Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 24

Olee Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Na-arụ Ọrụ Ikwusa Ozi Ọma n’Ụwa Niile?

Olee Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Na-arụ Ọrụ Ikwusa Ozi Ọma n’Ụwa Niile?

Nipọl

Togo

Briten

Kwa afọ, anyị na-ebipụta nde kwuru nde akwụkwọ na Baịbụl, na-ekesara ha ndị mmadụ. Anyị na-ewepụtakwa ihe ndị dị ka vidio. Ma, o nweghị nke n’ime ha anyị na-ere ere. Anyị na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na alaka ụlọ ọrụ n’obodo dị iche iche, na-arụzikwa ihe ọ bụla mebiri na ha. Anyị na-elekọtakwa ndị na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ na ndị ozi ala ọzọ. E nweekwa ọdachi ná mba ọ bụla, anyị na-agbatara ụmụnna anyị ndị bi ebe ahụ ọsọ enyemaka. Ma, olee otú anyị si enweta ego anyị ji eme ihe a niile?

Anyị anaghị ana ụtụ ma ọ bụ otu ụzọ n’ụzọ iri. Ọ bụ eziokwu na ọrụ ikwusa ozi ọma anyị na-arụ na-efu anyị ezigbo ego, anyị anaghị eke ụtụ ma ọ bụ na-ebugharị efere. Anyị anaghịkwa arịọ ego. Mgbe anyị malitere ibi magazin anyị a na-akpọ Ụlọ Nche, anyị kwuru ná mbipụta ya nke abụọ na obi siri anyị ike na Jehova ga na-akwado anyị. Anyị kwukwara na anyị agaghị arịọ ndị mmadụ ego. Ruokwa taa, o nwebeghị onye anyị rịọrọ arịrịọ.​—⁠Matiu 10:⁠8.

E ji onyinye si ndị mmadụ n’obi akwado ọrụ anyị. Ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ, ha na-enyekwa anyị onyinye. Anyịnwakwa na-eji obi ụtọ ewepụta oge na ike anyị arụ ọrụ a. Anyị na-enyekwa onyinye iji kwadoo ya. (1 Ihe E Mere 29:⁠9) N’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa n’ala mgbakọ anyị, e nwere igbe ndị ọ ga-abụ onye chọọ, ya agaa tinye ego ọ chọrọ inye n’onyinye. Mmadụ nwekwara ike isi n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig zite onyinye ya. Ego a na-enweta n’igbe ndị ahụ na-abụkarị ego ndị dara ogbenye ji obi ha niile nye. Ha na-eme ihe ahụ otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye mere n’oge Jizọs. N’agbanyeghị na ego o tinyere n’igbe onyinye bụ mkpụrụ ego abụọ ga-azụtali ihe dị ntakịrị, Jizọs jara ya mma. (Luk 21:​1-4) N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị na-ewepụta ihe ọ ga-enye n’onyinye. Ma, ọ na-abụ “dị ka o kpebiri n’obi ya.”​—⁠1 Ndị Kọrịnt 16:2; 2 Ndị Kọrịnt 9:⁠7.

Obi siri anyị ike na Jehova ga-eme ka ndị chọrọ iji ‘ihe ha ndị dị oké ọnụ ahịa sọpụrụ ya’ na-enye onyinye maka ọrụ ozi ọma a anyị na-arụ. Anyị ga-arụgide ya ruo mgbe Chineke ga-asị na o zuola.​—⁠Ilu 3:⁠9.

  • Gịnị mere ọgbakọ Ndịàmà Jehova ji dị iche na chọọchị ndị e nwere taa?

  • Olee ihe anyị ji onyinye ndị mmadụ nyere eme?