Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 21

Chineke Ga-eji Alaeze Ya Bibie Ndị Iro Ya

Chineke Ga-eji Alaeze Ya Bibie Ndị Iro Ya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Ihe ndị ga-eme tupu a lụọ agha Amagedọn

1, 2. (a) Olee ihe ndị na-egosi na Eze anyị na-achị kemgbe afọ 1914? (b) Olee ihe ndị anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?

 ANYỊ elebala anya n’ihe Chineke jirila Alaeze ya mee n’etiti ndị iro ya. Ihe ndị a anyị lebara anya emeela ka okwukwe anyị sikwuo ike. (Ọma 110:2) Eze anyị enweela ọtụtụ ndị ji obi ha wepụta onwe ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. O nyerela anyị aka ka anyị na-akụzi eziokwu dị na Baịbụl. O nyekwarala anyị aka ịna-akpa àgwà ọma. N’agbanyeghịkwa mbọ niile ndị iro Alaeze Chineke gbarala ka anyị ghara ịdị n’otu, anyị dị n’otu n’ụwa niile. Ihe ndị a na ọtụtụ ihe ndị ọzọ anyị lebarala anya Chineke ji Alaeze ya mee na-egosi n’eziokwu na kemgbe afọ 1914, Eze anyị na-achị n’etiti ndị iro Alaeze Chineke.

2 Ma, e nwere ihe ndị dị ịtụnanya Chineke ga-eji Alaeze ya mee n’oge na-adịghị anya. Alaeze ya ‘ga-abịa gwepịa ndị iro ya, ma mee ka ha ghara ịdịkwa.’ (Mat. 6:10; Dan. 2:44) Ma tupu oge ahụ eruo, e nwere ihe ndị ọzọ dị ịtụnanya ga-emenụ. Gịnị ka ha bụ? Ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime amụma ndị ahụ ma mata ihe ndị ahụ ga-eme n’oge na-adịghị anya.

Ihe Ndị Ga-eme Tupu “Mbibi Mberede” Abịakwasị Ha

3. Olee ihe mbụ anyị na-atụ anya ya ga-emenụ?

3 Ịkpọsa udo. Mgbe Pọl onyeozi degaara ndị Tesalonaịka akwụkwọ, ọ gwara ha ihe mbụ anyị na-atụ anya ya ga-eme n’ụwa tupu ụbọchị Jehova eruo. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:2, 3.) N’akwụkwọ ozi a, Pọl kwuru banyere “ụbọchị Jehova.” Ụbọchị Jehova a ga-amalite mgbe ndị ọchịchị ga-ebido ibibi “Babịlọn Ukwu ahụ.” (Mkpu. 17:5) Ma, tupu ụbọchị Jehova amalite, mba niile ga na-asị, “Udo na obi iru ala!” Ha nwere ike ikwu ihe a otu ugboro ma ọ bụkwanụ ya abụrụ ihe ha ga na-ekwu mgbe ọ bụla. Ndị isi chọọchị dị iche iche hà ga-eso na-ekwu okwu udo a? Ebe ọ bụ na ha bụ nke ụwa, ha nwere ike iso mba niile na-asị, “Udo dị!” (Jere. 6:14; 23:16, 17; Mkpu. 17:1, 2) Udo na obi iru ala a ha ga na-ekwu ga-egosi na ụbọchị Jehova na-aga ịmalite. Ndị iro Alaeze Chineke “agaghịkwa agbanahụ ya ma ọlị.”

4. Otú a anyị ghọtarala ihe Pọl kwuru gbasara okwu udo na obi iru ala mba niile ga-ekwu, ò nwere uru ọ baara anyị?

4 Otú a anyị ghọtarala otú amụma a ga-esi emezu, ò nwere uru ọ baara anyị? Pọl kwuru, sị: ‘Unu anọghị n’ọchịchịrị, nke mere ụbọchị ahụ ga-eji bịakwasị unu na mberede dị ka chi ọbụbọ si abịakwasị ndị ohi.’ (1 Tesa. 5:3, 4) Ọtụtụ ndị taa amaghị ihe ihe ndị na-eme ugbu a na-egosi, ma, anyị ma. Olee otú mba niile ga-esi kwuo okwu udo na obi iru ala a Baịbụl sị na ha ga-ekwu? Anyị amaghị. N’ihi ya, “ka anyị mụrụ anya ma nwee uche ziri ezi.”—1 Tesa. 5:6; Zef. 3:8.

