Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 6

Ụjọ Atụghị Devid

Ụjọ Atụghị Devid

Ụjọ tụwa gị, gịnị ka ị na-eme?— Ọ ga-abụ na ị na-agbaga n’ebe mama gị ma ọ bụ papa gị nọ. Ma, e nwere onye ọzọ nwere ike inyere gị aka ma ụjọ tụwa gị. Ọ ka onye ọ bụla ike. Ị̀ ma onye ọ bụ?— Ee, ọ bụ Jehova Chineke. Ka anyị kwuo banyere otu nwa okorobịa a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. Aha ya bụ Devid. Ọ ma na Jehova na-enyere ya aka mgbe niile. N’ihi ya, ụjọ anaghị atụ ya.

Papa Devid na mama ya malitere kụziwere ya banyere Jehova mgbe ọ ka bụ nwatakịrị. Ọ bụ ya mere Devid anaghị atụ ụjọ ihe ọ bụla chọrọ imenye ya ụjọ. Ọ ma na Jehova bụ enyi ya nakwa na ọ ga-enyere ya aka mgbe niile. O nwere otu ụbọchị nnukwu ọdụm bịara n’ebe Devid na-azụ atụrụ buru atụrụ ya. Ị̀ ma ihe Devid mere? Ọ chụrụ ọdụm ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya. O nwekwara ụbọchị ọzọ anụ ọhịa a na-akpọ bea bịara buru atụrụ Devid. Devid jidere anụ ọhịa ahụ, gbuokwa ya. Ònye ka i chere na ọ bụ ya nyeere Devid aka?— Ọ bụ Jehova.

E nwekwara mgbe ọzọ ụjọ na-atụghị Devid. Ọ bụ mgbe ndị Filistia bịara ịlụso ụmụ Izrel agha. E nwere otu onye agha ndị Filistia toro ezigbo ogologo. Aha ya bụ Golayat. Nwoke ahụ nọ na-akparị ndị agha Izrel, na-akparịkwa Jehova. Ọ gwara ndị agha Izrel na ọ bụrụ na ụjọ anaghị atụ ha, ha bịa ka ha na ya lụọ agha. Ma, o nweghị onye Izrel ụjọ kwere pụta. Mgbe Devid nụrụ ihe nwoke ahụ nọ na-ekwu, ọ gwara ya, sị: ‘Mụ na gị ga-alụ ọgụ. Jehova ga-enyere m aka. M ga-emerikwa gị.’ Ì chere na ụjọ tụrụ Devid?— Ee e. Ị̀ chọrọ ịma ma Devid ò mechara merie Golayat?

Devid chịịrị katapọọtụ ya, họrọkwa okwute ise na-akwọ mụrụmụrụ gakwuruwe Golayat. Mgbe Golayat hụrụ na Devid bụ obere nwa, ya achịwa ya ọchị. Devid wee gwa ya, sị: ‘I ji mma agha na-abịa ka anyị lụọ ọgụ, ma m ji aha Jehova na-abịa.’ Devid tinyere okwute na katapọọtụ ya, gbara ọsọ gawa ebe Golayat nọ. Mgbe ọ gbara katapọọtụ ahụ, nkume ahụ tụrụ Golayat n’ihu, ya adaa ozugbo, nwụọ. Ụjọ tụrụ ndị agha Filistia, ha agbawa ọsọ. N’agbanyeghị na Devid bụ nwatakịrị, olee otú o si nwee ike igbu Golayat?— Ọ bụ Jehova nyeere ya aka. Jehova kakwa onye Filistia ahụ ike.

Devid atụghị ụjọ maka na ọ ma na Jehova ga-enyere ya aka

Olee ihe ị mụtara n’ihe a Devid mere?— Anyị mụtara na e nweghị onye ka Jehova ike. Jehova bụkwa enyi gị. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ụjọ tụwara gị, cheta na Jehova ga-emeli ka ị kwụsị ịtụ ụjọ.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