Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Foto nke aka ekpe: Mgbe e si Swizaland bute ihe e ji gbatara ụmụnna nọ na Jamanị ọsọ enyemaka n’afọ 1946; foto nke aka nri: Ebe ụmụnna na-arụzigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze ala ọma jijiji kwaturu na Japan n’afọ 2011

NKEBI NKE 6

Ịkwado Alaeze Chineke​—⁠Ịrụ Ebe Anyị Na-anọ Efe Chineke na Ịgbatara Ụmụnna Ọsọ Enyemaka

Ịkwado Alaeze Chineke​—⁠Ịrụ Ebe Anyị Na-anọ Efe Chineke na Ịgbatara Ụmụnna Ọsọ Enyemaka

KA E were ya na e nwere otu ụbọchị ị gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze unu, ihe ị hụrụ eju gị anya. Ụlọ Nzukọ Alaeze unu mara mma, ị na-ejikwa ya eme ọnụ. O nwekwara ike ịbụ na i so rụọ ya, ị na-echetakwa ihe ndị mere gị obi ụtọ mgbe unu na-arụ ya afọ ole na ole gara aga. Ma, o nwere ihe ọzọ mere i ji jirikwuo Ụlọ Nzukọ Alaeze unu na-eme ọnụ. Ọ bụzi ebe ụmụnna ndị gbatara ọsọ ndụ bigodị. Oké ifufe na idei mmiri kpara mkpamkpa n’obodo unu n’oge na-adịbeghị anya. Kọmitii Alaka ahazie ozugbo ka a gbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Ha haziri ka e bugara ha nri, uwe, ezigbo mmiri ọṅụṅụ, na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. A haziri onyinye ndị a nke ọma. Mgbe e bugaara ụmụnna ndị a ihe ndị dị ha mkpa, ha akwụọ n’ahịrị, a na-enye ha ihe ndị ahụ. Obi dị ọtụtụ n’ime ha ụtọ mgbe ha na-ewere ihe ndị a nke na anya mmiri nọ na-agba ha.

Jizọs kwuru na otu ihe a ga-eji mara ndị na-eso ụzọ ya bụ na ha ga-ahụ ibe ha n’anya. (Jọn 13:34, 35) Ná nkebi a, anyị ga-eleba anya n’otú Ndịàmà Jehova si egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya mgbe ha na-arụ ebe ha na-anọ efe Chineke nakwa mgbe ha na-agbatara ibe ha ọsọ enyemaka. Otú a anyị si hụ ibe anyị n’anya na-egosi na Alaeze Chineke, nke Jizọs bụ́ Eze ya, na-achị anyị.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 18

Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Arụ Ọrụ Ndị Gbasara Alaeze Chineke

Olee ebe anyị si enweta ego? Olee otú anyị si emefu ya?

ISI NKE 19

Ịrụ Ụlọ Ndị E Ji Na-eto Jehova

Ebe ndị a na-anọ efe Chineke na-eme ka a na-eto Chineke. Ma, e nwere ihe na-aka eme ya obi ụtọ.

ISI NKE 20

Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka

Olee otú anyị si mara na ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị so n’ozi dị nsọ anyị na-ejere Jehova?