Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ 137

Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu

Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu

Danloduo ya:

(Ọrụ Ndịozi 4:29)

  1. K’anyị n’ekwus’Al’eze gị,

    K’anyị n’ekwus’aha gị,

    Ọtụtụ n’emegid’anyị,

    N’achọ imeny’any’ihere.

    Kam’ịtụ ’madụ egwu,

    Ọ bụ gị k’anyị g’ege ntị.

    Anyị n’arịọ k’i ny’anyị ’mụọ nsọ;

    Biko, Jaa, z’anyị ekper’anyị.

    (KORỌS)

    Nye anyị ob’ik’ịgbara gị àmà;

    Mee k’anyị kwụs’ịtụ egwu.

    Mee k’obi si’anyị ezigbo ike

    K’ụwa niile wee nụ ya.

    Amagedọn dị ezigbo nso,

    Ma tupu ok’ụbọchị ahụ,

    Nye anyị ob’ik’ịgbara gị àmà.

    A’yị n’arịọ gị.

  2. Anyị tụgodị ụjọ ’madụ,

    Ị manụ n’anyị bụ ájá.

    I kwere nkw’inyer’anyị aka.

    Anyị ma n’ị g’eme ya.

    Biko, leb’anya n’egwu

    Ndị mmegide n’eyi anyị.

    K’anyị niile n’ekwus’aha gị,

    Nyer’anyị ak’inwe ob’ike.

    (KORỌS)

    Nye anyị ob’ik’ịgbara gị àmà;

    Mee k’anyị kwụs’ịtụ egwu.

    Mee k’obi si’anyị ezigbo ike

    K’ụwa niile wee nụ ya.

    Amagedọn dị ezigbo nso,

    Ma tupu ok’ụbọchị ahụ,

    Nye anyị ob’ik’ịgbara gị àmà.

    A’yị n’arịọ gị.

(Gụọkwa 1 Tesa. 2:2; Hib. 10:35.)