Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 121

“Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa”

“Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa”

JỌN 16:1-33

  • N’OGE NA-ADỊGHỊ ANYA, NDỊOZI JIZỌS AGAGHỊZI AHỤ YA

  • UJU NDỊOZI JIZỌS NA-ERU GA-AGHỌ ỌṄỤ

Jizọs na ndịozi ya ejikerela ịpụ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu, bụ́ ebe ha nọ rie nri Ememme Ngabiga. Ebe ọ bụ na Jizọs agwala ha ọtụtụ ihe ha ga-eme, ọ gwara ha, sị: “Agwawo m unu ihe ndị a ka unu wee ghara ịsụ ngọngọ.” Gịnị mere ihe a ọ gwara ha ji kwesị ekwesị? Ọ bụ n’ihi ihe a ọ na-aga ikwu. Ọ sịrị: “Ndị mmadụ ga-achụpụ unu n’ụlọ nzukọ. N’eziokwu, oge awa na-abịa mgbe onye ọ bụla nke ga-egbu unu ga-eche na ya jeere Chineke ozi dị nsọ.”—Jọn 16:1, 2.

Ihe a Jizọs gwara ndịozi ya nwere ike ịna-ewute ha. Ọ bụ eziokwu na Jizọs agwabuola ha na ụwa ga-akpọ ha asị, o nwebeghị mgbe ọ gwara ha na a ga-egbu ha. Gịnị mere na ọ gwaghị ha ya kemgbe? Jizọs sịrị: “Agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ, n’ihi na mụ na unu nọ.” (Jọn 16:4) Ugbu a, ọ na-agwa ha ya tupu ya ahapụ ha laa eluigwe. Ihe a ọ gwara ha ga-enyere ha aka ka ha ghara ịsụ ngọngọ mgbe e mechara.

Jizọs gwakwara ha, sị: “M na-alakwuru onye zitere m, ma ọ dịghị otu onye n’ime unu na-ajụ m, sị, ‘Olee ebe ị na-aga?’” Ha ajụbuola Jizọs ná mmalite mgbede ụbọchị ahụ ebe ọ na-aga. (Jọn 13:36; 14:5; 16:5) Ihe Jizọs kwuru banyere mkpagbu a ga-akpagbu ha mere ka ahụ́ nwụọ ha, nke na ha na-eruzi uju. Nke a mere ka ha ghara ịjụkwu ya ajụjụ gbasara ebube ọ ga-emecha nweta ma ọ bụkwanụ uru ebube a ga-abara ndị na-efe Chineke. Jizọs chọpụtara ihe ha na ya na-alụ. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: “N’ihi na agwawo m unu ihe ndị a, obi unu ejupụtawo n’iru uju.”—Jọn 16:6.

Jizọs gwaziri ha, sị: “Ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji na-ala. N’ihi na ọ bụrụ na mụ alaghị, ihe inyeaka ahụ agaghị abịakwute unu ma ọlị; ma ọ bụrụ na mụ alaa, m ga-ezitere unu ya.” (Jọn 16:7) Ọ gwụla ma Jizọs ọ̀ nwụrụ ma laghachi eluigwe ka ndị na-eso ụzọ ya ga-eji nweta mmụọ nsọ. Jizọs nwere ike izigara ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ ka ọ na-enyere ha aka n’agbanyeghị ebe ọ bụla ha nọ.

Mmụọ nsọ ahụ ‘ga-enye ụwa ihe àmà doro anya banyere mmehie na ezi omume na banyere ikpe.’ (Jọn 16:8) Mmụọ nsọ a ga-agba ndị nọ n’ụwa n’anwụ na ha enweghị okwukwe n’Ọkpara Chineke. Jizọs ịlaghachi eluigwe ga-eme ka o doo onye ukwu na onye nta anya na ọ bụ onye ezi omume. Ọ ga-egosikwa ihe mere e kwesịrị iji maa Setan, bụ́ “onye na-achị ụwa a,” ikpe ọnwụ.—Jọn 16:11.

