Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 34

Jizọs Ahọrọ Ndịozi Iri na Abụọ

Jizọs Ahọrọ Ndịozi Iri na Abụọ

MAK 3:13-19 LUK 6:12-16

  • NDỊOZI IRI NA ABỤỌ

O ruola otu afọ na ọkara kemgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim gwachara ndị mmadụ na Jizọs bụ Nwa Atụrụ Chineke. Ka Jizọs malitere ozi ya, ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya, ndị dị ka Andru, Saịmọn Pita, Jọn, Filip, nakwa Batọlọmiu (onye a na-akpọkwa Nataniel). Ọ ga-abụkwa na Jems (nwanne Jọn) so ha. Ka e mechara, ọtụtụ ndị ọzọ ghọkwara ndị na-eso ụzọ Kraịst.—Jọn 1:45-47.

Ma, ugbu a, oge eruola ka Jizọs họrọ ndịozi ya. Ha ga-abụ ndị ha na ya ga na-eso mgbe niile, ya enyekwa ha ọzụzụ pụrụ iche. Ma, tupu Jizọs ahọrọ ha, o bu ụzọ gaa n’otu ugwu. Ọ ga-abụ na ọ bụ nke dị nso n’Oké Osimiri Galili na-adịchaghị anya na Kapaniọm ka ọ gara. N’ebe ahụ, o ji abalị dum kpee ekpere, na-arịọ Chineke ka o nye ya amamihe, meekwa ka ihe ọ chọrọ ime gaa nke ọma. N’echi ya, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ma si na ha họrọ ndịozi iri na abụọ.

Jizọs họọrọ mmadụ isii ahụ anyị kpọrọ aha na mbụ, họrọkwa Matiu, onye ọ kpọrọ n’ụlọ ọrụ ndị ọnaụtụ. Mmadụ ise ọzọ ọ họọrọ bụ Judas (onye a na-akpọkwa Tadiọs na “nwa Jems”), Saịmọn onye Kenan, Tọmọs, Jems nwa Alfiọs, na Judas Iskarịọt.—Matiu 10:2-4; Luk 6:16.

Ka ọ dị ugbu a, mmadụ iri na abụọ a esorola Jizọs gaa ọtụtụ ebe, ọ makwa ha nke ọma. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ikwu ya. O yiri ka Jems na nwanne ya bụ́ Jọn bụ ụmụ nwanne nne Jizọs. Ọ bụrụ na Alfiọs a Jems bụ nwa ya bụ nwanne Josef, nna kuchiri Jizọs, dị ka ụfọdụ ndị na-ekwu, ihe ọ pụtara bụ na Jems onyeozi bụ nwa nwanne nna Jizọs.

Icheta aha ndịozi ya abụghịrị Jizọs nsogbu. Ma, gịnwa ị̀ ga-echetali aha ha? Otu ihe ga-enyere gị aka icheta aha ha bụ icheta na e nwere mmadụ abụọ aha ha bụ Saịmọn, nwee mmadụ abụọ aha ha bụ Jems, nweekwa mmadụ abụọ ọzọ aha ha bụ Judas. Saịmọn (Pita) nwere nwanne nwoke aha ya bụ Andru, Jems (nwa Zebedi) enweekwa nwanne aha ya bụ Jọn. Ihe a ga-enyere gị aka icheta aha ndịozi asatọ. Mmadụ anọ ndị ọzọ bụ onye ọnaụtụ (Matiu), onye ọzọ abụrụ onye ahụ mechara rụọ ụka (Tọmọs), onye nke a kpọrọ mgbe ọ nọ n’okpuru osisi (Nataniel), nakwa enyi Nataniel (Filip).

Mmadụ iri na otu n’ime ndịozi ahụ si Galili, obodo Jizọs. Nataniel si Kena. Filip, Pita, na Andru si Betseida. Ma, Pita na Andru mechara gaa biri na Kapaniọm, bụ́ ebe ọ ga-abụkwa na Matiu bi. Jems na Jọn bikwa na Kapaniọm ma ọ bụ ebe dị ya nso, bụ́ ebe ha nọ na-arụ ọrụ ịkụ azụ̀. O yiri ka Judas Iskarịọt, onye mechara rara Jizọs nye, bụ naanị onyeozi si Judia.