Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 47

Otu Nwata Nwaanyị Adịghachi Ndụ

Otu Nwata Nwaanyị Adịghachi Ndụ

MATIU 9:18, 23-26 MAK 5:22-24, 35-43 LUK 8:40-42, 49-56

  • JIZỌS AKPỌLITE ADA JEIRỌS N’ỌNWỤ

Jeirọs hụrụ na Jizọs agwọọla nwaanyị ahụ nwere oruru ọbara. Obi sikwara ya ike na Jizọs ga-agwọlikwa nwa ya nwaanyị. Mana, obi ya na-agwa ya na ‘ada ya ga-anwụworị ugbu a.’ (Matiu 9:18) Ma, Jizọs ọ̀ ka ga-enyeliri ya aka?

Ka Jizọs ka na-agwa nwaanyị ahụ ọ gwọrọ okwu, ụfọdụ ụmụ nwoke sí n’ụlọ Jeirọs bịara sị ya: “Nwa gị nwaanyị anwụọla!” Ha jụrụ ya, sị: “Gịnị mere ị ka ji na-enye onye ozizi nsogbu?”—Mak 5:35.

Ihe a bụ ozi na-agbawa obi. Nwoke a, bụ́ onye a na-akwanyere ùgwù n’obodo, amakwaghị ihe ọ ga-eme. Otu mkpụrụ nwa o nwere anwụọla. Ma, Jizọs nụrụ ozi ahụ e ziri nwoke ahụ, nke mere na o lere ya anya ma mesie ya obi ike. Ọ sịrị ya: “Atụla egwu, naanị nwee okwukwe.”—Mak 5:36.

Jizọs sooro Jeirọs gawa n’ụlọ ya. Mgbe ha garuru, mkpọtụ na ọgba aghara juru ebe niile. Ndị gbakọrọ ebe ahụ nọ na-ebe ákwá, ụfọdụ ana-akụ onwe ha n’ala. Mgbe Jizọs batara n’ime ụlọ ahụ, o kwuru ihe tụrụ onye ọ bụla n’anya. Ọ sịrị: “Nwatakịrị ahụ anwụbeghị, kama ọ na-ehi ụra.” (Mak 5:39) Mgbe ha nụrụ ihe a, ha malitere ịchị Jizọs ọchị. O doro ha anya na nwa ahụ anwụọla. Ma, Jizọs ga-eji ikike Chineke nyere ya gosi na ya nwere ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ dịkwa ka e nwere ike ịkpọte onye nọ n’oké ụra.

Jizọs gwara mmadụ niile ka ha pụọ èzí ma e wezụga Pita, Jems, Jọn na nne na nna nwata nwaanyị ahụ. Ọ kpọọrọ mmadụ ise a banye ebe e nyiwere nwata nwaanyị ahụ. Jizọs seere nwata ahụ n’aka, sị ya: “‘Talita kumi,’ nke pụtara, ma a sụgharịa ya: “Nwata nwaanyị, ana m asị gị, Bilie!”’” (Mak 5:41) Nwata nwaanyị ahụ biliri ozugbo, malite ịga ije. Chegodị ụdị obi ụtọ Jeirọs na nwunye ya nwere mgbe ha hụrụ ihe a. Iji gosi ha na nwata ahụ adịla ndụ n’eziokwu, Jizọs sịrị ka ha nye ya nri ka o rie.

Jizọs gwara ndị ọ gwọrọ n’oge gara aga ka ha ghara ịkọrọ ndị ọzọ ihe o meere ha. Ọ bụkwa ihe ọ gwara nne na nna nwa a. N’agbanyeghị ya, nne na nna a obi bụ sọ aṅụrị na ndị ọzọ nọ ebe ahụ kọsara ihe a “n’ógbè ahụ dum.” (Matiu 9:26) Ọ bụrụ na ị hụ ka a kpọlitere onye nke gị n’ọnwụ, ọ̀ bụ na ị gaghị eji obi ụtọ kọọrọ ndị ọzọ banyere ya. Onye a bụ onye nke abụọ e kwuru okwu ya na Baịbụl Jizọs kpọlitere n’ọnwụ.