Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 1

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

1. Gịnị bụ ozi ọma ahụ si n’aka Chineke?

Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ biri n’ụwa a ma nwee obi ụtọ. Ọ bụ maka na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya mere o ji kee ụwa na ihe niile dị n’ime ya. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ewepụ ihe niile mere ndụ anaghịzi atọ anyị ụtọ. Mgbe ahụ, ụmụ mmadụ agaghịzi na-ata ahụhụ.​—Gụọ Jeremaya 29:11.

Ọchịchị ụmụ mmadụ enwebeghị ike ịkwụsị ime ihe ike, ọrịa, ma ọ bụ ọnwụ. Ma, e nwere ozi ọma dịnụ. N’oge na-adịghị anya, ọchịchị Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ. Ndị ọ ga-achị agaghị na-arịa ọrịa, ha na ibe ha ga-adịkwa n’udo.​—Gụọ Aịzaya 25:8; 33:24; Daniel 2:44.

2. Gịnị mere ozi ọma a ji dị ezigbo mkpa ugbu a?

Ọ bụ mgbe Chineke wepụrụ ndị ọjọọ n’ụwa a ka ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata ga-akwụsị. (Zefanaya 2:3) Olee mgbe ọ ga-eme ya? Baịbụl buru amụma na ụmụ mmadụ ga-enwe nsogbu ndị ha na-enwe ugbu a. Ihe ndị a na-emenụ na-egosi na oge Chineke ga-ewepụ ihe ọjọọ n’ụwa a eruwela.​—Gụọ 2 Timoti 3:1-5.

3. Olee ihe anyị kwesịrị ime?

Anyị kwesịrị ịna-amụ Baịbụl, ka ọ kụziere anyị gbasara Chineke. Baịbụl dị ka akwụkwọ ozi nna degaara nwa ya ọ hụrụ n’anya. Ọ na-agwa anyị ihe anyị ga-eme ka ndụ na-atọ anyị ụtọ ugbu a nakwa ihe anyị ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mmadụ niile ka obi ga-adị ụtọ ma ha hụ na ị na-amụ Baịbụl. Ma, ekwela ka ha mee ka ị ghara ịmụta ihe ndị ga-eme ka i nweta ndụ ebighị ebi a Chineke kwere anyị ná nkwa.​—Gụọ Ilu 29:25; Mkpughe 14:6, 7.