Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 12

Olee Otú E Si Hazie Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa?

Olee Otú E Si Hazie Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa?

Spen

Belarus

Họng Kọng

Peruu

Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ma, olee otú a ga-esi kwusaa ozi ọma ahụ n’ụwa niile? Ọ bụ ma e kwusaa ya otú ahụ Jizọs si kwusaa ya mgbe ọ nọ n’ụwa.​—⁠Luk 8:⁠1.

Anyị na-agba mbọ gakwuru ndị mmadụ n’ụlọ ha. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke site n’ụlọ ruo n’ụlọ. (Matiu 10:​11-13; Ọrụ Ndịozi 5:42; 20:20) A gwara Ndị Kraịst oge ochie ebe ha ga-aga zie ozi ọma. (Matiu 10:​5, 6; 2 Ndị Kọrịnt 10:13) N’otu aka ahụ taa, a haziri otú anyị ga-esi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ahazi. Ọgbakọ ọ bụla nwekwara ebe ha na-ekwusa ozi ọma. Nke a na-enyere anyị aka ‘ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịgbara ha àmà nke ọma’ otú ahụ Jizọs gwara anyị mee.​—⁠Ọrụ Ndịozi 10:⁠42.

Anyị na-agbalị gakwuru ndị mmadụ ebe ọ bụla anyị nwere ike ihu ha. Jizọs ziri ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla ọ hụrụ ha. O nwedịrị ndị ọ nọ n’ikpere mmiri zie ozi ọma, nweekwa onye nke o ziri ozi ọma mgbe ọ bịara isere mmiri n’olulu mmiri. (Mak 4:1; Jọn 4:​5-15) Anyịnwakwa na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla anyị hụrụ ha, ma ọ̀ bụ n’okporo ámá ma ọ̀ bụ n’ebe ha na-anọ achụ afọ ha ma ọ̀ bụkwanụ n’ebe ha na-anọkarị atụrụ ndụ. Anyị na-ejidị ekwentị ezi ndị mmadụ ozi ọma. Anyị anaghịkwa agbachi nkịtị ghara izi ndị agbata obi anyị na ndị ọrụ ibe anyị ozi ọma ma ihe a ga-eji zie ha ozi ọma mee. Anyị na-agbakwa mbọ zie ụmụ akwụkwọ ibe anyị ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ. Anyị esila ụzọ ndị a niile kwusaara ọtụtụ ndị n’ụwa “ozi ọma banyere nzọpụta.”​—⁠Abụ Ọma 96:⁠2.

Ò nwere onye i chetara i nwere ike izi ozi ọma, kọọrọ ya ihe Alaeze Chineke ga-emere ya n’ọdịnihu? Ọ bụrụ na e nwere, gakwuru ya ozugbo.

  • Olee “ozi ọma” e kwesịrị ikwusa?

  • Olee otú o si bụrụ na Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma otú ahụ Jizọs si kwusaa ya?