Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Foto nke aka ekpe: Ebe onye uwe ojii chọrọ ịnwụchi otu nwanna maka na ọ na-ezi ozi ọma. Nwanna a nọ n’obodo Aịndhovun, dị na Nedalandz, na-ezi ozi ọma n’afọ 1945; foto nke aka nri: Iwu obodo unu ò kwuru na e kwesịrị ịhapụ unu ka unu na-ezi ozi ọma?

NKEBI NKE 4

Otú Alaeze Chineke Si Na-emeri Ndị Iro Ya​—⁠Iji Iwu Mee Ka A Hapụ Anyị Ka Anyị Na-ekwusa Ozi Ọma

Otú Alaeze Chineke Si Na-emeri Ndị Iro Ya​—⁠Iji Iwu Mee Ka A Hapụ Anyị Ka Anyị Na-ekwusa Ozi Ọma

KA E were ya na unu gara ozi ọma otu ụbọchị. Unu abanye n’otu ụlọ, onye gị na ya so ebido ziwe onye unu hụrụ n’ebe ahụ ozi ọma. Ka ọ nọ na-ezi onye ahụ ozi ọma, unu anụ ụda saịrin otu ụgbọala gbu na-abịa. Ka ụgbọala ahụ nọ na-abịa, ụda saịrin ahụ ana-adasikwu ike. Mgbe unu si n’ụlọ ahụ pụta gaa n’ụlọ ọzọ, gịnwa ebido ziwe onye nwe ụlọ ahụ ozi ọma. Ka ị nọ na-ekwu okwu, ụgbọala ahụ agbarute ebe ahụ unu nọ, kwụsị. Onye gị na ya so elewe ụgbọala ahụ anya, mata na ọ bụ ndị uwe ojii. Otu onye uwe ojii esi n’ụgbọala ahụ pụta jụọ unu, sị: “Ọ̀ bụ unu bụ ndị a sị na-aga n’ụlọ ndị mmadụ ezi ha ozi ọma ebe a? Ọtụtụ ndị sị na unu ji ozi ọma unu a enye ha nsogbu.” Mgbe o kwuchara, unu emeda obi gwa ya na unu bụ Ndịàmà Jehova. Olee ihe ọzọ i chere nwere ike ime?

Ọ bụ otú ndị ọchịchị obodo unu si ele Ndịàmà Jehova anya ga-ekpebi ihe ọzọ ga-emenụ. Kemgbe ọtụtụ afọ, olee otú ndị ọchịchị obodo unu sirila meso Ndịàmà Jehova ihe? Hà na-ekwe ka unu na-efe Chineke otú ọ chọrọ? Ọ bụrụ na ha na-ekwe unu, ọ ga-abụ n’ihi otú ụmụnna anyị sirila gbasie mbọ ike n’oge gara aga jiri iwu mee ka a hapụ anyị ịna-ekwusa ozi ọma. (Fil. 1:7) N’agbanyeghị obodo i bi, ọ bụrụ na ị gụọ gbasara ikpe ndị anyị meriri na ha, ma chebara ha echiche, ọ ga-eme ka okwukwe gị sikwuo ike. Ná nkebi a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ ikpe ndị ahụ anyị meriri. Ikpe ndị a na-egosi na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị, ma ọ́ bụghị ya, e nweghị ihe anyị gaara emeli.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 13

Okwu Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke Wepụrụ n’Ụlọikpe

Ụfọdụ ndị ọkàikpe e nwere n’oge a na-eme ihe Gameliel, onye na-akụzi Iwu, mere n’oge ndịozi Jizọs.

ISI NKE 14

Iji Obi Anyị Niile Na-akwado Naanị Ọchịchị Chineke

Mgbe a na-emekpọ Ndịàmà Jehova ọnụ maka na ha jụrụ iso na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị a na-echetụdịghị n’echiche na ha ga-agbatara ha ọsọ enyemaka gbataara ha ọsọ enyemaka.

ISI 15

Otú Anyị Si Mee Ihe Niile Anyị Nwere Ike Ime Ka E Kwe Anyị Ịna-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ

Ndị Chineke emeela ihe niile ha nwere ike ime ka e kwe ha ịna-erubere Chineke isi.