Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 3

Rehab Kweere na Jehova

Rehab Kweere na Jehova

Ka anyị were ya na anyị nọ na Jeriko. Jeriko bụ obodo dị na Kenan. Ndị obodo ahụ anaghị efe Jehova. E nwere otu nwaanyị obodo ahụ aha ya bụ Rehab.

Mgbe Rehab bụ nwatakịrị, a kọọrọ ya otú Mozis si duru ndị Izrel si Ijipt pụọ. Mgbe ha ruru otu nnukwu osimiri, o mere ka o kewaa. Aha osimiri ahụ bụ Oké Osimiri Uhie. A kọkwaara ya otú Jehova si nyere ndị Izrel aka imeri ndị iro ha. Ma ugbu a, ọ nụrụ na ndị Izrel na-abịa ịlụso Jeriko agha.

Rehab zoro ndị Izrel n’ihi na o kweere na Jehova

Otu ụbọchị, ndị Izrel abụọ batara na Jeriko ka ha mata otú ọ dị. Ha bịara n’ụlọ Rehab, ya anabata ha. Mgbe chi jiri, eze obodo ahụ nụrụ na e nwere ndị Izrel bịara ịmara otú obodo ha dị. Ọ nụkwara na ha nọ n’ụlọ Rehab. Eze wee gwa ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa kpụta ha. Rehab gwara ndị Izrel ahụ ka ha gaa zoo n’elu ụlọ ya. Ọ gwaziri ndị ahụ bịara ịkpụrụ ha, sị: ‘Ndị unu na-achọ bịara n’ụlọ m, ma ha alawala. Unu ga-ejide ha ma unu chụrụ ha gawa ugbu a.’ Ị̀ ma ihe mere Rehab ji zoo ụmụ nwoke abụọ ahụ?— Ọ bụ maka na o kweere na Jehova. Ọ makwa na ọ ga-eme ka ndị Izrel merie ndị Kenan, nara ha ala ha.

Tupu ndị Izrel ahụ esi n’ụlọ Rehab pụọ, ha kwere ya nkwa na ha agaghị egbu ya na ndị ezinụlọ ha mgbe ha ga-egbu ndị Jeriko. Ị̀ ma ihe ha gwara ya ka o mee?— Ha sịrị ya: ‘Were eriri a na-acha ọbara ọbara kee na windo gị. Ọ bụrụ na ị hapụ ya ebe ahụ, o nweghị ihe ga-eme onye ọ bụla nọ n’ime ụlọ gị.’ Rehab mere ihe ahụ ha gwara ya. Ị̀ ma ihe mechara mee?—

Jehova chebere Rehab na ndị ezinụlọ ha

Ka ụbọchị ole na ole gara, ndị agha Izrel bịara Jeriko gaa ya gburugburu otu ugboro n’emeghị mkpọtụ. N’ụbọchị nke abụọ, ha gakwara ya gburugburu otu ugboro. Ha mekwara otú ahụ n’ụbọchị nke atọ, nke anọ, nke ise nakwa n’ụbọchị nke isii. Ma n’ụbọchị nke asaa, ha gara ya gburugburu ugboro asaa. Mgbe ha gachara nke asaa, ha niile tiri nnukwu mkpu. Jehova meziri ka mgbidi obodo ahụ daa. Ma, ụlọ ahụ e kere windo ya eriri na-acha ọbara ọbara adaghị. Ị̀ hụrụ ya ebe a?— E nweghị ihe mere Rehab na ndị ezinụlọ ha.

Gịnị ka ị mụtara n’aka Rehab?— Rehab kweere na Jehova. Ihe mere o ji kwere na ya bụ maka ọtụtụ ihe ọ nụrụ na o mere. Gịnwa na-amụkwa gbasara ọtụtụ ihe Jehova mere. Ì kweere na Jehova otú ahụ Rehab kweere na ya?— Anyị ma na i kweere.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