Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Foto nke aka ekpe: Nnọkọ ụmụnna nọ n’èzí nwee na Lọndọn, dị n’Ịngland n’afọ 1945; foto nke aka nri: Mgbe e nwere mgbakọ pụrụ iche na Malawi, dị n’Afrịka, n’afọ 2012

NKEBI NKE 5

Otú E Si Na-akụziri Ụmụ Amaala Alaeze Chineke Ihe​—⁠Otú Eze Anyị Si Akụziri Anyị Ihe

Otú E Si Na-akụziri Ụmụ Amaala Alaeze Chineke Ihe​—⁠Otú Eze Anyị Si Akụziri Anyị Ihe

KA E were ya na e nwere otu mgbakọ unu gara. Ná mgbakọ a, otu nwa okorobịa nọ na-ekwu okwu tọrọ gị ụtọ, gị elee ya anya, mụmụọ ọnụ ọchị. Nwa okorobịa a si n’ọgbakọ gị. Nke a bụ nke mbụ ọ na-ekwu okwu ná mgbakọ. Ka ọ na-ekwu okwu a, gị ekwuo n’obi gị na Jehova na-akụzikwaranụ ndị ya ihe. Mgbe i chetara okwu mbụ nwanna a kwuru n’ọgbakọ unu, gị ekwuo n’obi gị na nwanna a amụtakwuola nnọọ otú e si ekwu okwu. Ma, o nwere ihe ọzọ i chetakwara. I chetara na ọ mụtala ọtụtụ ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nakwa n’Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ ọ gara. I chetakwara na ya na nwunye ya ka si Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye lọta. Mgbe nwanna a kwuchara ọmarịcha okwu ya rịtuo, gị ana-akụrụ ya aka. Ka ị na-akụrụ ya aka, gị elegharịa anya na-eche ihe ndị magburu onwe ha Jehova na-akụziri ndị ya.

Baịbụl kwuru gbasara oge ndị Chineke niile ga-abụ “ndị Jehova kụziiri ihe.” (Aịza. 54:13) Ọ bụ n’oge ahụ ka anyị bi na ya ugbu a. Jehova ji ọtụtụ ihe na-akụziri ndị ya ihe. O ji akwụkwọ anyị dị iche iche, ọmụmụ ihe ndị anyị na-aga, mgbakọ ukwu na mgbakọ nta, nakwa ụlọ akwụkwọ dị iche iche, na-akwadebe anyị maka ọrụ dị iche iche a na-arụ ná nzukọ ya. Ihe anyị ga-eleba anya ná nkebi a bụ otú ihe niile Jehova na-akụziri anyị si gosi na Alaeze Chineke na-achị achị taa.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 16

Izukọta Ọnụ Na-efe Jehova

Olee otú anyị ga-esi eme ka ọmụmụ ihe ndị anyị na-aga efe Jehova baara anyị ezigbo uru?

ISI NKE 17

Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke

Olee otú ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova sirila nyere anyị anyị aka ije ozi anyị nke ọma?