Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 30

Jizọs Bụ Ọkpara Chineke

Jizọs Bụ Ọkpara Chineke

JỌN 5:17-47

  • CHINEKE BỤ NNA JIZỌS

  • E KWE NKWA MBILITE N’ỌNWỤ

Mgbe ụfọdụ ndị Juu boro Jizọs ebubo na ọ na-ada iwu Ụbọchị Izu Ike, ọ zara ha, sị: “Nna m anọwo na-arụ ọrụ ruo ugbu a, anọwokwa m na-arụ ọrụ.”—Jọn 5:17.

Ihe Jizọs mere emegideghị iwu Ụbọchị Izu Ike Chineke nyere. Ọ bụ ọrụ ọma Chineke ka Jizọs ṅomiri mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma ma na-agwọ ndị mmadụ ọrịa. Ọ bụ ya mere Jizọs ji nọgide na-arụ ọrụ ọma kwa ụbọchị. Ihe ọ zara ndị na-ebo ya ebubo mere ka iwe wekwuo ha karịadị otú o were ha na mbụ. Ha chọwakwara igbu ya. Gịnị mere ha ji chọwa igbu ya?

Otu ihe mere ha ji chọwa igbu ya bụ na ha chere na ọrịa Jizọs na-agwọ ndị mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike bụ imebi iwu Ụbọchị Izu Ike. Ihe ọzọkwa were ha iwe bụ na Jizọs sịrị na ya bụ Ọkpara Chineke. Ha weere ya na Jizọs ịkpọ Chineke Nna ya bụ ikwulu Chineke. Ọ dị ha ka ihe Jizọs na-ekwu bụ na ya na Chineke hà. Ma, Jizọs atụghị egwu. Ọ gwara ha otú ya na Nna ya si dị n’ezigbo mma. Ọ sịrị: “Nna m hụrụ Ọkpara ya n’anya nke ukwuu, na-egosikwa ya ihe niile ya onwe ya na-eme.”—Jọn 5:20.

Nna ahụ bụ Onye Na-enye Ndụ. O gosikwara n’oge gara aga na ya na-enye ndụ mgbe o nyere ndị mmadụ ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Jizọs kwukwara, sị: “Dị nnọọ ka Nna m na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ma na-eme ka ha dị ndụ, otú ahụ ka Ọkpara ya na-emekwa ka ndị ọ chọrọ dị ndụ.” (Jọn 5:21) Ihe a bụ okwu gbara ọkpụrụkpụ nke na-eme ka anyị nwee olileanya. Ọkpara ahụ na-akpọlitedị ndị mmadụ ugbu a n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Onye na-anụ okwu m ma kwere n’onye ahụ nke zitere m nwere ndụ ebighị ebi, ọ dịghịkwa aba n’ikpe kama o siwo n’ọnwụ gafere ná ndụ.”—Jọn 5:24.

E nwebeghị ihe ndekọ gosiri na o nweela onye Jizọs si n’ọnwụ nkịtị kpọlite mgbe ahụ, ma ọ gwara ndị na-ebo ya ebubo na a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ. Ọ sịrị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.”—Jọn 5:28, 29.

N’agbanyeghị ọrụ pụrụ iche Jizọs na-arụ, o mere ka o doo anya na Chineke ka ya. Ọ sịrị: “Apụghị m ime otu mkpụrụ ihe n’uche nke aka m. . . . Ihe m na-achọ ime abụghị uche nke m, kama ọ bụ uche onye zitere m.” (Jọn 5:30) Ma, Jizọs kọwara ọrụ dị mkpa ọ na-arụ iji hụ na nzube Chineke mezuru, bụ́ nke ọ na-enwebeghị mgbe ọ rụrụ ya otú ahụ n’ihu ọha. Ma, ndị ahụ na-ebo Jizọs ebubo nwere ihe ndị ọzọ mere ha ga-eji kweta ihe ndị a ma e wezụga ihe ndị Jizọs na-agwa ha. Jizọs chetaara ha, sị: “Unu ezipụwo ndị mmadụ ka ha gakwuru Jọn [Onye Na-eme Baptizim], ọ gbawokwa àmà banyere eziokwu ahụ.”—Jọn 5:33.

Ọ ga-abụ na ndị ahụ na-ebo Jizọs ebubo anụla na n’ihe dị ka afọ abụọ gara aga, Jọn gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu banyere Onye na-abịa ya n’azụ, onye a na-akpọ “Onye Amụma” nakwa “Kraịst.” (Jọn 1:20-25) Iji chetara ha otú ha sibu jiri Jọn a nọ n’ụlọ mkpọrọ ugbu a kpọrọ ihe, Jizọs sịrị ha: “Ọ bụkwa ruo nwa oge ka unu chọrọ ịṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’ìhè ya.” (Jọn 5:35) Ma, Jizọs nwedịrị ihe àmà kwesịrị ime ka ha kweta karịadị nke Jọn Onye Na-eme Baptizim gwara ha.

Jizọs sịrị: “Ọrụ ndị m na-arụ [nke ọgwụgwọ ọ gwọrọ mmadụ mgbe ahụ so n’ime ya] na-agba àmà banyere m na ọ bụ Nna m zitere m.” Ọ gwakwara ha, sị: “Nna nke zitere m agbawokwa àmà n’onwe ya banyere m.” (Jọn 5:36, 37) Dị ka ihe atụ, Chineke gbara àmà banyere Jizọs oge e mere ya baptizim.—Matiu 3:17.

N’eziokwu, ndị ahụ na-ebo Jizọs ebubo enweghị ihe ha ga-akụdo aka sị na ọ bụ ya mere ha ji jụ ya. Akwụkwọ Nsọ ha sị na ha na-agụsi ike gbara àmà banyere ya. N’ikpeazụ, Jizọs sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu kweere Mozis, unu gaara ekwere m, n’ihi na o dere banyere m. Ma ọ bụrụ na unu ekwereghị ihe o dere, olee otú unu ga-esi kwere okwu m?”—Jọn 5:46, 47.