Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 10

Gịnị Bụ Ofufe Ezinụlọ?

Gịnị Bụ Ofufe Ezinụlọ?

Saụt Koria

Brazil

Ọstrelia

Gini

Kemgbe ụwa, Jehova chọrọ ka ezinụlọ ọ bụla na-anọkọ na-ekwurịta gbasara ya. Ha na-eme otú ahụ, ya na ha ga-adịkwu ná mma, udo adịrịkwa n’ezinụlọ ahụ. (Diuterọnọmi 6:​6, 7) Ọ bụ ya mere ezinụlọ Ndịàmà Jehova ọ bụla ji ewepụta otu mgbede n’izu ọ bụla iji nọkọọ fee Chineke. N’oge ahụ, ha na-ekwurịta gbasara otú ezinụlọ ha ga-esi na-emekwu uche Chineke. Ọ naghịkwa abụ oge ha ji akpasu ibe ha iwe. Ọ bụrụgodị na ọ bụ naanị gị bi, ị ga-eji oge ahụ na-amụ ihe ọ bụla ị chọrọ ịmụ gbasara Chineke.

Ọ bụ oge anyị ji abịarukwu Jehova nso. Baịbụl kwuru, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:⁠8) Anyị na-amatakwu ụdị onye Jehova bụ ma anyị gụọ Baịbụl gụta otú o si mesoo ndị mmadụ n’oge ochie. Ụzọ dị mfe i nwere ike isi malite ofufe ezinụlọ bụ gị na ndị ezinụlọ unu ịnọkọ gụọ Baịbụl, onye gụọ ibe ya agụọ. Unu nwedịrị ike gụọ ebe e kwuru ka a gụọ n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ n’izu ahụ. E nwere ike gwa onye nke ọ bụla ebe ọ ga-agụ tupu ụbọchị ahụ unu ga-enwe ofufe ezinụlọ. Ụbọchị ahụ ruzie, unu gụchaa ebe ahụ unu chọrọ ịgụ, onye ọ bụla ekwuo ihe ọ mụtara.

Ọ bụ oge na-eme ka ndị ezinụlọ na ibe ha na-adịkwu ná mma. Ofufe ezinụlọ na-eme ka di na nwunye ma ọ bụkwanụ nne na nna na ụmụ ha na-adịkwu ná mma. Oge ahụ kwesịrị ịbụ oge na-eme onye ọ bụla obi ụtọ n’ezinụlọ, nke na ha ga na-atụ anya ka o ruwe eru. Mgbe ndị nne na nna na-ekpebi ihe a ga-amụ, ha kwesịrị iburu afọ ole ụmụ ha dị n’obi. Ha nwere ike si n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Teta! ma ọ bụkwanụ na jw.org/ig họrọ isiokwu ga-abara ụmụ ha uru. Unu na ụmụ unu nwere ike kwurịta nsogbu ha nwere n’ụlọ akwụkwọ na otú ha ga-esi merie ya. Unu nwekwara ike ile otu n’ime ihe ndị e gosiri n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehovah dị na tv.pr418.com. Unu lechaa ya, unu ekwurịta ihe ndị unu mụtara na ya. Unu nwere ike mụọ abụ a ga-abụ n’ọmụmụ ihe. Ọ ga-adịkwa mma ma unu chọrọ ihe ụfọdụ unu ga-eji megharịa ọnụ ma unu nwechaa ofufe ezinụlọ.

Ọ bụrụ na ezinụlọ unu ejiri oge a pụrụ iche na-efe Jehova kwa izu, ịmụ Okwu Chineke ga na-atọ unu ụtọ. Chineke ga-agọzikwa mbọ unu na-agba.​—⁠Abụ Ọma 1:​1-3.

  • Gịnị mere anyị ji ewepụta oge anyị ji enwe ofufe ezinụlọ?

  • Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ime ka ofufe ezinụlọ na-atọ ndị ezinụlọ ha ụtọ?