Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 28

Gịnị Ka Ị Ga-ahụ ma Ị Gaa Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet?

Gịnị Ka Ị Ga-ahụ ma Ị Gaa Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet?

Frans

Pọland

Rọshịa

Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.” (Matiu 5:16) Ọ bụ ihe a Jizọs kwuru mere anyị ji eji ihe ụfọdụ nkà na ụzụ na-ewepụta na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Otu n’ime ha bụ Ịntanet. Anyị nwere ebe anyị na-edewe ihe na ya. Adres ya bụ jw.org/ig. Ebe a bụ ebe ị ga-aga n’Ịntanet mata nke bụ́ eziokwu banyere ihe anyị kweere na ọrụ anyị na-arụ. Olee ihe ị ga-ahụ ma ị gaa ebe ahụ?

Ị ga-ahụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị na otú e si jiri Baịbụl zaa ha. O nwere ọtụtụ ajụjụ ndị dị mkpa ụmụ mmadụ na-ajụ taa. Ị gaa n’ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet, ị ga-ahụ ebe e ji Baịbụl zaa ụfọdụ n’ime ha. A zara isii n’ime ha na traktị bụ́ Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị? na Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ? N’Ịntanet, anyị nwere traktị ndị a n’ihe karịrị narị asụsụ isii. Ị ga-ahụkwa Baibụl Nsọ​—⁠Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri atọ. E nwekwara akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baibụl Na-akụziri Anyị?, nweekwa Ụlọ Nche na Teta! ndị ọhụrụ n’ọtụtụ asụsụ. I nwere ike ịgụ ọtụtụ n’ime ha n’Ịntanet ma ọ bụkwanụ gị egere ha egere. Ị chọọkwa, i nwere ike tinye ha n’ihe dị ka ekwentị. E nweekwa onye ị ma ga-achọ ịgụ nke ọ bụla n’ime ha, i nwedịrị ike isi ebe ahụ bipụtara ya nke e dere n’asụsụ ọ na-asụ. N’Ịntanet, ị ga-ahụ ọtụtụ akwụkwọ anyị n’asụsụ ndị ogbi. I nwekwara ike isi ebe ahụ were ihe ndị a na-egere egere, ndị dị ka ihe nkiri na abụ ndị ga na-eme gị obi ụtọ.

Ị ga-ahụ ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara anyị. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ ebe a kọrọ gbasara otú ọrụ anyị si na-aga n’ụwa dum na otú anyị si agbatara ndị nwere ọdachi ọsọ enyemaka. Ị ga-ahụkwa ihe ndị ọzọ a kọrọ gbasara anyị. E nwekwara vidio ndị ga-egosi gị ihe a na-ekwu. Ihe ọzọ ị ga-ahụ bụ ebe ndị a ga-enwe mgbakọ dị iche iche na otú i nwere ike isi kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche.

Anyị na-eji ihe ndị a eme ka ìhè Okwu Chineke na-enwu n’ebe ndị dị anya n’ụwa. Ndị mmadụ n’ebe niile na-anụ ozi ọma Alaeze Chineke, ma ndị bi n’Antaktika, bụ́ ebe oyi kacha atụ n’ụwa. Ekpere anyị bụ ka ‘okwu Jehova na-aga n’ihu ọsọ ọsọ’ ruo n’ụwa niile. Anyị chọkwara ka o wetara Chineke otuto.​—⁠2 Ndị Tesalonaịka 3:⁠1.

  • Olee otú anyị si eji ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet enyere ndị mmadụ aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi?

  • Olee ihe ị ga-achọ ịhụ n’ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet?