Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 12

E Mee Jizọs Baptizim

E Mee Jizọs Baptizim

MATIU 3:13-17 MAK 1:9-11 LUK 3:21, 22 JỌN 1:32-34

  • E MEE JIZỌS BAPTIZIM, TEEKWA YA MMANỤ

  • JEHOVA EKWUO NA JIZỌS BỤ ỌKPARA YA

Ihe dị ka ọnwa isii Jọn Onye Na-eme Baptizim malitere ozi ọma ya, Jizọs, onye dị ihe dị ka afọ iri atọ mgbe ahụ, gakwuuru ya n’Osimiri Jọdan. Gịnị mere o ji gakwuru ya? Ọ gaghị ka ọ mara otú o mere. Ọ gaghịkwanụ ka ọ mara otú ọrụ Jọn si na-aga. Ihe mere o ji gakwuru ya bụ ka ọ gwa ya ka o mee ya baptizim.

Ma, Jọn jụrụ ime ya baptizim. Ọ sịrị: “Ọ bụ m ka ọ dị mkpa ka i mee baptizim, ọ̀ bụzi gị na-abịakwute m?” (Matiu 3:14) Jọn ma na Jizọs bụ onye pụrụ iche, ya bụ, Ọkpara Chineke. Ì chetara na mgbe Jọn nọ n’afọ nne ya, obi ụtọ mere ka ọ malie elu mgbe Meri bu afọ ime Jizọs bịa ileta Elizabet nne Jọn? Ọ ga-abụrịrị na Elizabet gwara Jọn ihe a merenụ. Ọ ga-abụkwa na a gwara ya banyere ozi ahụ mmụọ Gebriel bịara zie Meri na ọ ga-amụ Jizọs, nakwa otú ndị mmụọ ozi si pụta n’ihu ndị ọzụzụ atụrụ n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs.

Jọn ma na ndị ya na-eme baptizim bụ ndị chegharịrị ná mmehie ha. Ma, Jizọs emeghị mmehie ọ bụla. N’agbanyeghị na Jọn jụrụ ime ya baptizim, Jizọs nọgidere na-agwa ya ka o mee ya baptizim. Ọ sịrị: “Ka ọ dị otú a n’oge a, n’ihi na otú a ka o kwesịrị ekwesị ka anyị mezuo ihe niile bụ́ ezi omume.”—Matiu 3:15.

Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka e mee Jizọs baptizim? Jizọs anaghị eme baptizim ka o gosi na ya echegharịala ná mmehie. Kama, baptizim ọ chọrọ ka e mee ya na-egosi na o wepụtala onwe ya ime uche Nna ya. (Ndị Hibru 10:5-7) Jizọs bụ ọkwá nkà kemgbe a mụrụ ya. Mana, ugbu a, oge eruola ka o bido ọrụ Nna ya nke eluigwe kwo zite ya n’ụwa. Ì chere na Jọn na-atụ anya ka ihe dị ebube mee mgbe ọ na-eme Jizọs baptizim?

Jọn mechara kwuo, sị: “Onye ahụ nke zitere m ka m jiri mmiri na-eme baptizim sịrị m, ‘Onye ọ bụla nke ị hụrụ ka mmụọ nsọ bịakwasịrị ma dịgide n’isi ya, ọ bụ onye a bụ onye ji mmụọ nsọ na-eme baptizim.’” (Jọn 1:33) N’ihi ya, Jọn na-atụ anya ka mmụọ nsọ Chineke dakwasị otu n’ime ndị ọ ga-eme baptizim. Ọ bụ ya mere o nwere ike iji bụrụ na o jughị Jọn anya ‘ịhụ ka mmụọ Chineke na-efedata dị ka nduru wee bekwasị Jizọs.’—Matiu 3:16.

Ma, e nwere ihe ọzọ mere mgbe a na-eme Jizọs baptizim. ‘Eluigwe megheere ya.’ Olee ihe nke a pụtara? Ọ ga-abụ na nke a pụtara na mgbe a na-eme Jizọs baptizim, o chetara ndụ o biri n’eluigwe tupu ya aghọọ mmadụ. Jizọs chetakwara mgbe ọ bụ mmụọ n’eluigwe nakwa ihe ndị Chineke kụziiri ya n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa.

Ihe ọzọ bụ na mgbe e mere Jizọs baptizim, olu si n’eluigwe kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Matiu 3:17) Ònye nwe olu ahụ? O nweghị mgbe ọ ga-abụ olu Jizọs, n’ihi na ya na Jọn nọ. Ihe ahụ bụ olu Chineke. O doro anya na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, ọ bụghị Chineke n’onwe ya.

Ọ dị mkpa ka anyị mara na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ bụ nwa Chineke otú ahụ mmadụ mbụ ahụ bụ́ Adam bụkwa. Mgbe Luk onye na-eso ụzọ Jizọs kọchara gbasara baptizim Jizọs, o dere sị: “Jizọs dị ihe dị ka afọ iri atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụkwa, dị ka e chere, nwa Josef, nwa Hilaị, . . . nwa Devid, . . . nwa Ebreham, . . . nwa Noa, . . . nwa Adam, nwa Chineke.”—Luk 3:23-38.

Anyị ahụla na otú ahụ Adam bụ “nwa Chineke” ka Jizọs bụkwa. Mgbe Jizọs mere baptizim, ọ ghọtara na ya bụ Ọkpara Chineke, onye ga-emecha ghọọ mmụọ n’eluigwe. Jizọs ga-enwezi ike ịkụziri anyị eziokwu Chineke, gosikwa anyị ụzọ na-eduga ná ndụ. Jizọs na-aga ịmalite ọrụ ga-emecha ruo na ya ịchụ ndụ ya n’àjà n’ihi ụmụ mmadụ.