Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 72

Jizọs Ezipụ Ndị Na-eso Ụzọ Ya Iri Asaa Ka Ha Gaa Kwusaa Ozi Ọma

Jizọs Ezipụ Ndị Na-eso Ụzọ Ya Iri Asaa Ka Ha Gaa Kwusaa Ozi Ọma

LUK 10:1-24

  • JIZỌS AHỌPỤTA NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA IRI ASAA MA ZIGA HA IKWUSA OZI ỌMA

Afọ 32 agwụwala, o meekwala ihe dị ka afọ atọ kemgbe e mere Jizọs baptizim. Ọ dịbeghị anya Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gara Jeruselem mee Ememme Ụlọikwuu. Ọ ga-abụkwa na ha ka nọ nso na Jeruselem. (Luk 10:38; Jọn 11:1) Jizọs ji ọnwa isii ọ fọọrọ ya ikwusa ozi ọma kwusaa ozi ọma na Judia, gafeekwa Osimiri Jọdan kwusaa ozi ọma n’ógbè Peria. E kwesịkwara izi ozi ọma n’ebe ndị ahụ otú e ziri n’ebe ndị ọzọ.

Tupu mgbe ahụ, n’oge e mechara Ememme Ngabiga nke afọ 30, Jizọs ji ọnwa ole na ole gaa zie ozi ọma na Judia. Ọ na-agafekarị Sameria ma ó si Judia gawa ikwusa ozi ọma na Galili. Mgbe Jizọs nọ na Jeruselem n’ihe dị ka oge Ememme Ngabiga nke afọ 31, ndị Juu gbalịrị igbu ya. Jizọs ji otu afọ na ọnwa isii ọzọ kụziere ndị mmadụ ihe, karịchaa n’ebe ugwu Galili. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya. Mgbe Jizọs na ndịozi ya nọ na Galili, ọ kụziiri ha otú ha ga-esi zie ozi ọma ma zipụ ha ka ha gaa zie ozi ọma. Ọ gwara ha, sị: “Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe eruwo nso.’” (Matiu 10:5-7) Ugbu a, Jizọs haziri otú ndị na-eso ụzọ ya ga-esi zie ozi ọma na Judia.

Tupu ndị na-eso ụzọ Jizọs amalite izi ozi ọma a na Judia, Jizọs họpụtara mmadụ iri asaa n’ime ha ma zipụ ha abụọ abụọ n’ebe ‘ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ adịrị ole na ole.’ (Luk 10:2) Ha ga-ebu Jizọs ụzọ gaa ebe dị iche iche o nwere ike ịga kwusaa ozi ọma. Ndị na-eso ụzọ ya iri asaa ahụ ga-agwọ ndị ọrịa ma zie ndị mmadụ ozi ọma ahụ Jizọs nọ na-ezi.

Ọ bụghị naanị n’ụlọ nzukọ ndị Juu ka ndị na-eso ụzọ Jizọs ga na-ekwusa ozi ọma. Jizọs gwara ha ka ha na-aga n’ụlọ ndị mmadụ na-ekwusa ya. Ọ sịrị ha: “N’ebe ọ bụla unu banyere n’ụlọ, burunụ ụzọ sị, ‘Udo dịrị ụlọ a.’ Ọ bụrụkwa na onye udo nọ n’ebe ahụ, udo unu ga-adịkwasị ya.” Oleekwanụ ihe ha ga na-ezi ndị mmadụ? Jizọs gwara ha, sị: ‘Na-asịnụ ha, “Alaeze Chineke adịwo unu nso.”’—Luk 10:5-9.

Ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya iri asaa ahụ yiri nke ọ gwara ndịozi ya iri na abụọ mgbe ọ na-ezipụ ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ihe dị ka otu afọ tupu mgbe ahụ. Jizọs mere ka ha mara na ọ bụghị mmadụ niile ga-anabata ha. Ma, mbọ ndị na-eso ụzọ ya iri asaa a gbara ga-eme ka ndị gere ha ntị dịrị njikere ịnabata Jizọs mgbe ọ ga-abịa obere oge ha bịachara. Ọ ga-emekwa ka ọ na-agụsi ọtụtụ n’ime ha agụụ ike ịhụ Jizọs na ịmụta ihe n’aka ya.

Mgbe obere oge gachara, mmadụ iri asaa ahụ Jizọs zipụrụ ka ha gaa kwusaa ozi ọma laghachiri. Ha ji ọṅụ gwa Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, e doro ọbụna ndị mmụọ ọjọọ n’okpuru anyị site n’ịkpọ aha gị.” Ihe a ha kọọrọ Jizọs tọrọ ya ụtọ. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Amalitewo m ịhụ Setan ka ọ dara dị ka àmụ̀mà nke si n’eluigwe. Lee! Enyewo m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ.”—Luk 10:17-19.

Jizọs si otú a mee ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike na ha ga-emeri nsogbu ndị yiri agwọ na akpị nwere ike ịbịara ha. O mekwara ka ha mara na Setan ga-esirịrị n’eluigwe daa n’ọdịnihu. Ma, Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya iri asaa ahụ mara ihe ka mkpa. Ọ gwara ha, sị: “Unu aṅụrịla ọṅụ n’ihi nke a, na a na-eme ka mmụọ dị iche iche nọrọ n’okpuru unu, kama ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi na e dewo aha unu n’eluigwe.”—Luk 10:20.

Jizọs ṅụrịrị ọṅụ ma too Nna ya n’ihu ọha maka iji ndị ohu ya a dị umeala n’obi rụọ ọrụ nke ọma. Ọ tụgharịziri n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ wee sị ha: “Obi ụtọ na-adịrị anya nke na-ahụ ihe unu na-ahụ. N’ihi na ana m asị unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị eze chọrọ ịhụ ihe ndị unu na-ahụ, ma ha ahụghị ha, ha chọkwara ịnụ ihe ndị unu na-anụ, ma ha anụghị ha.”—Luk 10:23, 24.