Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 76

Jizọs Esoro Onye Farisii Rie Ihe

Jizọs Esoro Onye Farisii Rie Ihe

LUK 11:37-54

  • JIZỌS AKATỌỌ NDỊ FARISII, NDỊ IHU ABỤỌ

Mgbe Jizọs nọ na Judia, otu onye Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa na nke ya rie nri ehihie. (Luk 11:37, 38; tụlee Luk 14:12) Tupu ndị Farisii erie nri, ha na-ebu ụzọ kwọọ aka ha ruo n’ikpere aka iji mezuo iwu. Ma, Jizọs anaghị eme otú ahụ. (Matiu 15:1, 2) Ọ bụ eziokwu na onye kwọrọ aka ruo n’ikpere aka adaghị Iwu Chineke, ma ọ bụghị ihe Chineke nyere n’iwu.

O juru onye Farisii ahụ anya na Jizọs anaghị eso ha eme otú ahụ. Mgbe Jizọs chọpụtara na o juru ya anya, ọ sịrị ya: “Unu ndị Farisii, unu na-eme ka azụ iko na azụ efere dị ọcha, ma n’ime unu, unu jupụtara n’ibukọrọ ihe n’ike na ajọ omume. Ndị na-enweghị uche! Ọ́ bụghị onye ahụ nke mere azụ ya mekwara ime ya?”—Luk 11:39, 40.

Ihe bụ́ nsogbu abụghị na ndị ndú okpukpe a chọrọ ka mmadụ kwọọ aka ya tupu o riwe ihe, kama, ha bụ ndị ihu abụọ. Ndị Farisii na ndị ọzọ, bụ́ ndị na-akwọ aka ha ruo n’ikpere aka iji mezuo iwu, ewepụbeghị ihe ọjọọ n’obi ha. N’ihi ya, Jizọs gwara ha, sị: “Werenụ ihe dị n’ime nye onyinye ebere, ma, lee! ihe niile ọzọ banyere unu ga-adị ọcha.” (Luk 11:41) N’eziokwu, onyinye ọ bụla anyị na-enye kwesịrị isi anyị n’obi, ọ bụghị ka anyị mee ka ndị ọzọ kpọọ anyị ndị ezi omume.

Ọ bụghị na ndị Farisii anaghị enye onyinye. Kama, Jizọs kwuru ihe bụ́ nsogbu ha. Ọ sịrị: “Unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpá akwụkwọ mint na mkpá akwụkwọ ruu na nke akwụkwọ nri ọ bụla ọzọ, ma ikpe ziri ezi na ịhụ Chineke n’anya ka unu na-eleghara anya! Unu ji ụgwọ ime ihe ndị a, ma unu agaghị ahapụ ime ihe ndị ọzọ ahụ.” (Luk 11:42) Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru ka ha na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ha na-eweta n’ubi. (Diuterọnọmi 14:22) Mint na ruu so na ha. Ha bụ akwụkwọ nri a na-etinye ná nri iji mee ka ọ tọọ ụtọ. Ndị Farisii na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ndị a mgbe ọ bụla. Ma, hà na-emenụ ihe ndị ka mkpa Chineke nyere n’Iwu, dị ka ịna-ekpe ikpe ziri ezi na ịdị umeala n’obi?—Maịka 6:8.

Jizọs gwakwara ndị Farisii, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, n’ihi na ịnọ n’ihu oche ndị dị n’ụlọ nzukọ nakwa ekele a na-ekele n’ọma ahịa na-atọ unu ụtọ! Ahụhụ ga-adịrị unu, n’ihi na unu yiri ili ncheta ndị na-apụtaghị ìhè, nke mere na ndị mmadụ na-eje ije n’elu ha n’amaghị ihe ọ bụ!” (Luk 11:43, 44) Mmadụ nwere ike ịga ije n’elu ili na-apụtaghị ìhè ma ghọọ onye na-adịghị ọcha otú iwu ndị Juu si kwuo. Jizọs ji ihe a o kwuru mee ka a mata na ndị mmadụ amaghị na ndị Farisii ahụ adịghị ọcha.—Matiu 23:27.

Mgbe Jizọs kwuchara ihe a, otu nwoke nke maara Iwu gwara ya, sị: “Onye Ozizi, ị na-akparị anyị site n’ikwu ihe ndị a.” N’eziokwu, e kwesịrị ime ka ndị a maara Iwu mata na ha anaghị enyere ndị mmadụ aka. N’ihi ya, Jizọs gwara ha, sị: “Ahụhụ ga-adịkwara unu ndị maara Iwu, n’ihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu siri ike obubu, ma unu onwe unu adịghị eji otu n’ime mkpịsị aka unu ebitụ ibu ndị ahụ! Ahụhụ ga-adịrị unu, n’ihi na unu na-ewu ili ncheta ndị amụma, ma, ọ bụ nna nna unu hà gburu ha!”—Luk 11:45-47.

Ibu ndị Jizọs na-ekwu okwu ha bụ omenala ndị a na-edeghị n’Iwu Chineke na otú ndị Farisii si akọwa Iwu Chineke. Ndị Farisii anaghị eme ka ihe dịrị ndị mmadụ mfe, kama, ha na-esi ọnwụ na mmadụ niile ga na-eme omenala ndị ahụ. Ndị nna nna ha gburu ndị amụma Chineke malite n’Ebel gawa. Ma, ili ndị amụma ha na-ewu yiri ka hà na-akwanyere ndị amụma ahụ ùgwù. Ha si otú a na-eme ka ndị nna nna ha. Ha chọdịrị igbu Onye Amụma kachanụ Chineke nwere. Jizọs kwuru na ọgbọ ahụ ga-aza Chineke ajụjụ maka ọbara ndị amụma niile a wụfurula. Nke ahụ mere mgbe ihe dị ka afọ iri atọ na asatọ gachara, ya bụ, n’afọ 70.

Jizọs kwukwara, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị maara Iwu, n’ihi na unu wepụrụ mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma; unu onwe unu abanyeghị, unu gbochikwara ndị chọrọ ịbanye!” (Luk 11:52) Ọ bụ ndị a kwesịrị ịna-akụziri ndị mmadụ Iwu Chineke, ma, ha anaghị eme ya. Ha na-eme ka ndị mmadụ ghara ịnụ Iwu Chineke ma ghọta ya.

Gịnị ka ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ mere mgbe Jizọs gwachara ha ihe a? Mgbe Jizọs na-apụ, ha bidoro inye ya nsogbu na ịjụkasị ya ajụjụ ahụ́. Ha anaghị ajụ ajụjụ ndị ahụ iji mụta ihe. Kama, ha chọrọ iji aghụghọ mee ka Jizọs kwuo ihe ha ga-eji jide ya.