Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 62

Jizọs Akụzie Gbasara Ịdị Umeala n’Obi

Jizọs Akụzie Gbasara Ịdị Umeala n’Obi

MATIU 17:22–18:5 MAK 9:30-37 LUK 9:43-48

  • JIZỌS EKWUGHACHIKWA GBASARA ỌNWỤ YA

  • JIZỌS EJIRI EGO SI N’ỌNỤ AZỤ̀ TỤỌ ỤTỤ ISI YA

  • ÒNYE GA-ABỤ ONYE KACHA UKWUU N’ALAEZE ELUIGWE?

Mgbe Jizọs nwoghachara, si n’elu ugwu rịdata ma gwọọ nwata nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji na Sesaria Filipaị, ya na ndị na-eso ụzọ ya gawaziri Kapaniọm. Naanị ya na ha so na-aga n’ihi na ọ chọghị ka ndị mmadụ “mara banyere” ebe ọ na-aga. (Mak 9:30) Ihe mere o ji mee ihe a bụ ka o nwekwuo ohere ọ ga-eji kwadebe ndị na-eso ụzọ ya maka ọnwụ ya, kwadebekwa ha maka ọrụ ha na-aga ịrụ. Ọ gwara ha, sị: “A kawo ya aka na a ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ, ha ga-egbu ya, a ga-akpọlitekwa ya n’ụbọchị nke atọ.”—Matiu 17:22, 23.

Nke a abụghị nke mbụ ọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya banyere ọnwụ ya. Ọ gwabuola ha na a ga-egbu ya, ọ bụ eziokwu na Pita ekwetaghị na ụdị ihe ahụ ga-eme ya. (Matiu 16:21, 22) Mmadụ atọ n’ime ndịozi ya hụkwara mgbe o nwoghara, nụkwa mgbe e kwuru banyere “ọlịla” ya. (Luk 9:31) Ndị na-eso ụzọ Jizọs “nwere mwute dị nnọọ ukwuu” n’ihi ihe a Jizọs na-agwa ha n’agbanyeghị na ha aghọtachabeghị ihe ihe ọ na-ekwu pụtara. (Matiu 17:23) Ma, ụjọ ji ha ịgwa ya ka ọ kọwakwuoro ha ihe ọ na-ekwu.

Obere oge, ha rutere Kapaniọm. Ọ bụ na Kapaniọm ka Jizọs na-anọkarị, ọ bụkwa ebe ahụ ka ọtụtụ ndịozi ya si. Ndị na-ana ụtụ isi maka ụlọ nsọ bịakwutere Pita, jụwa ya, sị: “Ọ̀ bụ na onye ozizi unu adịghị atụ ụtụ mkpụrụ ego drakma abụọ ahụ?” Ọ ga-abụ na ha na-achọ ibo Jizọs ebubo na ọ naghị atụ ụtụ isi.—Matiu 17:24.

Pita zara ha “Ee.” Ma tupu Pita alọta, Jizọs amatala ihe merenụ. Mgbe Pita batara n’ime ụlọ, Jizọs jụrụ ya gbasara ihe ahụ merenụ tupudị ya ekwuo ya. Ọ jụrụ ya, sị: “Saịmọn, gịnị ka i chere? Ọ̀ bụ n’aka ole ndị ka ndị eze nke ụwa na-anata ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ isi? Ọ̀ bụ n’aka ụmụ ha ka ọ̀ bụ n’aka ndị bịara abịa?” Pita zara ya, sị: “Ọ bụ n’aka ndị bịara abịa.” Jizọs sịziri ya: “Ya mere, n’ezie, ụmụ ha anaghị atụ ụtụ.”—Matiu 17:25, 26.

Nna Jizọs bụ Eze nke eluigwe na ala, ọ bụkwa Ya ka a na-efe n’ụlọ nsọ ahụ. N’ihi ya, iwu ejighị Jizọs ịtụ ụtụ isi maka ụlọ nsọ. Ma, Jizọs gwara Pita, sị: “Ka anyị wee ghara ime ka ha sụọ ngọngọ, gaa n’oké osimiri, tụnye nko azụ̀, werekwa azụ̀ mbụ i gbutere. Mgbe i meghere ọnụ ya, ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego steta. Were ya nye ha maka mụ na gị.”—Matiu 17:27.

Obere oge, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụwa ya banyere onye ga-abụ onye kacha ukwuu n’alaeze eluigwe. Ụjọ jibu ndị na-eso ụzọ ya a ịjụ ya gbasara ọnwụ ọ na-aga ịnwụ, ma ugbu a, ụjọ atụghị ha ịjụ ya gbasara otú ihe ga-adịrị hanwa n’ọdịnihu. Ma, Jizọs ma ihe mere ha ji na-ajụ ajụjụ a. Ihe mere ha ji na-ajụ ya bụ maka ihe ha nọ n’azụ na-arụrịta ka ha na Jizọs nọ n’ụzọ na-aga Kapaniọm. Jizọs jụrụ ha, sị: “Gịnị ka unu na-arụ ụka ya n’okporo ụzọ?” (Mak 9:33) Ha gbachiri nkịtị n’ihi na ha nọ na-arụrịta ụka gbasara onye kacha ukwuu. N’ikpeazụ, ndịozi ahụ jụziri Jizọs, sị: “Ònye n’ezie bụ onye kasị ukwuu n’alaeze eluigwe?”—Matiu 18:1.

Ọ dị ịtụnanya na ndị na-eso ụzọ Jizọs na-arụrịta ụka banyere onye kacha ukwuu n’agbanyeghị na Jizọs akụzierela ha ihe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ atọ. Ma, anyị ma na ha ezughị okè. Ha tokwara n’ebe ndị okpukpe na-azọ onye ka ibe ya ukwuu. Ihe ọzọ bụkwa na o tebeghị aka Jizọs gwara Pita na ya ga-enye ya “mkpịsị ugodi” nke Alaeze. Ihe a Jizọs gwara ya nwere ike ime ka o chewe na ọ ka ndị ọzọ. Jems na Jọn nwekwara ike ichewe na ha ka ndị ọzọ ebe ha hụrụ mgbe Jizọs nwoghara.

N’agbanyeghị ihe ọ bụ ya mere ha ji na-achọ ịma onye kacha ukwuu, Jizọs kụziiri ha otú ha kwesịrị isi na-ele onwe ha anya. Ọ kpọtara otu nwatakịrị, guzo ya n’etiti ha, ma gwa ha, sị: “Ọ bụrụ na unu echigharịghị wee dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze eluigwe ma ọlị. Ya mere, onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya ala dị ka nwatakịrị a bụ onye kasị ukwuu n’alaeze eluigwe; onye ọ bụla nke na-anabata nwatakịrị dị otú a n’aha m na-anabatakwa m.”—Matiu 18:3-5.

O nweghị ihe dị ka otú a Jizọs si kụziere ha ịdị umeala n’obi. Jizọs ejighị maka ihe ahụ ndị na-eso ụzọ ya mere wewe iwe ma kpọwa ha ndị anyaukwu ma ọ bụ ndị oké ọchịchọ. Kama, o ji obere nwa kụziere ha ihe. Ụmụaka anaghị anọ n’ọkwá ukwu ma ọ bụ bụrụ ndị a ma ama. Jizọs si otú ahụ mee ka ndị na-eso ụzọ ya mata na ha kwesịrị iwere onwe ha ka ndị dị ala. Jizọs gwaziri ha, sị: “Onye na-eme onwe ya dị ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.”—Luk 9:48.