Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 80

Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma na Ogige Atụrụ

Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma na Ogige Atụrụ

JỌN 10:1-21

  • JIZỌS EKWUO BANYERE ONYE ỌZỤZỤ ATỤRỤ ỌMA NA OGIGE ATỤRỤ

Ka Jizọs na-akụzi ihe na Judia, o ji ihe ndị ọ na-agwa okwu maara nke ọma kụziere ha ihe. Ihe ndị ahụ bụ atụrụ na ogige atụrụ. O ji ha meere ha ihe atụ. Ndị Juu nwere ike icheta na Devid kwuru, sị: “Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. Ọ dịghị ihe ga-akọ m. Ọ na-eme ka m makpuru n’ebe ịta nri nke ahịhịa jupụtara.” (Abụ Ọma 23:1, 2) Devid kwukwara n’ebe ọzọ n’Abụ Ọma, sị: “Ka anyị gbuo ikpere n’ala n’ihu Jehova bụ́ Onye kere anyị. N’ihi na ya onwe ya bụ Chineke anyị, anyị bụ ndị ọ na-azụ n’ebe ịta nri ya.” (Abụ Ọma 95:6, 7) N’eziokwu, ọ dịla anya e jiwere ụmụ Izrel Chineke nyere Iwu Mozis na-atụnyere atụrụ Chineke.

“Atụrụ” ndị a, ya bụ ụmụ Izrel, nọ “n’ogige atụrụ” Chineke. Otú ha si nọrọ na ya bụ na a mụrụ ha ná mba ha na Chineke ji Iwu Mozis gbaa ndụ. Iwu a na-echebe ha ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ ndị na-anaghị edebe Iwu Mozis na-akpa. Ma, ụfọdụ ndị Izrel mesoro atụrụ Chineke mmeso ọjọọ. Jizọs kwuru, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, onye na-adịghị esi n’ọnụ ụzọ abanye n’ogige atụrụ, nke na-arịgo ebe ọzọ, bụ onye ohi na onye na-apụnara mmadụ ihe. Ma onye na-esi n’ọnụ ụzọ abanye bụ onye na-azụ atụrụ.”—Jọn 10:1, 2.

Ndị Jizọs na-agwa okwu nwere ike iche banyere ndị sịrịla na ha bụ Mesaya ma ọ bụ Kraịst. Ndị a dị ka ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe. Ndị mmadụ ekwesịghị isowe ha n’ihi na ha abụghị Mesaya ahụ. Onye ha kwesịrị iso bụ “onye na-azụ atụrụ.” Jizọs kwuru banyere onye ahụ na-azụ atụrụ, sị:

“Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ na-ege ntị n’olu ya, ọ na-akpọkwa atụrụ nke ya n’aha, na-edurukwa ha apụ. Mgbe ọ kpọpụtara ndị niile bụ́ nke ya, ọ na-ebutere ha ụzọ, atụrụ ahụ na-esokwa ya, n’ihi na ha maara olu ya. Ha agaghị eso onye bịara abịa ma ọlị, kama ha ga-agbara ya ọsọ, n’ihi na ha amaghị olu ndị bịara abịa.”—Jọn 10:3-5.

Tupu oge ahụ, Jọn Onye Na-eme Baptizim dị ka onye nche ọnụ ụzọ. O mere ka ndị bụ́ atụrụ, ya bụ, ụmụ Izrel, mara na ha kwesịrị iso Jizọs. Ụfọdụ n’ime atụrụ ndị ahụ, bụ́ ndị nọ na Galili nakwa na Judia ebe a, amatala olu Jizọs. Olee ebe Jizọs ga-edu ha aga? Oleekwa uru iso Jizọs ga-abara ha? Ọ ga-abụ na ụfọdụ n’ime ndị Jizọs na-emere ihe atụ a na-eche gbasara ajụjụ ndị a n’ihi na Baịbụl kwuru na ‘ha amaghị ihe ihe ndị ọ na-agwa ha pụtara.’—Jọn 10:6.

Jizọs kwuru, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, abụ m ọnụ ụzọ nke atụrụ ahụ. Ndị niile bịara wee na-asị na ha bụ m bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe; ma atụrụ ahụ egeghị ha ntị. Abụ m ọnụ ụzọ ahụ; onye ọ bụla nke na-esi na mụ abanye ka a ga-azọpụta, ọ ga na-abanye, na-apụkwa ma na-achọta ebe ịta nri.”—Jọn 10:7-9.

Ihe a Jizọs kwuru bụ ihe ọhụrụ. Ndị ọ na-agwa okwu maara na ọ bụghị ya bụ ọnụ ụzọ nke Iwu Chineke na mba Izrel ji gbaa ndụ. Iwu ahụ adịla adị ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. N’ihi ya, ihe okwu ya pụtara bụ na atụrụ ndị ‘o du apụ’ ga-abanye n’ogige atụrụ ọhụrụ. Gịnị ga-eme ma ha banye?

Jizọs kwuru ihe bụ́ ọrụ ya, sị: “Abịara m ka ha nwee ndụ, ka ha nweekwa ya n’uju. Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; onye ọzụzụ atụrụ ọma na-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi atụrụ ya.” (Jọn 10:10, 11) Jizọs agwabuola ndị na-eso ụzọ ya okwu kasiri ha obi. Ọ sịrị ha: “Unu atụla egwu, ìgwè atụrụ nta, n’ihi na ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.” (Luk 12:32) N’eziokwu, ndị so ‘n’ìgwè atụrụ nta’ a bụ ndị Jizọs ga-eduru banye n’ogige atụrụ ọhụrụ, ka ha nwee ike ‘nwee ndụ, nweekwa ya n’uju.’ O nweghị ihe karịrị mmadụ iso n’ìgwè atụrụ nta ahụ.

Jizọs kwukwara, sị: “Enwekwara m atụrụ ọzọ, ndị na-anọghị n’ogige atụrụ a; m ga-akpọtakwa ha, ha ga-ege ntị n’olu m, ha ga-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:16) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na “atụrụ ọzọ” ahụ na “ìgwè atụrụ nta,” bụ́ ndị ahụ ga-eketa Alaeze eluigwe, anọghị n’otu ogige atụrụ. Olileanya anya nke ndị nọ n’ogige atụrụ abụọ a abụghị otu. Ma, ọrụ Jizọs na-arụ ga-abara ha uru. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụ ya mere Nna m ji hụ m n’anya, n’ihi na m na-atọgbọ mkpụrụ obi m.”—Jọn 10:17.

Ọtụtụ n’ime ndị ahụ Jizọs na-agwa okwu kwuru, sị: “Mmụọ ọjọọ ji ya, ara na-agbakwa ya.” Ma, ndị ọzọ kwuru ihe gosiri na ha nwere mmasị n’ihe ndị Jizọs kwuru. Okwu ha gosikwara na ha chọrọ iso Jizọs, bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma. Ha sịrị: “Okwu ndị a abụghị okwu onye mmụọ ọjọọ ji. Mmụọ ọjọọ ọ̀ pụrụ imeghe anya ndị ìsì?” (Jọn 10:20, 21) Ọ ga-abụ na ha na-ekwu banyere nwoke ahụ kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya Jizọs gwọrọ.