Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 13

Ònye Bụ Ọsụ Ụzọ?

Ònye Bụ Ọsụ Ụzọ?

Kanada

Ọ na-aga ozi ụlọ n’ụlọ

Ọ na-amụrụ mmadụ ihe

Ọ na-amụ ihe

Jizọs bụ ọsụ ụzọ n’ụdị nke ya, n’ihi na Chineke zitere ya n’ụwa ka ọ bịa zie ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụrụ na ha anabata ozi ọma ahụ, a ga-azọpụta ha. (Matiu 20:28) Taa, ndị na-eso ụzọ ya na-eme ụdị ihe ahụ o mere. Ha na-aga ‘na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ’ Jizọs. (Matiu 28:​19, 20) Ụfọdụ n’ime ha aghọọla ndị anyị na-akpọ ndị ọsụ ụzọ oge niile.

Ọsụ ụzọ bụ onye na-ekwusa ozi ọma mgbe niile. Ndịàmà Jehova niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, ụfọdụ n’ime ha ahaziela oge ha ka ha nwee ike ịbụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ha na-eji awa iri asaa aga ozi ọma kwa ọnwa. Ọtụtụ n’ime ha anaghị eji ụbọchị niile dị n’izu achụ afọ ha, ka ha nwee ike na-aga ozi ọma otú ha chọrọ. A na-ahọrọ ụfọdụ n’ime ha ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. A họrọ ha, e ziga ha n’ebe a na-enwechaghị ndị na-ekwusa ozi ọma. Ha na-eji otu narị awa na iri atọ ma ọ bụ karịa aga ozi ọma kwa ọnwa. Ndị ọsụ ụzọ anaghị achụ ihe onwunwe ka à na-anwụ anwụ. Ihe ọ bụla ha nwere na-eju ha afọ. Obi na-esikwa ha ike na Jehova ga-egboro ha mkpa ha. (Matiu 6:​31-33; 1 Timoti 6:​6-8) Ndị na-enweghị ike ịbụ ndị ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwere ike bụrụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Ha na-eji iri awa atọ ma ọ bụ iri awa ise aga ozi ọma n’ọnwa.

Ọsụ ụzọ hụrụ Chineke na ụmụ mmadụ n’anya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ chọpụtara na e nwere ọtụtụ ndị chọrọ ịma banyere Jehova na nzube ya. Anyị chọpụtakwara otu ihe ahụ taa. (Mak 6:34) Ma, Jehova akụzierela anyị otú anyị ga-esi na-enyere ha aka ka ha nwee nchekwube na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ọ bụ otú ọsụ ụzọ si hụ ndị agbata obi ya n’anya mere o ji eji oge ya na ike ya ekwusara ha ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 22:39; 1 Ndị Tesalonaịka 2:⁠8) Ihe a niile ọ na-eme na-enye aka eme ka okwukwe ya sikwuo ike, ya na Chineke adịrịkwuo ná mma. Ọ na-emekwa ka obi na-adị ya ụtọ.​—⁠Ọrụ Ndịozi 20:⁠35.

  • Ònye bụ ọsụ ụzọ?

  • Olee ihe na-eme ka mmadụ kpebie na ya ga-abụ ọsụ ụzọ oge niile?