Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 119

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

JỌN 14:1-31

  • JIZỌS NA-AGA ỊKWADEBERE NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA EBE

  • O KWERE HA NKWA IZITERE HA IHE INYE AKA

  • NNA JIZỌS KA YA UKWU

Jizọs na ndịozi ya ka nọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu mgbe ha richara nri ncheta ọnwụ ya. Ọ gwara ndịozi ya, sị: “Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Nweenụ okwukwe n’ebe Chineke nọ, nweekwanụ okwukwe n’ebe mụ onwe m nọ.”—Jọn 13:36; 14:1.

Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ihe mere na obi ekwesịghị ịlọ ha mmiri ma ya laghachi n’eluigwe. Ọ sịrị ha: “N’ụlọ Nna m, ọtụtụ ebe obibi dị. . . . Ọ bụrụkwa na mụ agaa kwadebere unu ebe, m ga-abịa ọzọ, mụ onwe m ga-anabatakwa unu n’ebe obibi m, ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ.” Ma, ndịozi ya aghọtaghị na ihe ọ na-ekwu bụ na ọ ga-alaghachi n’eluigwe. N’ihi ya, Tọmọs jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga. Olee otú anyị si mara ụzọ ya?”—Jọn 14:2-5.

Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ.” Ọ bụ naanị ikwere na Jizọs na n’ihe ọ kụziri nakwa ibi ndụ otú Jizọs biri ga-eme ka mmadụ bata n’ụlọ Nna ya dị n’eluigwe. Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.”—Jọn 14:6.

Mgbe Filip nụrụ ihe a Jizọs kwuru, ọ gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, gosi anyị Nna ahụ, o zuwokwara anyị.” O nwere ike ịbụ na Filip chọrọ ịhụ Chineke n’ọhụụ otú ahụ Mozis, Ịlaịja, na Aịzaya hụrụ ya. Ma, ndịozi Jizọs ahụla ihe ka ọhụụ ndị ahụ. Jizọs gwara Filip, sị: “Mụ na unu ànyị anọwo ogologo oge há otú a, ma, ị mabeghị m, Filip? Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” Jizọs na-akpa nnọọ àgwà ka Nna ya. N’ihi ya, mmadụ na Jizọs ịnọ, onye ahụ a na-ahụ otú o si akpa àgwà, yiri ịhụ otú Nna ya si akpa àgwà. Ma, Nna Jizọs ka Jizọs ukwuu. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Adịghị m ekwu ihe m na-agwa unu n’echiche nke onwe m.” (Jọn 14:8-10) Ndịozi Jizọs si otú ahụ ghọta na ihe niile Jizọs na-akụzi si n’aka Nna ya.

Ndịozi Jizọs ahụla ebe Jizọs rụrụ ọrụ ebube, nụkwa ka ọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ma ugbu a, Jizọs na-agwa ha, sị: “Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, onye ahụ ga-arụkwa ọrụ m na-arụ; ọ ga-arụkwa ọrụ karịrị ọrụ ndị a.” (Jọn 14:12) Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na ha ga-arụ ọrụ ebube karịa ya. Kama, ihe okwu ya pụtara bụ na ha ga-ekwusa ozi ọma ọtụtụ afọ karịa ya, gaa ọtụtụ ebe kwusaa ya, ziekwa ọtụtụ ndị ozi ọma karịa mmadụ ole yanwa ziri ozi ọma.

Jizọs ịlaghachi n’eluigwe agaghị eme ka ndịozi ya nọrọ naanị ha, n’ihi na Jizọs kwere ha nkwa, sị: “Ọ bụrụ na unu arịọ ihe ọ bụla n’aha m, m ga-eme ya.” Jizọs gwakwara ha, sị: “M ga-arịọkwa Nna ahụ, ọ ga-enyekwa unu ihe inyeaka ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ.” (Jọn 14:14, 16, 17) Jizọs si otú a mee ka obi sie ha ike na ha ga-enweta ihe ọzọ ga-enyere ha aka, ya bụ, mmụọ nsọ. Ihe a Jizọs gwara ha mezuru n’ụbọchị Pentikọst.

Jizọs gwara ha, sị: “N’oge na-adịghị anya, ụwa agaghịkwa ahụ m ọzọ, kama unu ga-ahụ m, n’ihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ.” (Jọn 14:19) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ọ ga-eme ka ha hụ ya ma a kpọlitechaa ya n’ọnwụ. E mechaa, ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha bụrụ mmụọ ma soro ya biri n’eluigwe.

Jizọs kwuziri, sị: “Onye nabatara ihe m nyere n’iwu ma na-edebe ha, ọ bụ onye ahụ hụrụ m n’anya. N’aka nke ọzọ, onye hụrụ m n’anya ka Nna m ga-ahụ n’anya, m ga-ahụkwa ya n’anya ma gosi ya onwe m nke ọma.” Mgbe Jizọs kwuru ihe a, onyeozi ya aha ya bụ Judas, onye a na-akpọkwa Tadiọs, jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji chọọ igosi anyị onwe gị nke ọma, ọ bụghị igosi ya ụwa?” Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m, Nna m ga-ahụkwa ya n’anya . . . Onye na-ahụghị m n’anya adịghị edebe okwu m.” (Jọn 14:21-24) Ndị ụwa adịghị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ha ewereghị Jizọs ka ụzọ, eziokwu, na ndụ.

Ebe ọ bụ na Jizọs na-alaghachi eluigwe, olee otú ndị na-eso ụzọ ya ga-esi cheta ihe niile ọ kụziiri ha? Jizọs gwara ha, sị: “Ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke Nna m ga-ezite n’aha m, ga-akụziri unu ihe niile ma chetara unu ihe niile m gwara unu.” Ndịozi Jizọs ejirila anya ha hụ ike mmụọ nsọ na-akpa. N’ihi ya, ihe a ọ gwara ha kasiri ha obi. Jizọs gwakwara ha, sị: “M na-ahapụrụ unu udo, m na-enye unu udo m. . . . Ka obi ghara ịlọ unu mmiri, unu atụkwala egwu.” (Jọn 14:26, 27) Obi ekwesịghị ịlọ ndị na-eso ụzọ Jizọs mmiri n’ihi na Nna Jizọs ga na-eduzi ha ma na-echebe ha.

N’oge na-adịghị anya, ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-ahụ ihe na-egosi na Chineke na-echebe ha. Jizọs kwuru, sị: “Onye na-achị ụwa na-abịa. O nweghịkwa ike n’ebe m nọ.” (Jọn 14:30) Ekwensu banyere n’ime Judas ma jiri ya kwara ngwá ọrụ. Ma, Jizọs enweghị mmehie nke Ekwensu ga-agbakwasị ụkwụ na ya mee ka o mehie Chineke. Ekwensu agaghịkwa emeli ka Jizọs tọ n’ili. N’ihi gịnị? Jizọs kwuru ihe kpatara ya. Ọ sịrị na ya ‘na-eme ihe Nna ya nyere ya n’iwu ka ya mee.’ Obi siri ya ike na Nna ya ga-akpọlite ya n’ọnwụ.—Jọn 14:31.