Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 4

Ozi Ikpeazụ Jizọs Jere na Judia

“Na-arịọnụ onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.”​—Luk 10:2

Ozi Ikpeazụ Jizọs Jere na Judia

NÁ NKEBI A

ISI NKE 66

Jizọs Erute Jeruselem Maka Ememme Ụlọ Ndò

Gịnị mere ndị nọ na-ege Jizọs ntị ji chee na mmụọ ọjọọ ji ya?

ISI NKE 67

“Ọ Dịtụbeghị Onye Ọzọ Si Otú A Kwuo Okwu”

Ndị niile nọ n’ụlọikpe kacha elu nke ndị Juu na-emegide Jizọs, ma otu onye n’ime ha katara obi gbachitere ya.

ISI NKE 68

Ọkpara Chineke Bụ “Ìhè nke Ụwa”

Jizọs kwuru na ‘eziokwu ahụ ga-eme ka i nwere onwe gị.’ Ma, gịnị ka ị ga-enwere onwe gị na ya?

ISI NKE 69

Nna Ha Ọ̀ Bụ Ebreham Ka Ọ̀ Bụ Ekwensu

Jizọs kwuru otú a ga-esi mara ndị bụ ezigbo ụmụ Ebreham, kwuokwa onye bụ Nna ya.

ISI NKE 70

Jizọs Agwọọ Otu Nwoke Kpuru Ìsì Malite Mgbe A Mụrụ Ya

Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya ihe mere nwoke a ji kpuo ìsì. Ò mehiere? Ndị mụrụ ya hà mehiere? Ihe ndị mmadụ kwuru mgbe Jizọs gwọrọ nwoke a dị iche iche.

ISI NKE 71

Ndị Farisii Agbaa Nwoke Kpuburu Ìsì Ajụjụ

Ihe nwoke ahụ kpuburu ìsì kwuru were ndị Farisii iwe. Ha chụpụrụ ya n’ụlọ nzukọ, bụ́ ihe ndị mụrụ ya tụrụ ụjọ ya.

ISI NKE 72

Jizọs Ezipụ Ndị Na-eso Ụzọ Ya Iri Asaa Ka Ha Gaa Kwusaa Ozi Ọma

Mgbe Jizọs nọ na Judia, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya iri asaa ka ha gaa kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Olee ebe ha gara kwusaa ozi ọma? Ọ̀ bụ n’ụlọ nzukọ ndị Juu ka ọ̀ bụ n’ụlọ ndị mmadụ?

ISI NKE 73

Onye Sameria Emee Ihe Gosiri na Ọ Bụ Ezigbo Onye Agbata Obi

Olee otú Jizọs si jiri akụkọ banyere onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi kụziere anyị ihe?

ISI NKE 74

Jizọs Akụzie Gbasara Ile Ọbịa na Ikpe Ekpere

Jizọs letara Meri na Mata n’ụlọ ha. Gịnị ka ọ kụziiri ha gbasara ile ọbịa? Olee otú o si mechaa kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga na-ekpe n’ekpere?

ISI NKE 75

Jizọs Ekwuo Ihe Ga-eme Ka Mmadụ Nwee Obi Ụtọ

Jizọs gwara ndị na-akatọ ya banyere ‘mkpịsị aka Chineke’ na otú ‘Alaeze Chineke si kwaa ha.’ O kwukwara ihe ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ.

ISI NKE 76

Jizọs Esoro Onye Farisii Rie Ihe

Jizọs agbaa ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ n’anwụ na ha bụ ndị ihu abụọ. Olee ibu arọ ha bokwasịrị ndị mmadụ?

ISI NKE 77

Jizọs Enye Ndụmọdụ Gbasara Ịba Ọgaranya

Jizọs mere ihe atụ banyere otu nwoke bara ọgaranya nke wusakwuru ụlọ nkwakọba ihe ya. Olee nsogbu Jizọs kwughachiri dị na mmadụ ịchọ akụnụba?

ISI NKE 78

Onye Ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Kwesịrị Ịdị Njikere

Jizọs chọrọ ka a na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya okwu Chineke. Gịnị bụ ọrụ ohu ahụ? Jizọs kwuru ka ndị na-eso ụzọ ya dịrị njikere. Gịnị mere ihe a o kwuru ji dị mkpa?

ISI NKE 79

Ihe Mere A Ga-eji Bibie Ndị Juu Na-ekweghị na Jizọs

Jizọs kwuru na a ga-ebibi ndị ọ na-achọ inyere aka ma ọ bụrụ na ha echegharịghị. Hà ga-amụta ihe Jizọs na-akụziri ha banyere otú Chineke si ele ha anya?

ISI NKE 80

Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma na Ogige Atụrụ

Ihe atụ Jizọs mere gbasara onye ọzụzụ atụrụ na atụrụ ya gosiri otú Jizọs si were ndị na-eso ụzọ ya. Hà ga-ege ya ntị ma mee ihe ọ gwara ha mee?

ISI NKE 81

Jizọs na Nna Ya Bụ Otu, Ma Ọ Bụghị Chineke

Ụfọdụ ndị na-akatọ Jizọs boro ya ebubo na ọ na-eme ka ya na Chineke hara. Olee otú Jizọs si gbaghaa ebubo ụgha ha?