Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 21

Gịnị Bụ Betel?

Gịnị Bụ Betel?

Ngalaba na-ahụ maka ihe a na-ese n’akwụkwọ anyị. Ọ dị n’Amerịka

Jamanị

Kenya

Kolombia

Betel bụ okwu Hibru. Ọ pụtara “ụlọ Chineke.” (Jenesis 28:​17, 19) Ihe a ka a na-akpọ ebe niile Ndịàmà Jehova na-anọ ebi akwụkwọ ha ma na-ahazi otú ọrụ ikwusa ozi ọma ha na-arụ ga-esi na-aga. Aha a dabara adaba n’ihi na ihe niile a na-eme ebe ahụ bụ gbasara ofufe Chineke. Òtù Na-achị Isi nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Niu Yọk nke Amerịka. Ha na-anọ ebe ahụ ekwu otú ihe ga-esi na-aga n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche e nwere n’ụwa. A na-akpọ ma ndị na-arụ n’isi ụlọ ọrụ anyị ma ndị na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị ndị ezinụlọ Betel. Ihe mere e ji akpọ ha ezinụlọ bụ na ha bi otu ebe, na-arụkọkwa ọrụ ọnụ. Ha na-anọ otu ebe eri nri, na-amụkọkwa Baịbụl ọnụ.​—⁠Abụ Ọma 133:⁠1.

Ọ bụ ebe pụrụ iche ndị mmadụ na-eji obi ha niile arụkọ ọrụ ọnụ. Ị gaa na Betel, ị ga-ahụ ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Ha ji obi ha niile na-eme uche Chineke. Ha jikwa oge ha niile na-arụ ọrụ gbasara Alaeze Chineke. (Matiu 6:33) A naghị akwụ ha ụgwọ ọnwa, kama, a na-enye ha ego mmachi akpa. A na-enyekwa ha nri na ụlọ ha ga-ebi. Onye ọ bụla nọ na Betel nwere ọrụ ọ na-arụ. E nwere ndị na-arụ n’ọfịs, nweekwa ndị na-arụ n’ebe a na-esi nri, ma ọ bụ n’ebe a na-anọ eri nri. Ụfọdụ na-arụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ, ndị ọzọ ana-arụ n’ebe a na-asa ákwà. E nwekwara ndị na-edowe ụlọ ọcha nakwa ndị na-emezi ihe ndị mebiri emebi.

Ọ bụ ebe a na-arụ ọrụ gbasara Alaeze Chineke. Ọrụ bụ́ isi a na-arụ na Betel bụ ọrụ gbasara ịkụziri ndị mmadụ Okwu Chineke. Akwụkwọ a i ji bụ otu n’ime ihe ndị e ji akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke. Ọ bụ Òtù Na-achị Isi kpebiri ihe e dere na ya, e jirizie kọmputa zigara ya ọtụtụ ndị nsụgharị e nwere n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche. Mgbe ha sụgharịchara ya, e jiri ígwè na-ebipụta ọtụtụ akwụkwọ n’otu ntabi anya bipụta ya. Mgbe e bichara ya, e bugaara ya ọgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere n’ụwa niile. Ha dị ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ na puku iri. Ihe a niile ndị ezinụlọ Betel mere bụ iji kwado ọrụ kacha mkpa anyị na-arụ. Ọrụ ahụ bụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.​—⁠Mak 13:⁠10.

  • Ole ndị na-arụ na Betel? Oleekwa otú e si elekọta ha?

  • Olee ọrụ dị mkpa onye ọ bụla nọ na Betel na-akwado?