Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 1

Ihe Ndị Mere Tupu Jizọs Amalite Ozi Ya

“Onye a ga-abụ onye ukwu.”​—Luk 1:32

Ihe Ndị Mere Tupu Jizọs Amalite Ozi Ya

NÁ NKEBI A

ISI NKE 1

Ozi Abụọ Si n’Aka Chineke

Mmụọ ozi Gebriel ezite ozi ndị siri ike nkweta.

ISI NKE 2

A Kwanyeere Jizọs Ùgwù Tupu A Mụọ Ya

Olee otú Elizabet na nwa o bu n’afọ si kwanyere Jizọs ùgwù?

ISI NKE 3

A Mụọ Onye Ga-akwadebe Ụzọ

Ozugbo Zekaraya malitere ikwu okwu, o buru otu amụma dị mkpa.

ISI NKE 4

Meri Dị Ime Ma Ọ Lụbeghị Di

Josef ò kwere ihe Meri gwara ya mgbe o kwuru na ọ bụghị nwoke ọzọ tụwara ya ime, kama na ọ bụ n’ike mmụọ nsọ ka ya dị ime?

ISI NKE 5

Olee Ebe A Mụrụ Jizọs, Oleekwa Mgbe A Mụrụ Ya?

Olee otú anyị si mara na a mụghị Jizọs na Disemba 25?

ISI NKE 6

Nwa ahụ E Kwere ná Nkwa

Mgbe Josef na Meri ku Jizọs bịa n’ụlọ nsọ, ndị Izrel abụọ merela agadi buru amụma banyere ihe Jizọs ga-eme n’ọdịnihu.

ISI NKE 7

Ndị Na-agụ Kpakpando Abịa Leta Jizọs

Gịnị mere kpakpando ahụ ha hụrụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ji bu ụzọ duru ha gaa na nke Eze Herọd chọrọ igbu Jizọs, kama iduga ha ozugbo n’ebe Jizọs nọ?

ISI NKE 8

Ha Gbapụrụ Ka Eze Obi Tara Mmiri Ghara Igbu Nwa Ha

Amụma atọ e buru na Baịbụl gbasara Mesaya ahụ mezuru mgbe Jizọs ka bụ nwata.

ISI NKE 9

Mgbe Jizọs Na-etolite na Nazaret

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwaanyị ole ka Jizọs nwere?

ISI NKE 10

Jizọs na Ezinụlọ Ya Agaa Jeruselem

Josef na Meri chị obi n’aka n’ihi na ha ahụghị Jizọs. O jukwaranụ Jizọs anya na ha amaghị ebe ha ga-achọta ya.

ISI NKE 11

Jọn Onye Na-eme Baptizim Akwadebe Ụzọ

Mgbe ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jọn, ọ katọrọ ha. N’ihi gịnị?