Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 134

Ili Jizọs Atọgbọrọ Chakoo n’Ihi na A Kpọlitela Ya n’Ọnwụ

Ili Jizọs Atọgbọrọ Chakoo n’Ihi na A Kpọlitela Ya n’Ọnwụ

MATIU 28:3-15 MAK 16:5-8 LUK 24:4-12 JỌN 20:2-18

  • A KPỌLITERE JIZỌS N’ỌNWỤ

  • IHE NDỊ MERE N’ILI JIZỌS

  • Ọ PỤTARA N’IHU ỤMỤ NWAANYỊ ỤFỌDỤ

Ụjọ tụrụ ụmụ nwaanyị ahụ mgbe ha hụrụ na ili ahụ dị ka ọ̀ tọgbọ chakoo. Meri Magdalin gbaara ọsọ gaa ịhụ “Saịmọn Pita na onye ọzọ ahụ bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ onye Jizọs hụrụ n’anya nke ukwuu.” Onye ọzọ ahụ bụ Jọn onyeozi. (Jọn 20:2) Ma, ụmụ nwaanyị ndị nke ọzọ hụrụ mmụọ ozi nọ ebe ahụ. Mgbe ha banyere n’ili ahụ, ha hụkwara mmụọ ozi ọzọ. Mmụọ ozi a “yi uwe mwụda ọcha.”—Mak 16:5.

Otu n’ime ndị mmụọ ozi ahụ gwara ha, sị: “Ya ejuzila unu anya. Unu na-achọ Jizọs onye Nazaret, bụ́ onye a kpọgidere n’osisi. A kpọlitewo ya, ọ nọghị n’ebe a. Leenụ ebe e liri ya! Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya, gwakwa Pita, sị, ‘O buruwo unu ụzọ gawa Galili; n’ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya, dị nnọọ ka ọ gwara unu.’” (Mak 16:6, 7) Ihe ndị a ‘gbagwojuru ụmụ nwaanyị ahụ anya ma mee ka ha maa jijiji.’ N’ihi ya, ha gbaara ọsọ gawa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ihe ha hụrụ.—Mak 16:8.

Ka ọ dị ugbu a, Meri ahụla Pita na Jọn. Ọ na-ekukwa ume ọkụ ọkụ. Ọ gwara ha, sị: “Ha ebupụwo Onyenwe anyị n’ili ncheta ahụ, anyị amaghịkwa ebe ha dọbara ya.” (Jọn 20:2) Pita na Jọn gbaara gawa n’ili ahụ. Ka ha nọ n’ụzọ, Jọn gbafere Pita ma buru ya ụzọ ruo. Mgbe Jọn rutere, o lebara anya n’ime ili ahụ ma hụ ákwà ndị e ji kee Jizọs. Ma, ọ banyeghị n’ili ahụ.

Mgbe Pita rutere, ọ banyere n’ili ahụ ozugbo. Ọ hụrụ ákwà ndị e ji kee Jizọs n’ahụ́ na ndị e ji kee ya n’isi. Jọn banyeziri ma kweta na ihe Meri gwara ha bụ eziokwu. N’agbanyeghị ihe ndị Jizọs gwaburu ha, o nweghị onye n’ime ha ghọtara na a kpọlitela ya n’ọnwụ. (Matiu 16:21) Ihe a merenụ gbagwojuru ha anya, ha alawa. Ma, Meri laghachiri n’ili ahụ nọrọzie.

N’oge ahụ, ụmụ nwaanyị ndị ahụ gbapụrụnụ ka nọ n’ụzọ na-aga ịgwa ndị na-eso ụzọ Jizọs na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. Ka ha gba na-aga, Jizọs hụrụ ha n’ụzọ ma sị ha: “Ndeewonụ!” Ha bịara jide ya n’ụkwụ ma “kpọọrọ ya isiala.” Jizọs gwara ha, sị: “Unu atụla egwu! Gaanụ kọọrọ ụmụnna m, ka ha gaa Galili; n’ebe ahụ ka ha ga-ahụ m.”—Matiu 28:9, 10; Luk 24:8-10.

