Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Ezigbo Nwanna Anyị:

KA E were ya na ị na-arụ ọrụ na Betel dị na Bruklin. N’ụtụtụ Fraịdee, abalị abụọ n’ọnwa Ọktoba, afọ 1914, gị abata n’ebe a na-anọ eri nri nọrọ ọdụ n’oche gị, na-eche ka Nwanna C. T. Russell bata. Obere oge, ụzọ emepee, ya abata, cheretụ dị ka o si eme, mụmụọ ọnụ ọchị, sị unu: “Ùnu abọọla chi?” Ma, kama ịga ozugbo nọrọ n’isi oche ebe ọ na-anọ, ya akụọ aka ka ndị mmadụ nọọ jii. Ya agwa unu, sị: “Oge ndị Jentaịl abịala ná ngwụsị; ụbọchị ndị eze ha agwụla.” Ihe a o kwuru tọrọ gị ụtọ. Ihe ị na-achọ kemgbe ka o mee, emeela. Mgbe o kwuchara ihe a, obi tọrọ unu niile ụtọ, unu akụọ ezigbo aka.

Ọtụtụ afọ agaala kemgbe Nwanna Russell gwachara ndị Betel okwu ahụ. Olee ihe Chineke ji Alaeze ya mee kemgbe ahụ? Ọ dị ọtụtụ. Jehova ji Alaeze ya na-akụziri ndị ya ihe nwayọọ nwayọọ ma na-eme ka ha dịrị ọcha. Dị ka ihe atụ, e nwere puku mmadụ ole na ole n’ọgbakọ ya n’afọ 1914. Ma ugbu a, ọ fọrọ obere ka ha ruo nde mmadụ asatọ. Olee uru ihe a niile Jehova na-akụziri anyị baara gị?

N’oge anyị a, anyị na-anụkarị mgbe ụmụnna anyị na-ekwu na “nzukọ Jehova na-aga n’ihu n’ihu.” Ihe a ha na-ekwu bụ eziokwu. Kemgbe afọ 1914, nzukọ Jehova na-aga n’ihu n’ike n’ike. Ị gụọ akwụkwọ a, ị ga-achọpụta na nke a bụ eziokwu. Ka anyị nwee ike izi ndị mmadụ ozi ọma n’ụwa niile, anyị ejirila ihe ndị dị ka akwụkwọ akụkọ, sinima, kaadị e ji ezi ozi ọma, gramafon, na redio zie ozi ọma. Anyị na-ejikwa Ịntanet ezi ozi ọma taa.

Jehova na-agọzi ozi anyị. Anyị na-ebipụtazi ọmarịcha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị asụsụ narị isii na iri asaa, ma na-enye ha ọhaneze n’agwaghị ha ego ole ha ga-enye n’onyinye. Ụmụnna anyị ndị ji obi ha dum ewepụta onwe ha na-enye aka arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na alaka ụlọ ọrụ dị iche iche, ma ná mba ndị bara ọgaranya ma ná mba ndị na-abaghị ọgaranya. E nwee ọdachi, ụmụnna anyị na-aga ozugbo nyere ụmụnna ha aka. Nke a gosiri na ha hụrụ ha n’anya nke ukwuu. Ụmụnna ndị a na-egosi na ha bụ ‘ụmụnne a mụrụ maka oge nsogbu.’—Ilu 17:17.

Mgbe ụfọdụ, ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ na-emegide anyị ‘na-eji iwu na-akpa nkata inye anyị nsogbu.’ Ma ọtụtụ mgbe, ihe a ha na-eme emeela ka “ozi ọma na-aga n’ihu.”—Ọma 94:20; Fil. 1:12.

Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na unu na-arụkọ ọrụ n’ihi na anyị niile bụ otu “ezinụlọ.” Biko, maranụ na anyị hụrụ unu niile n’anya. Anyị na-arịọkwa Jehova ka o mee ka ihe ndị e dere n’akwụkwọ a mee ka unu jiri ihe Jehova na-akụziri anyị n’ọgbakọ ya kpọrọkwuo ihe.—Mat. 24:45.

Jisienụ ike.

Anyị bụ ụmụnna unu,

Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova