Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 82

Ozi Jizọs Jere na Peria

Ozi Jizọs Jere na Peria

LUK 13:22–14:6

  • GBALỊA KA I SI N’ỌNỤ ỤZỌ DỊ WARARA BANYE

  • JIZỌS GA-ANWỤRỊRỊ NA JERUSELEM

Jizọs nọ kemgbe na-akụzi ihe ma na Jeruselem ma na Judia, na-agwọkwa ndị ọrịa. O mechaziri gafee Osimiri Jọdan, na-ezi ihe n’obodo dị iche iche dị n’ógbè Peria. Ma, oge na-adịghị anya, ọ ga-alaghachi Jeruselem.

N’oge Jizọs nọ na Peria, otu nwoke jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ndị a ga-azọpụta hà dị ole na ole?” Ndị ndú okpukpe ndị Juu na-arụrịta ụka ma à ga-azọpụta ọtụtụ ndị ka ọ̀ bụ mmadụ ole na ole. Ọ ga-abụkwa na nwoke a ma gbasara ụka a ha na-arụrịta. Jizọs azaghị nwoke ahụ ajụjụ ahụ, kama, ọ gwara ya ihe mmadụ ga-eme ka a zọpụta ya. Ọ sịrị: “Gbalịsienụ ike ka unu si n’ọnụ ụzọ dị warara banye.” Ihe a Jizọs kwuru bụ eziokwu. Mmadụ ga-agbasi mbọ ike tupu ya esi n’ọnụ ụzọ ahụ dị warara banye. Ihe gosiri na mmadụ ga-eme otú ahụ bụ ihe ọzọ Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike.”—Luk 13:23, 24.

Jizọs mere ihe atụ iji gosi na mmadụ kwesịrị ịgbalịsi ike ka o si n’ọnụ ụzọ ahụ dị warara banye. Ọ sịrị: “Ozugbo onyeisi ezinụlọ biliri kpọchie ụzọ, unu eguzoro n’èzí na-akụ aka n’ụzọ, sị, ‘Nna anyị ukwu, megheere anyị ụzọ.’ . . . Ma ọ ga-agwa unu, sị, ‘Amaghị m ebe unu si. Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu niile bụ́ ndị ọrụ ajọ omume!’”—Luk 13:25-27.

Jizọs na-akọwa ihe mere onye bịara ihe mgbe oge gacharala. O nwere ike ịbụ na onye ahụ bịara mgbe dị ya mma. Mgbe o rutere, ọ hụrụ na e mechiela ụzọ. Onye ahụ gaara abịa n’oge, ọ bụrụgodị na ọ dịrịghị ya mfe. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ọtụtụ ndị n’oge Jizọs. Ha agbaghị mbọ mụta ihe n’ihe Jizọs na-akụziri ha, ha emeghịkwa ka ofufe Chineke bụrụ ihe kacha ha mkpa ná ndụ. Mgbe Chineke zitere Jizọs n’ụwa ka ọ gbapụta ụmụ mmadụ, ọtụtụ ndị Juu o ziri ozi ọma anabataghị ya. Jizọs sịrị na ha “ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé” mgbe a ga-atụpụ ha n’èzí. Ma, ndị ‘si n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ,’ ya bụ, ndị si ná mba niile, ‘ga-anọdụ ala na-eri ihe na tebụl n’alaeze Chineke.’—Luk 13:28, 29.

Jizọs kwukwara, sị: “E nwere ndị ikpeazụ [ya bụ, ndị Juu a na-emegbu emegbu na ndị mba ọzọ] ga-abụ ndị mbụ, e nwekwara ndị mbụ [ya bụ, ndị ndú okpukpe ndị Juu, ndị na-etu ọnụ na ha bụ ụmụ Ebreham] ga-abụ ndị ikpeazụ.” (Luk 13:30) Mgbe Jizọs kwuru na ha ga-abụ “ndị ikpeazụ,” ihe ọ na-ekwu bụ na ndị a na-anabataghị ya agaghị eketa Alaeze Chineke.

