Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 22

Gịnị Ka A Na-eme n’Alaka Ụlọ Ọrụ?

Gịnị Ka A Na-eme n’Alaka Ụlọ Ọrụ?

Sọlọmọn Aịlands

Kanada

Saụt Afrịka

Ndị ezinụlọ Betel na-arụ ọrụ na ngalaba dị iche iche. Ọrụ niile ha na-arụ bụ maka ozi ọma a na-ekwusa ná mba ebe alaka ụlọ ọrụ ahụ dị ma ọ bụkwanụ ná mba ndị ọ na-elekọta. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị nsụgharị, ndị ọzọ na-arụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ. O nwekwara ndị na-arụ n’ebe a na-ebusa akwụkwọ, nwee ndị nke na-arụ n’ebe a na-emepụta ma vidio ma siidi ndị a na-egere egere. O nwere ndị ọrụ ha bụ ịhụ maka nsogbu ọ bụla e nwere n’ebe alaka ụlọ ọrụ ahụ na-elekọta.

Kọmitii Alaka na-elekọta ya. O nwere ndị Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta n’alaka ụlọ ọrụ ọ bụla ka ha na-ahụ maka ọrụ niile a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ. A na-akpọ ha Kọmitii Alaka. Ha na-adị ndị okenye atọ ma ọ bụ karịa. Ọ bụ ha na-agwa Òtù Na-achị Isi otú ihe si na-aga ná mba ahụ nakwa ná mba ndị ọzọ ha na-elekọta. E nweekwa nsogbu ọ bụla, ha agwa ha. Ihe ndị ahụ ha na-agwa Òtù Na-achị Isi na-enyere ha aka ịma ihe a ga-ebipụta n’akwụkwọ anyị. Ọ na-enyekwara ha aka ikpebi ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ anyị dị iche iche. O nwere ndị Òtù Na-achị Isi na-eziga ka ha gaa leta alaka ụlọ ọrụ dị iche iche. Ha bịa n’alaka ụlọ ọrụ ọ bụla, ha agwa Kọmitii Alaka ihe ndị ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ ha nke ọma. (Ilu 11:14) N’alaka ụlọ ọrụ ọ bụla onye na-anọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị bịara, a na-eme ndokwa ka ọ gwa ụmụnna okwu pụrụ iche ga-agba ha ume.

A na-anọ na ya ahazi otú ihe ga-esi na-aga n’ọgbakọ. N’alaka ụlọ ọrụ, o nwere ndị e nyere ọrụ ka ha na-ehiwe ọgbakọ ọhụrụ. Ọ bụ ụmụnna ndị a na-ahụ maka ndị ọsụ ụzọ, ndị ozi ala ọzọ na ndị nlekọta sekit e nwere n’ebe niile alaka ụlọ ọrụ ahụ na-elekọta. Ha na-agwa ọgbakọ mgbe ha ga-aga mgbakọ sekit na mgbakọ ukwu. O nwere ụmụnna ndị na-ahụ maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, nwee ndị na-ahụ maka ibugara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ. Ọrụ niile a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ na-enye aka eme ka ọrụ ikwusa ozi ọma na-aga n’usoro.​—⁠1 Ndị Kọrịnt 14:​33, 40.

  • Olee otú Kọmitii Alaka si enyere Òtù Na-achị Isi aka?

  • Olee ọrụ ndị a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ?