Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 136

Mgbe Jizọs Nọ n’akụkụ Oké Osimiri Galili

Mgbe Jizọs Nọ n’akụkụ Oké Osimiri Galili

JỌN 21:1-25

  • JIZỌS EGOSI NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA ONWE YA N’OKÉ OSIMIRI GALILI

  • PITA NA NDỊ ỌZỌ GA NA-AZỤ ATỤRỤ KRAỊST

Ná mgbede ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya nọrọ, ọ gwara ha, sị: “Mgbe a kpọlitesịrị m, m ga-ebu unu ụzọ gaa Galili.” (Matiu 26:32; 28:7, 10) Ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya gawara Galili. Gịnịkwanụ ka ha ga-eme ebe ahụ?

Mgbe ha nọ ebe ahụ, Pita gwara ndịozi ibe ya dị mmadụ isii, sị: “Ana m aga igbu azụ̀.” Ha sịrị ya: “Anyị onwe anyị ga-eso gị gaa.” (Jọn 21:3) Mgbe ha gara, ha egbutaghị azụ̀ ọ bụla n’abalị ahụ. Mgbe chi na-achọ ịbọ, Jizọs pụtara n’akụkụ Oké Osimiri Galili, ma ndịozi ya amataghị na ọ bụ ya. Jizọs jụrụ ha, sị: “Ụmụntakịrị, ùnu nwere ihe oriri ọ bụla?” Ha zara ya, “Ee e!” Jizọs wee sị ha: “Wụnyenụ ụgbụ n’akụkụ aka nri nke ụgbọ mmiri unu, unu ga-egbute azụ̀.” (Jọn 21:5, 6) Ha wụnyere ya ma gbute ọtụtụ azụ̀ nke na ha enweghị ike ịdọbata ụgbụ ha n’ụgbọ mmiri.

Jọn gwara Pita, sị: “Ọ bụ Onyenwe anyị!” (Jọn 21:7) Ozugbo ahụ, Pita yiiri uwe elu ya ọ na-eyighị mgbe ọ na-egbu azụ̀ ma maba n’oké osimiri ahụ. O gwuuru mmiri ruo ihe dị ka mita iri itoolu pụta n’elu ala. Ndị ọzọ ha na Pita nọ n’ụgbọ mmiri jizi nwayọọ kwọrọ ụgbọ ha na-apụta. Ha dọpụtakwara ụgbụ ahụ azụ̀ juru.

Mgbe ha pụtara n’elu ala, ha hụrụ “icheku ọkụ nke na-enwu n’ebe ahụ na azụ̀ dị n’elu ya nakwa achịcha.” Jizọs sịrị ha: “Wetanụ ụfọdụ n’ime azụ̀ ndị unu gbutere ugbu a.” Pita banyere n’ụgbọ ha dọpụta ụgbụ ahụ nnukwu azụ̀ juru n’elu ala. Ha dị otu narị azụ̀ na iri ise na atọ. Jizọs gwara ha, sị: “Bịanụ, rie nri ụtụtụ.” E nweghị onye n’ime ha obi kara ịjụ ya, sị: “Ònye ka ị bụ?” n’ihi na ha ma na ọ bụ Jizọs. (Jọn 21:9-12) Nke a bụ nke ugboro atọ Jizọs na-apụta n’ebe ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya nọkọtara.

Jizọs nyere onye nke ọ bụla n’ime ha achịcha na azụ̀ ka ha taa. Mgbe o nyechara ha achịcha na azụ̀, ọ dị ka ò legidere azụ̀ ndị ahụ ndịozi ya gbutere anya, jụọ Pita, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya karịa ihe ndị a?” Jizọs chọrọ ịma ma ịkụ azụ̀ ọ̀ ka Pita mkpa karịa ọrụ ọ chọrọ ka ọ na-arụ? Pita zara ya, sị: “Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị n’anya nke ukwuu.” N’ihi ya, Jizọs gwara ya, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”—Jọn 21:15.

Jizọs jụrụ Pita nke ugboro abụọ, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya?” O nwere ike ịbụ na ajụjụ a Jizọs jụrụ ya juru ya anya. N’agbanyeghị nke ahụ, Pita ji obi ya niile zaa ya, sị: “Ee, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị n’anya nke ukwuu.” Jizọs gwakwara ya, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”—Jọn 21:16.

Jizọs jụrụ Pita nke ugboro atọ, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya nke ukwuu?” Na nke ugbu a, o nwere ike ịbụ na Pita na-eche na obi esighị Jizọs ike na ọ hụrụ ya n’anya. Pita zakwara ya, sị: “Onyenwe anyị, ị maara ihe niile; ị maara na m hụrụ gị n’anya nke ukwuu.” Jizọs gwara Pita ọzọ ihe ọ ga na-eme. Ọ sịrị ya: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” (Jọn 21:17) Nke a gosiri na ndị niile na-elekọta atụrụ Chineke kwesịrị ịna-ejere ndị ha na-elekọta ozi.

E kere Jizọs agbụ ma kpọgbuo ya n’ihi na ọ rụrụ ọrụ Chineke nyere ya rụọ. Jizọs kwuziri na Pita ga-anwụ ụdị ọnwụ ahụ. Jizọs gwara ya, sị: “Mgbe ị bụ nwata, ị na-eke ákwà n’úkwù, na-ejegharị ebe ị chọrọ. Ma mgbe ị ga-eme agadi, ị ga-agbatị aka gị, onye ọzọ ga-ekekwa gị ákwà n’úkwù, durukwa gị gaa n’ebe ị na-achọghị.” Jizọs gwakwara ya, sị: “Na-eso m.”—Jọn 21:18, 19.

Pita hụrụ Jọn onyeozi ma jụọ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, gịnị ka onye a ga-eme?” Ajụjụ a gosiri na Pita chọrọ ịmata ihe onyeozi ahụ Jizọs hụrụ n’anya ga-eme n’ọdịnihu? Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụrụ na ọ bụ uche m ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ̀ gbasara gị?” (Jọn 21:21-23) Pita kwesịrị ịna-eso Jizọs ma ghara ịna-echegbu onwe ya gbasara ihe ndị ọzọ na-eme. Ma, ihe Jizọs kwuru gosiri na ndịozi ndị ọzọ ga-anwụcha tupu Jọn anwụọ, nakwa na a ga-eme ka Jọn hụ ọhụụ oge Jizọs ga-abịa imezu uche Chineke mgbe ọ ghọchara eze nke Alaeze Chineke.

N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jizọs mere, bụ́ ndị e dewe ha edewe, ha agaghị abacha n’akwụkwọ.