Otú Oké Mkpagbu Ukwu ahụ Ga-esi Malite

5. Olee otú “oké mkpagbu” ahụ ga-esi malite?

5 A ga-ebibi okpukpe ụgha. Ì chetara ihe ahụ Pọl gwara ndị Tesalonaịka? Ọ gwara ha, sị: “Mgbe ọ bụla ha na-asị: ‘Udo na obi iru ala!’ mgbe ahụ ka mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya.” Otú ahụ ọ na-abụ àmụ̀mà gbuo, égbè eluigwe agbaa ozugbo, otú ahụkwa ka “mbibi mberede” ga-abịa ozugbo mba niile malitere ịsị, “Udo na obi iru ala!” Gịnị ka a ga-ebibi? Ihe mbụ a ga-ebibi bụ “Babịlọn Ukwu ahụ,” ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. A na-akpọkwa Babịlọn Ukwu a “nwaanyị akwụna.” (Mkpu. 17:5, 6, 15) Mbibi a a ga-ebibi Krisendọm na okpukpe ụgha niile ga-abụ mmalite nke “oké mkpagbu.” (Mat. 24:21; 2 Tesa. 2:8) Ọ ga-eju ọtụtụ ndị anya ma ihe a mee. Maka gịnị? Maka na tupu e bibie nwaanyị akwụna a, ọ ka ga na-eme ka “eze nwaanyị,” na-asịkwa na ‘ọ dịghị mgbe ya ga-ahụ iru uju.’ Ma, ọ gaghị ete aka ya ejiri anya ya hụ ọnwụ ya. A ga-ebibi ya n’otu ntabi anya, nke na e nwere ike ịsị na e bibiri ya “n’otu ụbọchị.”—Mkpu. 18:7, 8.

6. Olee otú a ga-esi bibie “Babịlọn Ukwu ahụ”?

6 Olee otú a ga-esi bibie “Babịlọn Ukwu ahụ”? A ga-eji “anụ ọhịa” nwere “mpi iri” bibie ya. Akwụkwọ Mkpughe kwuru ihe gosiri na anụ ọhịa ahụ bụ Òtù Mba Ụwa. Mpi iri ahụ nọchiri anya ọchịchị niile e nwere ugbu a nke na-akwado “anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie.” (Mkpu. 17:3, 5, 11, 12) Hà ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ kpamkpam? Ee. Mba niile ndị so n’Òtù Mba Ụwa ga-ebukọrọ akụnụba nwaanyị akwụna a, bibie ya, ma “kpọọ ya ọkụ kpamkpam.”—Gụọ Mkpughe 17:16. a

7. Olee otú ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:21, 22 si mezuo n’oge ndịozi? Oleekwa otú ọ ga-esi emezu n’oge anyị a?

7 A ga-eme ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi. Eze anyị bụ́ Jizọs kwuru ihe ga-eme n’oge oké mkpagbu ahụ. O kwuru, sị: “Ma n’ihi ndị a họọrọ, a ga-eme ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi.” (Gụọ Matiu 24:21, 22.) Oge mbụ ihe a Jizọs kwuru mezuru bụ n’afọ 66. N’oge ahụ, Jehova mere ka agha ndị agha Rom na-alụso Jeruselem “dị mkpirikpi.” (Mak 13:20) Nke a mere ka a zọpụta Ndị Kraịst bi na Judia na Jeruselem. Oleezi otú a ga-esi emezu amụma a n’ụwa niile n’oge oké mkpagbu? Jehova ga-esi n’aka Eze anyị mee ka oge mbibi ahụ Òtù Mba Ụwa ga-ebibi okpukpe ụgha “dị mkpirikpi,” ka a ghara ibibi ezigbo Ndị Kraịst mgbe a na-ebibi okpukpe ụgha. Ọ bụ otú ahụ ka a ga-esi zọpụta ezigbo Ndị Kraịst, ma laa okpukpe ụgha n’iyi. (Ọma 96:5) Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe ndị ọzọ ga-emenụ mgbe e bibichara okpukpe ụgha n’oké mkpagbu ahụ.