Tupu mgbe ahụ, ndị agha na-eche ili Jizọs nche “mara jijiji wee dị ka ndị nwụrụ anwụ” n’ihi ala ọma jijiji merenụ nakwa n’ihi ndị mmụọ ozi pụtaranụ. Mgbe ha nwetara onwe ha, ha banyere n’ime obodo “wee kọọrọ ndị isi nchụàjà ihe niile mere.” Ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu zukọrọ ma gbaa izu. Ha nyere ndị agha ahụ ego ka ha ghara ime ka ndị mmadụ mara ihe merenụ. Ha gwara ndị agha ahụ ka ha kwuo, sị: “Ndị na-eso ụzọ ya bịara n’abalị zuru ya mgbe anyị na-ehi ụra.”—Matiu 28:4, 11, 13.

E nwere ike igbu ndị agha Rom ma ọ bụrụ na ha anọrọ n’ebe ha na-eche nche hie ụra. N’ihi ya, ndị isi nchụàjà kwere ha nkwa, sị: “Ọ bụrụkwa na ihe a [ya bụ, ụgha a sịrị ha ghaa na ha na-ehi ụra] eruo gọvanọ ntị, anyị ga-arịọ ya arịrịọ, meekwa ka unu ghara ichegbu onwe unu.” (Matiu 28:14) Ndị agha ahụ naara ndị isi nchụàjà ahụ ego ahụ ma mee ihe ha kwuru. N’ihi ya, akụkọ ụgha nke bụ́ na e zuuru ozu Jizọs ezuru gbasara n’etiti ndị Juu.

Meri Magdalin ka nọ n’ili ahụ na-ebe ákwá. Mgbe o hulatara nyoba anya n’ili ahụ, ọ hụrụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha. Ha nọ n’ebe ozu Jizọs dịbu. Otu nọ n’ebe isi, nke ọzọ anọrọ n’ebe ụkwụ. Ha jụrụ ya, sị: “Nwaanyị, gịnị mere i ji na-akwa ákwá?” Meri gwara ha, sị: “Ha ebupụwo Onyenwe m, amaghịkwa m ebe ha debere ya.” Mgbe Meri tụgharịrị, ọ hụrụ onye ọzọ. Onye ahụ jụrụ ya ajụjụ ahụ ndị mmụọ ozi abụọ jụrụ ya. Ọ jụkwara ya, sị: “Ònye ka ị na-achọ?” Meri chere na ọ bụ onye na-elekọta ubi ahụ, n’ihi ya, ọ sịrị ya: “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya, m ga-eburukwa ya.”—Jọn 20:13-15.

Meri amaghị mgbe ahụ na ọ bụ Jizọs ka ya na ya na-ekwu okwu. Ma, mgbe Jizọs kpọrọ ya “Meri!,” nke bụ́ otú ọ na-esi akpọ ya, ọ mataziri na ọ bụ Jizọs. Meri ji obi ụtọ kpọọ ya, sị:“Rabonaị!” (nke pụtara “Onye Ozizi!”) Meri makụrụ Jizọs n’ihi na ụjọ na-atụ ya na Jizọs na-achọ ịla eluigwe. N’ihi ya, Jizọs gwara ya, sị: “Kwụsị ịrapara m n’ahụ́. N’ihi na arịgobeghị m gakwuru Nna m. Ma gakwuru ụmụnna m, sị ha, ‘Ana m arịgokwuru Nna m na Nna unu nakwa Chineke m na Chineke unu.’”—Jọn 20:16, 17.

Meri gbaara ọsọ gawa ebe ndịozi Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ zukọtara. Mgbe o ruru, ọ gwara ha, sị: “Ahụrụ m Onyenwe anyị!” Ihe a o kwuru gosiri na ihe ụmụ nwaanyị ndị nke ọzọ gwara ha bụ eziokwu. (Jọn 20:18) N’agbanyeghị ihe ndị a, “okwu ndị a dị ha ka ihe nzuzu.”—Luk 24:11.