Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 81

Jizọs na Nna Ya Bụ Otu, Ma Ọ Bụghị Chineke

Jizọs na Nna Ya Bụ Otu, Ma Ọ Bụghị Chineke

JỌN 10:22-42

  • “MỤ NA NNA M BỤ OTU”

  • JIZỌS AGBAGHAA EBUBO E BORO YA NA Ọ BỤ CHINEKE

Jizọs abịala na Jeruselem maka Ememme Nraranye (nke a na-akpọkwa Hanuka). A na-eji ya echeta nke ugboro abụọ a raara ụlọ nsọ dị na Jeruselem nye Jehova. Ihe karịrị otu narị afọ tupu mgbe ahụ, Eze Siria a na-akpọ Antiokọs nke Anọ Epifini bibiri nnukwu ebe ịchụàjà a rụrụ n’ụlọ nsọ Chineke ma rụọ nke ya. Ka oge na-aga, ụmụ onye nchụàjà, bụ́ onye Juu, napụtara Jeruselem n’aka Eze ahụ ma rara ụlọ nsọ ahụ nyeghachi Jehova. Kemgbe ahụ, ọ na-abụ n’afọ ọ bụla, n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Kislev, ndị Juu na-eme ememme iji cheta mgbe a raara ụlọ nsọ ahụ nyeghachi Jehova. Ọnwa Kislev bụ ngwụcha ọnwa Nọvemba na mmalite ọnwa Disemba.

Oge ahụ bụ oge oyi. Jizọs nọ na-ejegharị n’ụlọ nsọ ahụ n’ebe veranda nwere ogidi nke Sọlọmọn. N’ebe ahụ, ndị Juu gbara ya gburugburu ma jụọ ya, sị: “Ị̀ ga-ekowe anyị obi n’elu ruo ole mgbe? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị hoo haa.” (Jọn 10:22-24) Gịnị ka Jizọs zara ha? Ọ gwara ha, sị: “Agwara m unu, ma unu ekweghị.” Jizọs agwabeghị ha hoo haa na ya bụ Kraịst, otú ahụ ọ gwara nwaanyị Sameria mgbe ọ bịara isere mmiri n’olulu mmiri. (Jọn 4:25, 26) Ma, o meela ka ha mata onye ọ bụ mgbe ọ gwara ha, sị: “Tupu a mụọ Ebreham, mụ onwe m adịrịla ndụ.”—Jọn 8:58.

Jizọs chọrọ ka ndị ahụ jiri ihe ndị ọ na-arụ tụnyere ihe ndị e buru n’amụma na Mesaya ga-arụ ma si na ha ghọta na ọ bụ ya bụ Kraịst. Ọ bụ ya mere na n’oge ndị ọzọ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ịgwa ndị mmadụ na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ. Ma, ugbu a, ọ gwara ndị Juu ahụ bịakwutere ya hoo haa, sị: “Ọrụ niile m na-arụ n’aha Nna m na-agba àmà banyere m. Ma unu ekweghị.”—Jọn 10:25, 26.

Gịnị mere na ha ekweghị na Jizọs bụ Kraịst? O kwuru, sị: “Unu ekweghị, n’ihi na unu esoghị n’atụrụ m. Atụrụ m na-ege ntị n’olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m. M na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi, a gaghịkwa ebibi ha ma ọlị, ọ dịghịkwa onye ga-apụnara ha n’aka m. Ihe Nna m nyere m karịrị ihe ndị ọzọ niile.” Jizọs gwaziri ha otú ya na Nna ya dịruru ná mma. Ọ gwara ha, sị: “Mụ na Nna m bụ otu.” (Jọn 10:26-30) Jizọs nọ n’ụwa mgbe ahụ, Nna ya nọ n’eluigwe. N’ihi ya, ihe ọ na-ekwu abụghị na ya na Nna ya bụ otu onye. Kama, ọ na-ekwu na ya na Nna ya dị n’otu, na ha nwere otu obi.

Ihe a Jizọs kwuru were ndị Juu ezigbo iwe, ha atụtụrụ nkume chọọ ịtụgbu ya. Ma, nke a emeghị ka Jizọs tụọ ụjọ. Ọ gwara ha, sị: “Egosiri m unu ọtụtụ ọrụ ọma si n’aka Nna m. Ole nke n’ime ọrụ ndị ahụ mere unu ji na-atụ m nkume?” Ha kwuru, sị: “Anyị na-atụ gị nkume, ọ bụghị n’ihi ọrụ ọma, kama n’ihi nkwulu . . . n’ihi na gị onwe gị na-eme onwe gị chi.” (Jọn 10:31-33) O nwetụbeghị mgbe Jizọs kwuru na ya bụ Chineke. N’ihi ya, gịnị mere ha ji ebo ya ebubo a?

Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs na-ekwu na ya nwere ikike ndị Juu kweere na ọ bụ naanị Chineke nwere. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru gbasara ndị bụ́ “atụrụ,” sị: “M na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi.” Mmadụ agaghị enyeli mmadụ ibe ya ndụ ebighị ebi. (Jọn 10:28) Ndị Juu ahụ achọghị ịma na Jizọs agwala ha n’ezoghị ọnụ na ọ bụ Nna ya nyere ya ikike o ji na-arụ ọrụ ya.

Jizọs gbaghara ebubo ha boro ya ma jụọ ha, sị: “Ọ̀ bụ na e deghị ya n’Iwu unu [n’Abụ Ọma 82:6], sị, ‘Asịrị m: “Unu bụ chi”’? Ọ bụrụ na ọ kpọrọ ndị ahụ okwu Chineke bịakwasịrị ‘chi,’. . . ùnu na-asị m, bụ́ onye Nna m doro nsọ ma zite n’ụwa, ‘Ị na-ekwulu Chineke,’ n’ihi na m sịrị, abụ m Ọkpara Chineke?”—Jọn 10:34-36.

N’eziokwu, Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ụmụ mmadụ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi “chi.” N’ihi ya, gịnị mere ndị Juu ahụ ji enye Jizọs nsogbu maka na ọ sịrị: “Abụ m Ọkpara Chineke”? Jizọs gwara ha ihe mere ha ga-eji kweta na ya bụ Ọkpara Chineke. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na mụ adịghị arụ ọrụ Nna m, unu ekwerela na m. Ma ọ bụrụ na m na-arụ ha, ọ bụrụgodị na unu ekwereghị na m, kwerenụ ọrụ ndị ahụ, ka unu wee mara ma nọgide na-amara na mụ na Nna m dị n’otu, nakwa na Nna m na mụ onwe m dịkwa n’otu.”—Jọn 10:37, 38.

Mgbe Jizọs kwuchara ihe a, ndị Juu gbalịrị ka ha jide ya. Ma ọ gbanahụrụ ha. Jizọs hapụrụ Jeruselem gaa ná mpaghara nke ọzọ nke Osimiri Jọdan n’ebe Jọn nọ mee ndị mmadụ baptizim ihe fọrọ obere ka o ruo afọ anọ tupu mgbe ahụ. Ebe ahụ nwere ike ịdị nso n’ebe ngwụcha ndịda Oké Osimiri Galili.

Ìgwè mmadụ bịakwutere Jizọs ma kwuo, sị: “Jọn emeghị otu mkpụrụ ihe ịrịba ama, ma ihe niile Jọn kwuru banyere nwoke a bụcha eziokwu.” (Jọn 10:41) N’ihi ya, ọtụtụ ndị Juu nwere okwukwe na Jizọs.