Ihe Ndị Ga-eme Tupu Agha Amagedọn Amalite

8, 9. Olee ihe ndị dị egwu ga-eme n’ụwa Jizọs kwuru okwu ha? Oleekwa ihe ndị mmadụ ga-eme ma ha hụ ihe ndị ahụ?

8 Amụma Jizọs buru banyere oge ikpeazụ na-egosi na a ga-enwe ihe ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ ga-emenụ tupu agha Amagedọn amalite. Anyị ga-eleba anya n’abụọ ndị mbụ n’ime ha. E kwuru banyere ha n’akwụkwọ Matiu, Mak, na Luk.—Gụọ Matiu 24:29-31; Mak 13:23-27; Luk 21:25-28.

9 Ihe ndị dị egwu ga-eme n’eluigwe. Jizọs kwuru, sị: “Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghịkwa enye ìhè ya, kpakpando ga-esikwa n’eluigwe daa.” Ndị mmadụ weere ndị isi okpukpe taa ka ìhè ha ji ahụ ụzọ. Ma, e bibie okpukpe ụgha, o doro anya na ndị mmadụ agaghịzi na-abịakwute ndị isi okpukpe ka ha na-eduzi ha. Ma, e wezụga nke a, è nwere mgbe a ga-enwe ihe ndị dị egwu ga-eme n’eluigwe otú ahụ Jizọs kwuru? E nwekwara ike inwe. (Aịza. 13:9-11; Joel 2:1, 30, 31) Gịnị ka ndị mmadụ ga-eme mgbe ha hụrụ ka ihe a na-eme? Baịbụl kwuru na ha ga-anọ “ná nhụjuanya” n’ihi na ha ‘amaghị ihe ha ga-eme.’ (Luk 21:25; Zef. 1:17) N’eziokwu, ndị iro Alaeze Chineke, ma “ndị eze” ma “ndị ohu,” ‘ga-atụbọ n’ihi egwu nakwa n’ihi ihe ndị ha na-atụ anya ga-abịakwasị’ ụwa. Ha ga-achọkwa ebe ha ga-ezo onwe ha. Ma, o nweghị ebe ha ga-ezo ga-eme ka Eze anyị ghara ibibi ha.—Luk 21:26; 23:30; Mkpu. 6:15-17.

10. Olee ikpe Jizọs ga-ekpe? Gịnị ka ndị na-akwado Alaeze Chineke ga-eme? Gịnịkwa ka ndị iro ya ga-eme?

10 Ikpe ụwa ikpe. A ga-emezi ka ndị iro niile nke Alaeze Chineke hụ otu ihe ga-emenụ nke ga-agbawakwu ha obi. Jizọs kwuru, sị: “Ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii n’ike na ebube dị ukwuu.” (Mak 13:26) Ihe a ga-eme mgbe Jizọs bịara ikpe ikpe. N’amụma ahụ Jizọs buru banyere mgbe ikpeazụ, ọ kọwakwuru otú ọ ga-esi ekpe ikpe a. Ọ kọwara ihe a mgbe o ji ewu na atụrụ mee ihe atụ. (Gụọ Matiu 25:31-33, 46.) Ndị a ga-akpọ “atụrụ” bụ ndị ji obi ha niile na-akwado Alaeze Chineke. Ha ‘ga-eweli isi ha elu,’ n’ihi na ha ma na ‘nnapụta ha erula nso.’ (Luk 21:28) Ma, ndị a ga-akpọ “ewu” bụ ndị niile na-emegide Alaeze Chineke. Ha “ga-eti aka n’obi, kwaa ákwá arịrị,” n’ihi na ha ma na ha “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.”—Mat. 24:30; Mkpu. 1:7.

11. Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’obi ka anyị na-eleba anya n’ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu?

11 Jizọs kpechaa “mba niile” ikpe, a ka ga-enwe ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ga-emenụ tupu agha Amagedọn amalite. (Mat. 25:32) Anyị ga-eleba anya n’abụọ n’ime ha. Nke mbụ bụ gbasara ọgụ Gọg ga-alụso ndị Chineke. Nke abụọ abụrụ ịchịkọta ndị e tere mmanụ. Ka anyị na-eleba anya n’ihe abụọ a ga-emenụ, anyị kwesịrị iburu n’obi na o nweghị ebe Okwu Chineke kwuru oge nke ọ bụla n’ime ha ga-eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike mgbe otu nọ na-eme nke ọzọ ebido.

12. Olee ihe Setan ga-achọ ime ndị na-akwado Alaeze Chineke?

12 Ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Gọg nke Megọg ga-alụso ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa ọgụ, lụsokwa ndị enyi ha bụ́ atụrụ ọzọ ọgụ. (Gụọ Ezikiel 38:2, 11.) Kemgbe Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe, a chụpụkwa Setan, Setan nọ na-alụso ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa ọgụ. Ma, ọgụ nke ugbu a bụ nke ikpeazụ Setan ga-alụso ndị Chineke n’ụwa a. (Mkpu. 12:7-9, 17) Kemgbe a malitere ịchịkọta ndị e tere mmanụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge anyị a, Setan a gbaala mbọ ime ka ha na Chineke ghara ịdị ná mma. Ma mbọ niile ọ gbarala kụrụ afọ n’ala. (Mat. 13:30) Ma, e bibichaa okpukpe ụgha niile, ndị Chineke ga-eyi ndị ‘bi n’ebe na-enweghị mgbidi, ndị na-enweghịdị ihe ntụchi ụzọ na ibo ụzọ.’ Setan ga-eji ohere ahụ chọọ imemila ndị Chineke. Ọ ga-eme ka ndị agha ya obi tara mmiri gaa ịlụso ndị a na-akwado Alaeze Chineke ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ.

13. Gịnị ka Jehova ga-emere ndị ya?

13 Ezikiel kwuru ihe ga-eme n’oge ahụ. O buru amụma banyere Gọg, sị: ‘Ị ga-esi n’ala gị bịa, site n’ime ime ebe ugwu, gị na ọtụtụ ndị so gị. Ha niile na-agba ịnyịnya. Ha bụ ìgwè mmadụ, ee, ọtụtụ ndị agha. Ị ga-abịakwa ibuso ndị m agha, ka i kpuchie ala ha dị ka ígwé ojii.’ (Ezik. 38:15, 16) Olee ihe Jehova ga-eme n’ọgụ a Gọg ga-alụso ndị ya, nke yiri ka o nweghị onye ga-akwụsịli ya? Jehova kwuru ihe ọ ga-eme. Ọ sịrị: “Ọnụma m ga-adị ọkụ nke ukwuu.” O kwukwara, sị: “M ga-emekwa ka mma agha bịakwasị ya.” (Ezik. 38:18, 21; gụọ Zekaraya 2:8.) Jehova ga-alụchitere ndị ya nọ n’ụwa ọgụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka agha Amagedọn ga-ada.

14, 15. Gịnị ga-eme n’agbata oge Setan ga-amalite ịlụso ndị Jehova ọgụ na oge Jehova ga-alụchitere ndị ya ọgụ?

14 Tupu anyị ekwuwe banyere otú Jehova ga-esi lụchitere ndị ya ọgụ n’agha Amagedọn, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’otu ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ ga-eme n’ụwa. Ihe a ga-eme n’agbata oge ahụ Setan ga-alụso ndị Jehova ọgụ na mgbe ahụ Jehova ga-alụchitere ndị ya ọgụ n’agha Amagedọn. Cheta na anyị kwuru na paragraf nke iri na otu na ihe nke abụọ n’ime ihe ndị ahụ gbara ọkpụrụkpụ ga-emenụ bụ ịchịkọta ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa.

