Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 9

Jeremaya Akwụsịghị Ịgwa Ndị Mmadụ Ihe Jehova Kwuru

Jeremaya Akwụsịghị Ịgwa Ndị Mmadụ Ihe Jehova Kwuru

Gịnị mere ihe Jeremaya na-ekwu ji ewe ndị a iwe?

Jehova nyeere Jeremaya aka, ya apụta n’olulu a

Oge ụfọdụ, ndị mmadụ na-achị anyị ọchị ma ọ bụ wee iwe ma anyị chọọ izi ha ozi ọma. Ụdị ihe a nwere ike ime ka ike ịga ozi ọma gwụ anyị. Ò nweela mgbe mmadụ chịrị gị ọchị, gị asị na ị chọghịzi ịga ozi ọma?— Baịbụl kọrọ gbasara otu nwa okorobịa hụrụ Jehova n’anya. Aha ya bụ Jeremaya. Ọ fọrọ obere ka ọ kwụsị ịgwa ndị mmadụ banyere Jehova. Ka anyị mụọ gbasara Jeremaya.

Mgbe Jeremaya bụ nwa okorobịa, Jehova gwara ya ka ọ gwa ndị Izrel ka ha kwụsị ime ihe ọjọọ. Ịgwa ndị mmadụ ihe a siiri Jeremaya ike, ụjọ tụkwara ya. Ọ bụ ya mere o ji gwa Jehova, sị: ‘Amaghị m ihe m ga-agwa ha. Abụ m nwatakịrị.’ Ma, Jehova sịrị ya: ‘Atụla ụjọ. M ga-enyere gị aka.’

Ihe a Jehova gwara Jeremaya mere ka ọ malite ịgwa ndị mmadụ na Jehova ga-ata ha ahụhụ ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị ime ihe ọjọọ. Ì chere na ha mere ihe Jeremaya gwara ha?— Mba. Ụfọdụ nọ na-achị ya ọchị, ebe iwe were ndị ọzọ. O nwedịrị ndị nke chọrọ igbu ya. Olee ihe i chere Jeremaya mere mgbe ha nọ na-eme ihe a niile?— Ụjọ bịara ya, ya ekwuo na ya ga-akwụsị ịgwa ndị mmadụ ihe Jehova kwuru. Ma, ọ̀ kwụsịrị?— Mba. Ọ kwụsịghị ịgwa ha ihe Jehova kwuru n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya. Jehova ekweghịkwa ka ihe ọ bụla mee ya maka na ọ kwụsịghị ịgwa ha ihe o kwuru.

Dị ka ihe atụ, o nwere ụbọchị ndị iro Jeremaya tụbara ya n’olulu apịtị. E nweghị nri ọ ga-eri ma ọ bụ mmiri ọ ga-aṅụ. Ha chọrọ ka ọ nọrọ ebe ahụ nwụọ. Ma, Jehova nyeere ya aka, ya esi ebe ahụ pụta.

Gịnị ka ị mụtara n’aka Jeremaya?— Ọ bụ eziokwu na e nwere mgbe ụjọ tụrụ ya, ma ọ kwụsịghị ịgwa ndị mmadụ ihe Jehova kwuru. I ziwe ndị mmadụ ozi ọma, ha nwere ike chịwa gị ọchị ma ọ bụkwanụ wewe iwe. Ha mee otú a, ihere izi ndị mmadụ ozi ọma nwere ike mewe gị ma ọ bụkwanụ gị atụwa ụjọ. Ekwekwala ka ụdị ihe a mee ka ị kwụsị izi ndị mmadụ ozi ọma. Jehova ga-enyere gị aka otú ahụ o nyeere Jeremaya.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