Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 23

Jizọs Arụọ Ọtụtụ Ọrụ Ebube na Kapaniọm

Jizọs Arụọ Ọtụtụ Ọrụ Ebube na Kapaniọm

MATIU 8:14-17 MAK 1:21-34 LUK 4:31-41

  • JIZỌS ACHỤPỤ OTU MMỤỌ ỌJỌỌ

  • A GWỌỌ NNE NWUNYE PITA

Jizọs akpọọla mmadụ anọ ka ha bụrụ ndị ọkụ na-akụta mmadụ. Ha bụ Pita, Andru, Jems, na Jọn. N’otu Ụbọchị Izu Ike, ha niile gara n’ụlọ nzukọ dị na Kapaniọm. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Jizọs kụziri ihe n’ụlọ nzukọ ahụ. N’oge a kwa, otú Jizọs si kụzie ihe juru ndị mmadụ anya. Ọ kụziri ihe ka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka ndị odeakwụkwọ ha.

N’Ụbọchị Izu Ike a, otu nwoke mmụọ ọjọọ ji bịara n’ụlọ nzukọ ahụ. Ọ nọ na-eti mkpu n’oké olu, sị: “Gịnị jikọrọ anyị na gị, Jizọs onye Nazaret? Ị̀ bịara ibibi anyị? Amaara m kpọmkwem onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.” Jizọs baara mmụọ ọjọọ ahụ na-achị nwoke ahụ mba, sị: “Mechie ọnụ, sikwa n’ime ya pụta!”—Mak 1:24, 25.

Mgbe ọ gwara ya otú ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ tụrụ nwoke ahụ n’ala, mee ka ihe ọdịdọ dọwa ya, ya etiekwa mkpu n’oké olu. Ma, mmụọ ọjọọ ahụ si n’ime nwoke ahụ pụọ “n’emerụghị ya ahụ́.” (Luk 4:35) Ihe a juru ndị nọ n’ụlọ nzukọ ahụ anya. Ha jụwara, sị: “Gịnị bụ ihe nke a? . . . O ji ikike na-enye ọbụna ndị mmụọ na-adịghị ọcha iwu, ha na-erubekwara ya isi.” (Mak 1:27) Akụkọ ihe a dị́ ịtụnanya merenụ gbasara ebe niile na Galili.

Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si n’ụlọ nzukọ ahụ pụọ, ha gawara n’ụlọ Saịmọn Pita. Ha hụrụ na oké ahụ́ ọkụ ji nne nwunye Pita aka ọjọọ. Ha rịọrọ Jizọs ka o nyere ya aka. N’ihi ya, Jizọs garuru ebe o dina, jide ya n’aka, ma selite ya. Nwaanyị ahụ gbakere ozugbo ahụ. Ọ malitekwara ijere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ha na ya so ozi. O nwekwara ike ịbụ na o bidoro isiri ha ihe ha ga-eri.

N’ihe dị ka ná mgbede, ndị mmadụ si ebe dị iche iche kpọrọ ndị na-arịa ọrịa bịa n’ụlọ Pita. N’oge na-adịghị anya, o yiri ka à ga-asị na ọ bụ obodo ahụ dum gbakọtara n’ọnụ ụzọ ụlọ Pita. Maka gịnị? Ha chọrọ ka a gwọọ ha ọrịa. Nke bụ́ eziokwu bụ na “ndị niile nwere ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute ya. Ọ na-ebikwasị onye nke ọ bụla n’ime ha aka n’isi wee gwọọ ya.” (Luk 4:40) Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya na-arịa ndị mmadụ, Jizọs gwọrọ ha, dị nnọọ ka e buru ya n’amụma. (Aịzaya 53:4) O medịrị ka ndị mmụọ ọjọọ ji nwere onwe ha. Ndị mmụọ ọjọọ ahụ pụtawa n’ahụ́ mmadụ, ha na-adị eti mkpu, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke.” (Luk 4:41) Ma Jizọs na-adị abara ha mba, ọ naghịkwa ekwe ka ha na-ekwu okwu. Ha ma na Jizọs bụ Kraịst ahụ. Jizọs achọghịkwa ka ndị mmụọ ọjọọ ahụ mewe ka à ga-asị na ha na-ejere ezi Chineke ahụ ozi.