Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 11

Gịnị Mere Anyị Ji Aga Mgbakọ?

Gịnị Mere Anyị Ji Aga Mgbakọ?

Meksiko

Jamanị

Bọtswana

Nikaragua

Ịtali

Olee ihe mere ihu ji bụrụ ndị e sere na peeji a ọchị ọchị? Ha nọ mgbakọ Ndịàmà Jehova. Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ka ha na-aga mgbakọ ugboro atọ n’afọ. Obi na-adị ha ụtọ ịga mgbakọ ndị ahụ. Taa, ọ na-adịkwa anyị ka oge anyị ga-aga mgbakọ mee ruwe eru. (Diuterọnọmi 16:16) Anyị na-enwe mgbakọ atọ n’afọ. Otu bụ mgbakọ ukwu. Ọ na-ewe abalị atọ. Mgbakọ abụọ ndị ọzọ bụ mgbakọ sekit. Ọ na-ewe otu ụbọchị, ma a na-enwe ya ugboro abụọ n’afọ. Olee uru ịga mgbakọ ndị a na-abara anyị?

Ha na-eme ka anyị matakwuo ụmụnna anyị. Aṅụrị na-eju ụmụ Izrel obi ma ha nọrọ “n’etiti ìgwè ndị zukọrọ ọnụ” na-eto Jehova. Anyịnwa na-enwekwa obi ụtọ ma anyị na ụmụnna anyị zukọta ná mgbakọ na-efe Jehova. (Abụ Ọma 26:12; 111:⁠1) Anyị bịa mgbakọ ndị a, anyị na ụmụnna anyị ndị si ọgbakọ dị iche iche ma ọ bụ ndị si mba ndị ọzọ na-akpakọrịta. Ihe ọzọ na-eme anyị obi ụtọ bụ na anyị na ụmụnna anyị na-erikọ nri ma a gbasaa nnọkọ nke ụtụtụ. (Ọrụ Ndịozi 2:42) Ná mgbakọ ọ bụla anyị gara, anyị na-ahụ ihe na-eme ka obi sikwuo anyị ike na anyị hụrụ ‘ụmụnna anyị dum n’anya.’​—⁠1 Pita 2:⁠17.

Ha na-enyere anyị aka ime uche Chineke. Uru ọzọ ụmụ Izrel na-erite ma ha gaa mgbakọ bụ na a na-akọwara ha Okwu Chineke nke ọma, ha aghọta ya. (Nehemaya 8:​8, 12) Anyịnwa na-ejikwa ihe ndị a na-akụziri anyị ma anyị gaa mgbakọ akpọrọ ihe. Ihe a na-atụle ná mgbakọ nke ọ bụla na-abụ ihe si na Baịbụl. A na-ekwu okwu dị iche iche, ndị mmadụ na-apụtakwa kọọ otú ha si merie nsogbu ha nwere, mgbe ụfọdụkwa ha egosi ndị bịaranụ otú ihe ahụ si mee. Ihe a niile na-enyere anyị aka ịna-eme uche Chineke. A na-akọkwara anyị otú ụmụnna anyị si na-agba mbọ ife Chineke n’oge a ihe siri ezigbo ike. Nke a na-emekwa ka anyị kpebisikwuo ike ịna-eme uche Chineke. Anyị gaa mgbakọ ukwu, a na-enwe ndị na-apụta mee ihe anyị na-akpọ Ihe Nkiri. Ọ na-abụkarị akụkọ si na Baịbụl. Ihe nkiri ahụ na-enyere ndị bịara mgbakọ ahụ aka ịghọtakwu otú ihe ahụ a kọrọ na Baịbụl si mee na ihe anyị kwesịrị ịmụta na ya. Ná mgbakọ ọ bụla anyị gara, a na-eme ndị nyeferela Chineke onwe ha baptizim.

  • Gịnị mere aṅụrị ji eju anyị obi ma anyị gaa mgbakọ?

  • Olee uru ị ga-erite ma ị bịa mgbakọ anyị?