a na-akpọ ọmụmụ ihe nke atọ bụ, Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ. Ọ na-enyere anyị aka ịmata otú anyị nwere ike isi na-eme ihe Baịbụl kwuru ná ndụ anyị kwa ụbọchị. A na-enwekwa ajụjụ na azịza ndị na-enyere anyị aka ịghọtakwu Baịbụl.

Ọ bụrụ na ị bịa ọmụmụ ihe anyị, otú a ga-esi akụziri gị Baịbụl ga-amasị gị.​—⁠Aịzaya 54:⁠13.

  • Gịnị na gịnị ka anyị na-amụ n’ọmụmụ ihe anyị?

  • Olee ọmụmụ ihe nke ị ga-achọ ịbịa n’izu a?