Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 4

O Mere Papa Ya Obi Ụtọ, Meekwa Jehova Obi Ụtọ

O Mere Papa Ya Obi Ụtọ, Meekwa Jehova Obi Ụtọ

Olee nkwa Jefta na-ekwe Jehova?

O wutere Jefta na nwa ya, ma nwa ya mere ihe papa ya kwere Jehova ná nkwa

Ị̀ hụrụ nwatakịrị nwaanyị a e sere ebe a?— Aha papa ya bụ Jefta. Baịbụl agwaghị anyị aha nwatakịrị a, ma anyị ma na o mere papa ya obi ụtọ. O mekwara Jehova obi ụtọ. Ka anyị mụọ banyere ya na papa ya.

Jefta bụ ezigbo mmadụ, ọ kụzikwaara nwa ya banyere Jehova. Jefta siri ike, na-edukwa ndị mmadụ aga agha. N’ihi ya, ndị Izrel rịọrọ ya ka o duru ha gaa lụso ndị iro ha agha.

Jefta rịọrọ Chineke ka o nyere ya aka ka ha merie n’agha ahụ. O kwere Chineke nkwa na ọ bụrụ na ya emerie na-alọta n’ụlọ ya, na ya ga-enye Chineke onye ọ bụla bu ụzọ pụta ikele ya. Onye ahụ ga-ebi n’ụlọikwuu Chineke, na-arụ ọrụ ebe ahụ ruokwa mgbe onye ahụ ga-anwụ. Ụlọikwuu bụ ebe ndị mmadụ na-aga efe Chineke n’oge ochie. Jefta mechara merie n’agha ahụ. Ị̀ ma onye mbụ si n’ụlọ ya pụta ikele ya mgbe ọ lọtara?—

Ọ bụ nwa ya nwaanyị. Ọ bụ naanị ya ka ọ mụrụ. Ugbu a, ọ ga-ahapụ ụlọ ha. Ihe a wutere Jefta. Ma, chetakwa na o kwere Chineke nkwa. Ozugbo ahụ, nwa ya nwaanyị gwara ya, sị, ‘Papa, i kwere Jehova nkwa, i kwesịrị ime ihe i kwere ná nkwa.’

Ndị enyi nwa Jefta na-abịa eleta ya n’afọ ọ bụla

Obi adịghịkwa nwa Jefta mma. Maka gịnị? Maka na ọ gaa ịrụ ọrụ n’ụlọikwuu, ọ gaghị alụ di, ọ gaghịkwa amụ nwa. Ma, ọ chọrọ ime ihe papa ya kwere ná nkwa. Ọ chọkwara ime Jehova obi ụtọ. Ime ma papa ya ma Jehova obi ụtọ dị ya mkpa karịa ịlụ di na ịmụ nwa. Ọ hapụrụ ụlọ ha, gaa biri n’ụlọikwuu ruo mgbe ọ nwụrụ.

Ì chere na ihe a o mere mere ka obi dị ma papa ya ma Jehova ụtọ?— Ee, o mere ha obi ụtọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịna-eme ka nwa Jefta, ị ga-erubere papa gị na mama gị isi, hụkwa Jehova n’anya. Ị na-eme otú ahụ, ị ga-eme papa gị na mama gị obi ụtọ, obi ga-adịkwa Jehova ụtọ.