Ụfọdụ ndị Farisii bịaziri na-agwa Jizọs, sị: “Pụwa, lawa, n’ihi na Herọd [Antipas] chọrọ igbu gị.” Ọ ga-abụ Eze Herọd bidoro kwuwe na ya chọrọ igbu Jizọs otú ọ ga-abụ Jizọs nụ ya, ya esi n’ógbè ahụ gbafuo. Ụjọ na-atụ Herọd n’ihi na ọ chọghị igbu onye amụma ọzọ otú ahụ o gburu Jọn Onye Na-eme Baptizim. Ma, Jizọs gwara ndị Farisii, sị: “Gaa gwa nkịta ọhịa ahụ, sị, ‘Lee! Ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, na-agwọkwa ọrịa taa na echi, m ga-emechakwa n’ụbọchị nke atọ.’” (Luk 13:31, 32) Ọ ga-abụ na ihe mere Jizọs ji kpọọ Herọd “nkịta ọhịa” bụ na ọ dị akọ ka nkịta ọhịa. Ma, o nweghị ihe Herọd ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ga-ekwu ga-eme ka Jizọs pụọ mgbe oge ọ ga-apụ na-erubeghị. Ọ ga-arụcharịrị ọrụ Nna ya nyere ya. Ọ ga-arụrukwa ya oge Chineke chọrọ, ọ bụghị oge mmadụ chọrọ.

Jizọs gawaziri Jeruselem n’ihi na dị ka o kwuru, “o kwesịghị ka e gbuo onye amụma n’ebe na-abụghị Jeruselem.” (Luk 13:33) O nweghị amụma dị́ na Baịbụl kwuru na a ga-egburịrị Mesaya na Jeruselem. Gịnịzi mere Jizọs ji kwuo na a ga-egbu ya ebe ahụ? Ọ bụ n’ihi na Jeruselem bụ isi obodo ndị Juu, bụrụkwa ebe e nwere ụlọikpe Sanhedrin nke mmadụ iri asaa na otu na-ekpe ikpe na ya. Ọ bụ n’ụlọikpe a ka a na-ekpe ndị a sịrị bụ́ ndị amụma ụgha ikpe. Ọ bụkwa na Jeruselem ka a na-achụ ụmụ anụmanụ n’àjà. N’ihi ya, Jizọs weere ya na o kwesịghị ekwesị ka e gbuo ya n’ebe ọzọ na-abụghị na Jeruselem.

Jizọs sịrị: “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e ziteere ya nkume—lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya, ma unu achọghị ya! Lee! A hapụworo unu ụlọ unu.” (Luk 13:34, 35) Ebe ọ bụ na mba a ajụla Ọkpara Chineke, ha ga-ata ahụhụ ya.

Tupu Jizọs eruo Jeruselem, onye ndú ndị Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa rie nri n’Ụbọchị Izu Ike. Ndị ọbịa ndị ọzọ lewere Jizọs anya ka ha mara ihe ọ ga-eme otu nwoke nọ ebe ahụ na-arịa ọrịa ahụ́ mmiri (ọrịa a na-emekarị ka mmiri gbajuo mmadụ n’ụkwụ, ụkwụ ya azaa). Jizọs jụrụ ndị Farisii na ndị maara Iwu, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ịgwọ ọrịa n’ụbọchị izu ike ka ọ̀ bụ na ọ kwadoghị?”—Luk 14:3.

O nweghị onye n’ime ha zara Jizọs ajụjụ a. Jizọs gwọrọ nwoke ahụ ma jụọ ha, sị: “Ònye n’ime unu ga-ahapụ ịdọpụta nwa ya nwoke ma ọ bụ ehi ya ozugbo ma ọ bụrụ na ọ daba n’olulu mmiri n’ụbọchị izu ike?” (Luk 14:5) Ha azalighịkwa Jizọs ajụjụ a.