15 Ịchịkọta ndị e tere mmanụ. Ma Matiu ma Mak dechara ihe Jizọs kwuru gbasara “ndị a họọrọ.” Ndị a a họọrọ bụ ndị Kraịst e tere mmanụ. Ihe Jizọs kwuru gosiri na ịhọrọ ndị a e tere mmanụ ga-eso n’ihe ndị ga-emenụ tupu agha Amagedọn amalite. (A kọwara ya na paragraf nke 7.) Jizọs kwuru ihe ọ ga-eme mgbe ọ ga-aghọ Eze. Ọ sịrị: “Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi, ha ga-esikwa n’akụkụ anọ nke ụwa chịkọta ndị ọ họọrọ, site na nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ eluigwe.” (Mak 13:27; Mat. 24:31) Ole ndị ka Jizọs kwuru okwu ha ebe a na ya ga-achịkọta? Ihe ọ na-ekwu okwu ya abụghị akara ikpeazụ a ga-aka Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ nke ga-eme tupu oké mkpagbu amalite. (Mkpu. 7:1-3) Kama, ihe Jizọs na-ekwu bụ ihe ga-eme n’oge oké mkpagbu. N’ihi ya, o doro anya na obere oge Setan malitechara ịlụso ndị Chineke ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ, a ga-achịkọta ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa, ha agaa eluigwe.

16. Olee ihe ndị e tere mmanụ e si n’ọnwụ kpọlite ga-eme ma a lụwa agha Amagedọn?

16 Olee otú ịchịkọta ndị e tere mmanụ si gbasa agha Amagedọn? Oge a a ga-achịkọta ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa gosiri na ha niile ga-aga eluigwe tupu agha Amagedọn amalite. Mgbe otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ ha na Kraịst ga-eso achị gachara eluigwe, ha ga-anata ikike iso Jizọs jiri “mkpanaka ígwè” bibie ndị iro niile nke Alaeze Chineke. (Mkpu. 2:26, 27) Ha natachaa ikike a, ha na ndị mmụọ ozi ga-eso Kraịst, bụ́ Onye Agha na Eze anyị, lụso “ọtụtụ ndị agha” ọgụ. Ndị a ha ga-alụso ọgụ bụ ndị iro chọrọ iji ndị Jehova mere anụ oriri. (Ezik. 38:15) Ha bidohaala agha a, ọ bụ ya bụ na Amagedọn ebidola.—Mkpu. 16:16.

Otú Oké Mkpagbu ahụ Ga-esi Ebi

Ihe a bụ agha Amagedọn

17. Gịnị ga-eme ndị ahụ Jizọs kpọrọ “ewu” n’agha Amagedọn?

17 Ibibi ndị ajọ omume. Oké mkpagbu ahụ ga-ebi n’agha Amagedọn. N’oge ahụ, Jizọs ga-arụ ọrụ ọzọ Chineke nyere ya. Ya kpechaa “mba niile” ikpe, ya egbuo ndị niile ọ kpọrọ “ewu.” (Mat. 25:32, 33) Eze anyị a ga-eji ‘ogologo mma agha dị nkọ gbuo mba niile.’ Ndị niile a yiri ewu, ma “ndị eze” ma “ndị ohu,” “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.”—Mkpu. 19:15, 18; Mat. 25:46.

18. (a) Olee otú egwú ga-esi dagharịara ndị ahụ Jizọs kpọrọ “atụrụ”? (b) Olee ihe Jizọs ga-eme mgbe o merichara ndị niile na-emegide Alaeze Chineke?

