Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 27

Olee Uru Ọ́bá Akwụkwọ Dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Baara Anyị?

Olee Uru Ọ́bá Akwụkwọ Dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Baara Anyị?

Izrel

Chek Ripọblik

Benin

Keman Aịlands

Ò nwere ihe ụfọdụ ị ga-achọ ịmatakwu na Baịbụl? Ò nwere amaokwu Baịbụl ị na-amachaghị otú ị ga-esi akọwa ya? È nwere onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl ị ga-achọ ịmatakwu ihe gbasara ya? Ò nwere ebe a kpọrọ aha na Baịbụl ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kwuru na Baịbụl ị chọrọ ịmakwu gbasara ya? Ò nwere ihe na-enye gị nsogbu n’obi ị ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka ịma ihe ị ga-eme? Ọ bụrụ na e nwere, gaa n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Akwụkwọ ndị e ji eme nchọnchọ na-adị na ya. O nwere ike, i nweghị akwụkwọ niile Ndịàmà Jehova bipụtara n’asụsụ Igbo. Ma, ị gaa n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị ga-ahụ akwụkwọ anyị ndị e bipụtara n’oge na-adịchabeghị anya. I nwekwara ike ịhụ Baịbụl ndị ọzọ na-abụghị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, hụkwa akwụkwọ ọkọwa okwu na akwụkwọ ndị ọzọ e ji eme nchọnchọ. I nwere ike iji ha mee nchọnchọ tupu a malite ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ mgbe ọmụmụ ihe gbasara. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere kọmputa, e nwere ike itinye Watchtower Library nke Igbo n’ime ya. Ọtụtụ akwụkwọ anyị dị na Watchtower Library. Otú e si eji ya achọ ihe anaghị ara ahụ́. I nwere ike denye isiokwu, mkpụrụ okwu ma ọ bụkwanụ amaokwu Baịbụl ka ọ chọtara gị ebe niile ọ gbara n’akwụkwọ anyị.

Ọ na-abara ndị na-eme ihe omume n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ uru. Ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-abara gị uru mgbe ị na-akwado ihe omume gị. Ọ bụ onye nlekọta ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ na-ahụ maka ọ́bá akwụkwọ na-adị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ya ka ọ dị n’aka ịhụ na e tinyere akwụkwọ ọhụrụ ọ bụla n’ebe ahụ. Ọ na-ahụkwa na e dewere ha n’usoro n’usoro. O nwere ike igosi gị otú ị ga-esi achọta ihe ị chọrọ ịchọ ma ọ bụkwanụ onye gị na ya na-amụ Baịbụl egosi gị ya. Ma, o nweghị onye kwesịrị iwere akwụkwọ ọ bụla dị ebe ahụ laa. Onye ọ bụla ji akwụkwọ dị ebe ahụ na-achọ ihe kwesịrị ijizi ya ejizi, o kwesịghịkwa ịka ya ihe.

Baịbụl kwuru na onye chọrọ inwe “ihe ọmụma Chineke” kwesịrị ịchọ ya “dị ka akụ̀ zoro ezo.” (Ilu 2:​1-5) Ị ga-ejili ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze chọta ihe ọmụma Chineke.

  • Olee ihe ndị na-adị n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?

  • Ònye ga-enyere gị aka ịma otú e si eji akwụkwọ ndị dị na ya achọ ihe?