Jizọs gwakwara ndịozi ya, sị: “M ka nwere ọtụtụ ihe m ga-agwa unu, ma unu apụghị ịghọta ha ugbu a.” Mgbe ọ ga-awụkwasị ha mmụọ nsọ, mmụọ nsọ ahụ ga-enyere ha aka ịghọta “eziokwu niile.” Ịghọta eziokwu a ga-enyere ha aka ịna-akpa àgwà ziri ezi.—Jọn 16:12, 13.

Jizọs kwuru ihe ọzọ nke gbagwojuru ndịozi ya anya. Ọ sịrị ha: “N’oge na-adịghị anya, unu agakwaghị ahụ m, n’oge na-adịghịkwa anya, unu ga-ahụ m.” Ha jụrịtara onwe ha ihe Jizọs bu n’obi kwuo ihe a. Mgbe Jizọs chọpụtara na ha chọrọ ịjụ ya ajụjụ banyere ihe a o kwuru, ọ gwara ha, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, unu ga-akwa ákwá ma tie mkpu arịrị, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ; unu ga-eru uju, ma a ga-eme ka iru uju unu ghọọ ọṅụ.” (Jọn 16:16, 20) Mgbe e gburu Jizọs n’ehihie echi ya, ndị ndú okpukpe ṅụrịrị ọṅụ, ma ndị na-eso ụzọ Jizọs ruru uju. Ma iru uju ha ghọrọ ọṅụ mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ha ṅụrịkwuru ọṅụ mgbe ọ wụkwasịrị ha mmụọ nsọ.

Jizọs ji ọnọdụ ndịozi ya nọ na ya tụnyere nwaanyị ime na-eme. Ọ sịrị: “Mgbe nwaanyị na-amụ nwa, ọ na-ahụju anya, n’ihi na oge awa ya eruwo; ma mgbe ọ mụpụtara nwa ahụ, ọ dịghị echeta ahụhụ ahụ ọzọ n’ihi ọṅụ o nwere na ọ mụwo mmadụ n’ụwa.” Jizọs gwara ha okwu gbara ha ume. Ọ sịrị ha: “Unu onwe unu, n’ezie, na-eru uju ugbu a; ma m ga-ahụ unu ọzọ, obi unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, ọ dịghịkwa onye ga-anapụ unu ọṅụ unu.”—Jọn 16:21, 22.

Ndịozi Jizọs arịọtụbeghị Chineke ihe n’aha Jizọs. Ma ugbu a, Jizọs gwara ha, sị: “N’ụbọchị ahụ, unu ga-arịọ [Nna m] ihe n’aha m.” Gịnị mere ha ga-eji arịọ ihe n’aha ya? Ọ̀ bụ maka na Chineke achọghị ịnụ arịrịọ ha? Mba. Jizọs gwara ha, sị: “Nna m n’onwe ya hụrụ unu n’anya nke ukwuu, n’ihi na unu hụrụ m n’anya nke ukwuu . . . dị ka onye nnọchiteanya nke Nna m.”—Jọn 16:26, 27.

Ọ ga-abụ na ihe a Jizọs gwara ndịozi ya mere ka obi sie ha ike ịgwa ya, sị: “Anyị ji nke a kwere na i si n’ebe Chineke nọ bịa.” Ma, ihe na-aga ime n’oge na-adịghị anya ga-eme ka a mata ma hà ji obi ha niile kwere n’ihe a ha kwuru. Jizọs gwara ha ihe na-aga ime mgbe ahụ. O kwuru, sị: “Lee! Oge awa na-abịa, n’ezie, ọ bịawo, mgbe a ga-achụsasị unu, onye ọ bụla alaa n’ụlọ ya, unu ga-ahapụkwa naanị m.” Ma, ihe ọ gwara ha mere ka obi sie ha ike. Ọ gwara ha, sị: “Agwawo m unu ihe ndị a ka unu wee site na mụ nwee udo. N’ụwa, unu na-enwe mkpagbu, ma nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.” (Jọn 16:30-33) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ọ ga-anọnyere ha. Obi siri ya ike na ọ bụrụ na ndịozi ya ejisie ike na-eme uche Chineke n’agbanyeghị mbọ niile Setan na-agba ka ha kwụsị ime uche Chineke, ha ga-emeri ụwa, otú yanwa meriri.