18 Otú a ka egwú ga-esi dagharịa. Ndị iro nke ndị ahụ Jizọs kpọrọ “atụrụ,” ya bụ, “oké ìgwè mmadụ” agazighị enwe ike ibibi ndị a ha chere na ha bụ anụ oriri. Oké ìgwè mmadụ a ga-esi “n’oké mkpagbu ahụ pụta.” (Mkpu. 7:9, 14) Mgbe Jizọs merichara ndị niile na-emegide Alaeze Chineke, ọ ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis. Ha ga-anọ ebe ahụ ka ndị nwụrụ anwụ n’enweghị ike ime ihe ọ bụla ruo otu puku afọ.—Gụọ Mkpughe 6:2; 20:1-3.

Otú Anyị Ga-esi Ejikere Maka Ihe Ndị A Na-aga Ime

19, 20. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru n’Aịzaya 26:20, nakwa n’Aịzaya 30:21?

19 Olee otú anyị ga-esi jikere maka ihe ndị ahụ dị egwu ga-eme n’ụwa a? Ihe e kwuru n’Ụlọ Nche n’oge gara aga ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi ejikere. E kwuru, sị: “Nlanarị ga-adabere ná nrubeisi.” Maka gịnị? Ihe Jehova gwara ndị Izrel a dọọrọ n’agha gaa Babịlọn n’oge ochie ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a. Jehova kwuru na a ga-emeri Babịlọn. Ma, olee otú ndị Chineke bi na ya ga-esi ejikere maka mbibi a? Jehova kwuru, sị: “Ndị m, gaanụ banye n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime, mechiekwanụ ọnụ ụzọ mgbe unu banyesịrị. Zoonụ ruo nwa mgbe nta, ruo mgbe oké iwe gafere.” (Aịza. 26:20) Ị̀ hụrụ ihe a chọrọ ka ụmụ Izrel mee? A gwara ha ‘gaa’ n’ụlọ ha dị n’ime, gwakwa ha “banye” na ya. A gwakwara ha ‘mechie’ ọnụ ụzọ ha, nakwa ka ha ‘zoo’ onwe ha. Ihe a niile bụ iwu e nyere ha enye. Ndị Juu niile mere ihe a a gwara ha apụtaghị n’èzí mgbe a na-emeri Babịlọn. N’ihi ya, ihe mere ha ji dịrị ndụ bụ n’ihi na ha mere ihe ndị ahụ Jehova gwara ha mee. b

20 Olee ihe anyị na-amụta n’ihe a merenụ? Ihe anyị na-amụta bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ mgbe Jehova ga-ebibi ụwa ọjọọ a, anyị ga-eme ihe niile ọ gwara anyị mee otú ahụ ndị Izrel mere. (Aịza. 30:21) Jehova na-esi n’ọgbakọ ya agwa anyị ihe ndị ahụ ọ chọrọ ka anyị mee. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji obi anyị dum na-eme ihe niile a gwara anyị n’ọgbakọ. (1 Jọn 5:3) Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ taa, ọ ga-adịrị anyị mfe iji obi anyị niile na-eme ihe ndị a ga-agwa anyị n’ọdinihu. Nna anyị bụ́ Jehova, na Eze anyị bụ́ Jizọs, ga-echebekwa anyị. (Zef. 2:3) Ha chebe anyị, anyị ga-eji anya anyị hụ otú Alaeze Chineke ga-esi ebibi ndị iro ya kpamkpam. Anyị agaghị echefu ihe a Jehova ga-emere anyị echefu.

a E nwere ike ikwu na mbibi a a ga-ebibi “Babịlọn Ukwu ahụ” bụ karịchaa, ime ka òtù okpukpe ụgha niile ghara ịdị ọzọ, ọ bụghị na a ga-egbu ndị niile na-ekpe okpukpe ụgha otu mgbe. N’ihi ya, a gaghị egbu ọtụtụ n’ime ha. N’oge ahụ, ha nwere ike ịna-eme ka ndị na-enweghị ihe jikọrọ ha na okpukpe ụgha ndị ahụ, otú ahụ e kwuru na Zekaraya 13:4-6.

b Ị chọọ ịmatakwu banyere akụkọ a, gụọ akwụkwọ anyị a na-akpọ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke I, peeji nke 282 na nke 283.