Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 118

Ndịozi Jizọs Arụọ Ụka Gbasara Onye Kacha Ukwuu n’Ime Ha

Ndịozi Jizọs Arụọ Ụka Gbasara Onye Kacha Ukwuu n’Ime Ha

MATIU 26:31-35 MAK 14:27-31 LUK 22:24-38 JỌN 13:31-38

  • JIZỌS ENYE NDỊOZI YA NDỤMỌDỤ GBASARA ỊZỌ ỌKWÁ

  • JIZỌS EBUO AMỤMA NA PITA GA-AGỌNAHỤ YA

  • ỊHỤNANYA KA A GA-EJI AMA NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS

Ná mgbede ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya nọ, ọ sara ha ukwu iji kụziere ha ka ha na-adị umeala n’obi. Gịnị mere ihe a o mere ji daba adaba? Ọ bụ n’ihi ihe ndịozi ya mere. Ha ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ma, ha ka na-arụ ụka n’etiti onwe ha onye ọ bụ n’ime ha kacha ukwuu. (Mak 9:33, 34; 10:35-37) Ha rụrịtakwara ụka ahụ ọzọ ná mgbede a.

Baịbụl sịrị: “Esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ bilitekwara n’etiti [ndịozi Jizọs] banyere onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu.” (Luk 22:24) Ọ ga-abụ na o wutere Jizọs ịhụ ka ha na-ese okwu ọzọ maka ihe a na-enweghị isi. Gịnị ka Jizọs mere?

Jizọs abaraghị ndịozi ya mba maka àgwà a ha kpara. Kama, o ji ndidi soro ha kwurịta okwu. Ọ sịrị ha: “Ndị eze nke ndị mba ọzọ na-eme ka à ga-asị na ọ bụ ha nwe ha, a na-akpọkwa ndị na-achị ha Ndị Ome Mma. Ma unu onwe unu agaghị adị otú ahụ. . . . N’ihi na olee onye ka ukwuu, ọ̀ bụ onye nọ na-eri ihe na tebụl ka ọ̀ bụ onye na-eje ozi?” O chetaziiri ha ihe yanwa na-eme, nke ọ chọrọ ka ha na-eme. Ọ sịrị ha: “Ma anọ m n’etiti unu dị ka onye na-eje ozi.”—Luk 22:25-27.

N’agbanyeghị na e nwere ebe ndịozi Jizọs na-anaghị emecha nke ọma, ha ahapụghị Jizọs ọbụna n’oge dị iche iche ọnwụnwa bịaara ya. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: “Mụ na unu na-agbakwa ndụ maka alaeze, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbara ndụ.” (Luk 22:29) Ha niile akwụsịghị iso ụzọ Jizọs. Jizọs ji ndụ ya na ha gbara mee ka obi sie ha ike na ya na ha ga-anọ n’Alaeze eluigwe ma soro ya na-achị.

N’agbanyeghị na ndịozi Jizọs nwere olileanya na ha ga-eso Jizọs na-achị, ha ka bụ mmadụ, bụrụkwa ndị na-ezughị okè. Jizọs gwara ha, sị: “Setan achọsiwo ike ka a yọchaa unu dị ka ọka wit.” Ọ na-abụ a na-ayọcha ọka wit, ya ana-agbasasị. (Luk 22:31) Jizọs gwakwara ha, sị: “Unu niile ga-asụ ngọngọ n’ihi m n’abalị a, n’ihi na e dere, sị, ‘M ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ, ìgwè atụrụ ya ga-agbasasịkwa.’”—Matiu 26:31; Zekaraya 13:7.

Pita turu ọnụ, sị: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile asụọ ngọngọ n’ihi gị, m gaghị asụ ngọngọ ma ọlị!” (Matiu 26:33) Jizọs gwara Pita na tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ n’abalị ahụ, ọ ga-agọnahụ ya. Jizọs kwukwara, sị: “Arịọsiwo m arịrịọ ike maka gị ka okwukwe gị wee ghara ịda mbà; gị onwe gị kwa, ozugbo ị laghachiri, mee ka ụmụnna gị dị ike.” (Luk 22:32) N’agbanyeghị ihe a Jizọs gwara Pita, Pita sịrị ya: “Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, agaghị m agọnahụ gị ma ọlị.” (Matiu 26:35) Ndịozi ndị ọzọ kwukwara otu ihe ahụ.

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụ na unu ga-anọkwu obere oge. Unu ga-achọ m; dị nnọọ ka m gwara ndị Juu, sị, ‘Unu apụghị ịbịa ebe m na-aga,’ otú ahụ ka m na-agwakwa unu ugbu a.” Ọ gwaziri ha, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:33-35.

Mgbe Jizọs kwuru na ya na ha ga-anọkwu obere oge, Pita jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, olee ebe ị na-aga?” Jizọs zara ya, sị: “Ị pụghị iso m ugbu a gaa ebe m na-aga, kama ị ga-eso m ma e mesịa.” Ihe a Jizọs kwuru gbagwojuru Pita anya, ya ajụọ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, gịnị mere na apụghị m iso gị ugbu a? M ga-atọgbọ mkpụrụ obi m n’ihi gị.”—Jọn 13:36, 37.

Jizọs chetaziiri ndịozi ya ihe ọ gwara ha mgbe o zipụrụ ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma na Galili n’ejighị akpa ego na akpa nri. (Matiu 10:5, 9, 10) Ọ jụrụ ha, sị: “Ọ dịghị ihe kọrọ unu, ka ọ̀ dị?” Ha zara ya, sị: “Ee e!” Ma, oleekwanụ ihe ha ga-eme n’ụbọchị ndị na-abịa abịa? Jizọs gwara ha, sị: “Ka onye nwere obere akpa ego were ya, ka onye nwere obere akpa nri were ya; ka onye na-enweghịkwa mma agha ree uwe elu ya zụrụ otu. N’ihi na ana m asị unu na ihe a e dere aghaghị imezu n’ebe m nọ, ya bụ, ‘a gụnyere ya ná ndị na-emebi iwu.’ N’ihi na ihe e dere banyere m na-emezu.”—Luk 22:35-37.

Ihe Jizọs na-ekwu okwu ya bụ gbasara oge a ga-akpọgide ya na ndị mmehie n’osisi ịta ahụhụ. E mechaa, mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ga-abịara ndị na-eso ụzọ ya. Ha chere na ha dị njikere maka ihe ga-abịara ha. N’ihi ya, ha gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, lee! anyị ji mma agha abụọ.” Jizọs sịrị ha: “O zuola.” (Luk 22:38) N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-eji mma agha abụọ a kụziere ha ihe ọzọ dị mkpa.