Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 139

Jizọs Emee Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs ma Rụchaa Ọrụ Chineke Nyere Ya

Jizọs Emee Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs ma Rụchaa Ọrụ Chineke Nyere Ya

1 NDỊ KỌRỊNT 15:24-28

  • IHE GA-EME NDỊ BỤ́ ATỤRỤ NA NDỊ BỤ́ EWU

  • ỌTỤTỤ NDỊ GA-EBI N’ỤWA MGBE ỤWA GA-AGHỌ PARADAỊS

  • JIZỌS EGOSI NA YA BỤ ỤZỌ, EZIOKWU, NA NDỤ

Obere oge e mechara Jizọs baptizim, Ekwensu gbalịsiri ike ime ka o nupụrụ Chineke isi tupudị ya ebido ozi ya. Ọ nwara Jizọs ugboro ugboro. Jizọs mechara kwuo banyere ajọ onye a, sị: “Onye na-achị ụwa na-abịa. O nweghịkwa ike n’ebe m nọ.”—Jọn 14:30.

Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ ihe ga-eme ‘dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.’ A ga-achụpụ onye iro ụmụ mmadụ a n’eluigwe. ‘Ọ ga-ewekwa oké iwe ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.’ (Mkpughe 12:9, 12) Ndị Kraịst nwere ezigbo ihe mere ha ji kweta na ha bi ‘n’oge ahụ dị mkpirikpi’ nakwa na n’oge na-adịghị anya, a ga-atụba dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, n’abis, ya anọọ otu puku afọ n’akpaghị ike ọ bụla. N’oge ahụ, Jizọs ga na-achị n’Alaeze Chineke.—Mkpughe 20:1, 2.

Olee ihe ga-eme n’ụwa n’oge ahụ? Ole ndị ga-ebi n’ụwa mgbe ahụ? Oleekwa otú ihe ga-adịrị ha? Jizọs mere ka anyị mata azịza ajụjụ ndị a. N’ihe atụ o mere banyere atụrụ na ewu, o kwuru ihe ga-eme ndị ezi omume, ya bụ, ndị bụ́ atụrụ n’ihi na ha nyeere ụmụnna Jizọs aka. O kwukwara ihe ga-eme ndị na-enyereghị ụmụnna Jizọs aka, ya bụ, ndị bụ́ ewu. Jizọs kwuru, sị: “Ndị a [ya bụ, ndị bụ́ ewu] ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi, ma ndị ezi omume [ya bụ, ndị bụ́ atụrụ] ga-enweta ndụ ebighị ebi.”—Matiu 25:46.

Ihe a Jizọs kwuru ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ahụ ọ gwara onye omekome ahụ a kpọgburu n’akụkụ ya. Nkwa Jizọs kwere nwoke ahụ dị iche ná nkwa o kwere ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi. Jizọs kwere ndịozi ya nkwa na ha ga-eso ya nọrọ n’Alaeze ya n’eluigwe. Ma, nkwa o kwere onye omekome ahụ bụ: “N’ezie, ana m asị gị taa, mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) N’ihi ya, nwoke ahụ nwere olileanya na ọ ga-ebi na Paradaịs. Paradaịs pụtara ubi ma ọ bụ ogige mara mma. Ebe Jizọs kwere nwoke ahụ nkwa a, ọ pụtara na ndị bụ́ atụrụ n’oge anyị a ga-enwetakwa “ndụ ebighị ebi” na Paradaịs ahụ.

Na ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa dabara n’ihe Jọn onyeozi kwuru gbasara otú ihe ga-adị n’ụwa n’oge ahụ. Jọn kwuru, sị: “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

Ka onye omekome ahụ nwee ike ibi na Paradaịs, a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. Ma ọ bụghị naanị ya ka a ga-akpọlite n’ọnwụ. Ihe Jizọs kwuru mere ka o doo anya na ọ bụghị naanị ya. Ọ sịrị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta, ndị mere ezi ihe ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ndụ, ndị mere ajọ omume ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”—Jọn 5:28, 29.

Oleekwanụ maka ndịozi Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi na mmadụ ole na ole ndị ọzọ ga-eso Jizọs nọrọ n’eluigwe? Baịbụl kwuru, sị: “Ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ.” (Mkpughe 20:6) Ndị a ga-eso Kraịst achị bụbu ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị mgbe ha nọ n’ụwa. N’ihi ya, ha ga-emetara ụmụ mmadụ ebere, ghọtakwa otú ihe si dịrị ha ma ha nọrọ n’eluigwe na-achị ụwa.—Mkpughe 5:10.

Jizọs ga-eme ka àjà o ji ndụ ya chụọ baara ụmụ mmadụ uru. Ọ ga-eji ya mee ka ha nwere onwe ha ná mmehie ha ketara n’aka Adam. Ya na ndị so ya achị ga-eme ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi zuo okè. Ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi, nke bụ́ ihe Chineke bu n’obi kee mmadụ mgbe ahụ ọ gwara Adam na Iv ka ha mụọ ọmụmụ, baa ụba, ma jupụta ụwa. Ọnwụ ndị mmadụ na-anwụ n’ihi mmehie ha ketara n’aka Adam agaghịzi adị.

Jizọs ga-esi otú a mezuo ihe niile Jehova chọrọ ka o mee. Mgbe otu puku afọ Jizọs ga-achị zuru, ọ ga-enyeghachi Nna ya Alaeze ahụ, nyefeekwa ya ụmụ mmadụ ndị e merela ka ha zuo okè. Pọl onyeozi dere gbasara ihe a Jizọs ga-eme nke gosiri na ọ dị umeala n’obi. O dere, sị: “Mgbe a ga-edoworị ihe niile n’okpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ahụ n’onwe ya ga-edokwa onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe niile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.”—1 Ndị Kọrịnt 15:28.

N’eziokwu, Jizọs na-arụ ọrụ dị mkpa ka ihe niile Chineke zubere mezuo. Ka nzube ndị ahụ na-emezu ruo mgbe ebighị ebi, Jizọs ga na-abụ ihe ahụ ọ kpọrọ onwe ya. Ọ sịrị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ.”—Jọn 14:6.