Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 89

Jizọs Akụzie Ihe na Peria Tupu Ya Abanye Judia

Jizọs Akụzie Ihe na Peria Tupu Ya Abanye Judia

LUK 17:1-10 JỌN 11:1-16

  • Ọ JỌGBURU ONWE YA IME KA MMADỤ SỤỌ NGỌNGỌ

  • NA-AGBAGHARA MMEHIE, NWEEKWA OKWUKWE

Kemgbe abalị ole na ole ugbu a, Jizọs nọ “n’ofe Jọdan,” n’ebe a na-akpọ Peria na-akụzi ihe. (Jọn 10:40) Ma, ọ ga-emecha tinye isi n’ụzọ na-aga Jeruselem.

Ọ bụghị naanị Jizọs so na-aga. Ndị na-eso ụzọ ya na “oké ìgwè mmadụ” so ya na-aga. Ndị ọnaụtụ na ndị mmehie sokwa n’oké ìgwè mmadụ ahụ. (Luk 14:25; 15:1) Ndị ọzọ sókwa Jizọs na-aga bụ ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ, bụ́ ndị na-akatọ ihe Jizọs na-eme na ihe ọ na-ekwu. Ma, o nwere ọtụtụ ihe ha kwesịrị ichebara echiche mgbe ha nụchara ihe atụ Jizọs mere gbasara atụrụ furu efu, nwa furu efu, nakwa ọgaranya na Lazarọs.—Luk 15:2; 16:14.

Jizọs gwawaziri ndị na-eso ụzọ ya okwu. Ọ gwara ha ihe ụfọdụ ọ gwaburula ha mgbe ha nọ na Galili. Ọ ga-abụ na ihe mere o ji gwawa ha ihe ndị a bụ maka ihe ndị na-emegide ya mere n’oge na-adịbeghị anya. Ha nọ na-akatọ ya ma na-akwa ya emo.

Jizọs gwara ha, sị: “Ọ bụ ihe a na-apụghị izere ezere na ihe ndị na-eme ka a sụọ ngọngọ ga-abịa. Ka o sina dị, ahụhụ ga-adịrị onye ha si n’aka ya bịa! . . . Lezienụ onwe unu anya. Ọ bụrụ na nwanna gị emehie, baara ya mba, ọ bụrụkwa na o chegharịa, gbaghara ya. Ọ bụrụgodị na o mehie gị ugboro asaa n’ụbọchị, o wee bịaghachikwute gị ugboro asaa, sị, ‘Echegharịwo m,’ gbaghara ya.” (Luk 17:1-4) Ihe ikpeazụ a Jizọs kwuru nwere ike ichetara Pita ajụjụ ahụ ọ jụburu Jizọs banyere mmadụ ịgbaghara mmadụ ibe ya ruo ugboro asaa.—Matiu 18:21.

Ma, ndị na-eso ụzọ Jizọs hà ga-eme ihe a Jizọs kwuru? Mgbe ha gwara Jizọs, sị: “Nyekwuo anyị okwukwe,” ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-agwa osisi mọlberi ojii a, sị, ‘Ka e fopụ gị ma kụọ gị n’oké osimiri!’ ọ ga-erubekwara unu isi.” (Luk 17:5, 6) N’eziokwu, obere okwukwe nwedịrị ike ime ihe ndị dị ịtụnanya.

Jizọs kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya uru ọ bara mmadụ ịdị umeala n’obi na mmadụ ịna-ele onwe ya anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ gwara ha, sị: “Ònye n’ime unu nwere ohu nke na-akọ ubi ma ọ bụ nke na-elekọta anụ ụlọ, bụ́ onye ga-asị ohu ahụ mgbe o si n’ubi lọta, ‘Bịa ebe a ozugbo, nọdụ ala rie ihe na tebụl’? Kama nke ahụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị asị ya, ‘Kwadebere m ihe ka m rie nri anyasị m, yirikwa uwe eprọn jeere m ozi ruo mgbe m richara ihe oriri ma ṅụchaa ihe ọṅụṅụ, e mesịakwa, i nwere ike iri ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ’? Ọ gaghị enwe obi ekele n’ebe ohu ahụ nọ n’ihi na o mere ihe ndị e kenyere ya, ka ọ̀ ga-enwe? Ya mere, unu onwe unu, mgbe unu mere ihe niile e kenyere unu, sịnụ, ‘Anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla. Ihe anyị mere bụ ihe anyị kwesịrị ime.’”—Luk 17:7-10.

Onye ọ bụla na-efe Chineke kwesịrị ịghọta na ya kwesịrị iwere ihe ọ bụla gbasara Chineke ka ihe mbụ ná ndụ ya. Onye ahụ kwesịkwara icheta na ọ bụ ùgwù ka Chineke kwanyeere ya kwe ka o soro ná ndị na-efe ya.

Ọ ga-abụ na obere oge Jizọs gwachara ndị na-eso ụzọ ya okwu, onye Meri na Mata dunyere ozi rutere. Meri na Mata bụ ụmụnne Lazarọs. Ha bi na Betani nke dị na Judia. Onye ahụ ha dunyere ozi gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, lee! onye ahụ ị hụrụ n’anya nke ukwuu na-arịa ọrịa.”—Jọn 11:1-3.

N’agbanyeghị na Jizọs anụla na ezigbo ahụ́ na-arịa Lazarọs enyi ya, o kweghị ka ihe ọ nụrụ mee ka ọ kwụsị ihe ọ na-eme. Kama, o kwuru, sị: “Ihe ga-esi n’ọrịa a pụta abụghị ọnwụ, kama ọ bụ inye Chineke otuto, ka e wee site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.” Jizọs nọkwa ebe ahụ ọ nọ ruo abalị abụọ. Mgbe e mechaziri, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị gaghachi na Judia.” Ma, ndị na-eso ụzọ ya gwara ya, sị: “Rabaị, ọ dịchabeghị anya ndị Judia chọrọ ịtụ gị nkume, ị̀ na-agaghachi ebe ahụ?”—Jọn 11:4, 7, 8.

Jizọs zara ha, sị: “Ọ́ bụghị awa iri na abụọ ka a na-enwe ìhè n’ụbọchị? Ọ bụrụ na mmadụ na-ejegharị n’oge ìhè dị, ọ dịghị akpọ ụkwụ n’ihe ọ bụla, n’ihi na ọ na-ahụ ìhè nke ụwa a. Ma ọ bụrụ na mmadụ na-ejegharị n’abalị, ọ na-akpọ ụkwụ n’ihe, n’ihi na ìhè adịghị n’ime ya.” (Jọn 11:9, 10) Ọ ga-abụ na ihe Jizọs na-ekwu bụ na oge Chineke chọrọ ka o jiri jee ozi ya n’ụwa agwụbeghị. Tupu oge ahụ agwụ, Jizọs chọrọ iji obere oge nke fọrọnụ rụsie ọrụ ike.

Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya.” Ndị na-eso ụzọ ya chere na Lazarọs na-ezu ike, nakwa na ọ ga-emecha gbakee n’ọrịa ya. Ha sịrị Jizọs: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ahụ́ ga-adị ya mma.” Jizọs gwaziri ha hoo haa, sị: “Lazarọs anwụwo . . . Ma ka anyị gakwuru ya.”—Jọn 11: 11-15.

Ọ bụ eziokwu na Tọmọs ma na e nwere ike igbu Jizọs ma ha ruo Judia, ma ọ chọrọ ịkwado Jizọs. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ibe ya, sị: “Ka anyị onwe anyị gaakwa, ka anyị wee soro ya nwụọ.”—Jọn 11:16.